Job 20:1-29
20 Zofa onye Neama wee zaa, sị:
2 “Ọ bụ ya mere obi m nke na-ezughị ike ji na-azaghachi m,Ọbụna n’ihi nchegbu m na-enwe.
3 Ihe m na-anụ bụ ndụmọdụ mkparị;Mmụọ nke na-aza m bụ mmụọ nke na-enweghị nghọta m nwere.
4 Ị̀ maara nke a site ná mmalite,Kemgbe e mere ka mmadụ nọrọ n’elu ụwa,+
5 Na mkpu ọṅụ nke ndị ajọ omume na-adịru nwa oge,+Nakwa na ọṅụ nke onye si n’ezi ofufe dapụ na-adịru naanị otu ntabi anya?
6 Ọ bụrụgodị na ebube ya eruo n’eluigwe,+Isi ya emetụkwa n’ígwé ojii,
7 Ọ ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi dị ka nsị ya;+Ndị na-ahụ ya ga-asị, ‘Olee ebe ọ nọ?’+
8 Ọ ga-efepụ dị ka nrọ, a gaghịkwa ahụ ya;A ga-achụpụkwa ya dị ka ọhụụ nke abalị.+
9 Anya hụrụ ya agaghị ahụ ya ọzọ,+Ebe o bi agakwaghị ahụ ya.+
10 Ụmụ ya ga-arịọ ka ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha meere ha amara,Ọ ga-ejikwa aka ya nyeghachi ndị ọzọ akụ̀ ha.+
11 Ọkpụkpụ ya jupụtara n’ike okorobịa,Ma ọ ga-ebu ya dinaa n’ájá nkịtị.+
12 Ọ bụrụ na ihe ọjọọ atọọ ya ụtọ n’ọnụ,Ọ bụrụ na o mee ka ọ gbarie n’okpuru ire ya,
13 Ọ bụrụ na ọ na-atọ ya ụtọ nke na ọ hapụghị ya,Ọ bụrụkwa na ọ kpụgidesie ya ike n’ọnụ,
14 A ga-agbanwe nri ya n’ime eriri afọ ya;Ọ ga-aghọ elò agwọ ubí n’ime ya.
15 O lodawo akụ̀, ma ọ ga-agbọpụta ya;Chineke ga-eme ka o si n’afọ ya pụta.
16 Elò agwọ ubí ka ọ ga-amịrị;Ire ajụala ga-egbu ya.+
17 Ọ gaghị ahụ ọwa mmiri ma ọlị,+Bụ́ mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ nke na-asọ ka iyi.
18 Ọ ga-eweghachi akụ̀ ọ kpatara, ọ gaghị eri ya;Dị ka akụ̀ ọ kpatara n’azụmahịa ya, nke ọ na-agaghị eri.+
19 N’ihi na o gwepịawo ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, ọ gbahapụwo ha;Ọ napụwo mmadụ ụlọ ọ na-abụghị ya wuru.+
20 N’ihi na afọ agaghị ezu ya ike ma ọlị;Ihe dị oké ọnụ ahịa o nwere agaghị eme ka ọ lanahụ.+
21 E nweghị ihe fọdụụrụ ya ọ ga-eripịa;Ọ bụ ya mere na ihe ịga nke ọma ya agaghị adịgide.
22 Ọ ga na-enwe nchegbu ọbụna mgbe akụ̀ ya juru ebe niile;+Ihe ndabara ọjọọ ga-eji ike ya dum bịakwasị ya.
23 Ka ọ bụrụ na, iji mee ka afọ ju ya,Chineke ga-eweso ya iwe dị ọkụ,+Ọ ga-emekwa ka o zokwasị ya, banye ya n’afọ.
24 Ọ ga-agbanahụ+ ihe agha e ji ígwè mee;Ụta e ji ọla kọpa mee ga-agbagbu ya.
25 A ga-agba ya akụ́ ụta, o wee si ya n’azụ pụta,Ngwá ọgụ nke na-egbu maramara ga-agbapukwa akpa ilu ya;+Ihe ndị na-emenye ụjọ ga-abịakwasị ya.+
26 Oké ọchịchịrị ga-erikpu akụ̀ ya;Ọkụ nke ọ na-enweghị onye fụnwuru ya ga-erepịa ya;+Ọ ga-adịrị onye fọrọ ndụ n’ụlọikwuu ya njọ.
27 Eluigwe ga-ekpughe njehie ya,+Ụwa ga-emegidekwa ya.
28 Oké mmiri ozuzo ga-ebupụ ụlọ ya;A ga-awụpụ ihe niile n’ụbọchị iwe Chineke.+
29 Nke a bụ òkè onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke,+Bụ́ ihe nketa Chineke kwuru na ọ ga-enweta.”