Job 25:1-6
25 Bildad+ onye si n’agbụrụ Shua wee zaa, sị:
2 “Ịchịisi na egwu dị n’ebe ọ nọ;+Ọ na-eme udo n’ebe dị elu ọ nọ.
3 À na-agụta ndị agha ya ọnụ?Ònyekwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?
4 Ya mere, olee otú mmadụ efu pụrụ isi bụrụ onye ziri ezi n’ihu Chineke,+Ma ọ bụ, olee otú onye nwaanyị mụrụ pụrụ isi dị ọcha?+
5 Lee! Ọbụna ọnwa adịghị etisi ike;Kpakpando adịghịkwa ọcha n’anya ya,
6 Ma ya fọdụzie mmadụ efu, onye bụ́ ikpuru,Nakwa nwa nke mmadụ, onye bụ́ idide!”+