Job 28:1-28
28 “N’ezie, ọlaọcha nwere ebe a na-enweta ya,Ọlaedo a na-anụcha anụcha+ nwekwara ebe a na-enweta ya;
2 Ọ bụ n’ala ka a na-egwute ígwè,+Ọ bụkwa na nkume ka e si agbazepụta ọla kọpa.
3 Mmadụ emewo ka a ghara inwekwa ọchịchịrị;Ọ na-achọkwa nkume ruo na nsọtụ niile nke ala,+N’itiri nakwa n’oké ọchịchịrị.
4 O gwunyewo okporo ígwè n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ bi,+N’ebe e chefuru echefu nke ụkwụ na-adịghị eru;Ụfọdụ n’ime ụmụ mmadụ na-eji ụdọ rịba n’ime ala, ha ana-akwụfegharị.
5 Ọ bụ n’ala ka ihe oriri si apụta;+Ma n’okpuru ya, e kpuru ya ihu dị ka ihe ọkụ bibiri.
6 Nkume safaya dị n’ebe nkume ya juru,+O nwekwara aghịrịgha ọlaedo.
7 Ọ bụ ụzọ nke nnụnụ ọ bụla na-eri anụ+ na-amaghị,Anya égbé ojii+ adịghịkwa ahụ ya.
8 Anụ ọhịa ndị dị ebube azọtụbeghị ụkwụ na ya;Nwa ọdụm agafetụbeghịkwa n’elu ya.
9 N’elu nkume siri ike ka ọ tụkwasịworo aka ya;Ọ na-akwatu ugwu malite na ntọala ya;
10 Ọ na-awa ọwa mmiri banye n’oké nkume;+Anya ya ahụwokwa ihe niile dị oké ọnụ ahịa.
11 Ọ sụchiwokwa ebe osimiri si asọpụta,+Ọ na-agbakwa ihe zoro ezo n’anwụ.
12 Ma, amamihe—olee ebe a pụrụ ịchọta ya,+Oleekwanụ ebe nghọta dị?
13 Mmadụ efu amabeghị ọnụ ahịa ya,+A dịghịkwa ahụ ya n’ala ndị dị ndụ.
14 Ogbu mmiri asịwo,‘Ọ dịghị n’ime m!’Oké osimiri asịwokwa, ‘Ọ dịghị n’ebe m nọ!’+
15 A pụghị iji ezi ọlaedo gbanweta ya,+A pụghịkwa ịtụ ọlaọcha atụ̀ ka ọ bụrụ ọnụ ahịa ya.
16 A pụghị iji ọlaedo Ofa,+Ma ọ bụ nkume oniks dị ụkọ, ya na safaya, kwụọ ụgwọ ya.
17 A pụghị iji ọlaedo na enyo tụnyere ya,A pụghịkwa iji arịa ọ bụla e ji ọlaedo a nụchara anụcha mee gbanweta ya.
18 A gaghị ekwutedị okwu nkume kọral+ na nkume kristal,Ma akpa nke jupụtara n’amamihe dị oké ọnụ ahịa karịa nke jupụtara na nkume pel.+
19 A pụghị iji nkume topaz+ si Kush tụnyere ya;A pụghịkwa iji ọbụna ezi ọlaedo kwụọ ụgwọ ya.
20 Ma amamihe—olee ebe o si abịa,+Oleekwanụ ebe nghọta dị?
21 E zopụwo ya ọbụna n’anya onye ọ bụla dị ndụ,+E zochiwokwara ya anụ ufe nke eluigwe.
22 Mbibi na ọnwụ asịwo,‘Anyị ji ntị anyị nụ akụkọ banyere ya.’
23 Ọ bụ Chineke ghọtara ụzọ ya,+Ọ bụkwa ya onwe ya maara ebe ọ dị,
24 N’ihi na anya ya na-eru na nsọtụ ụwa;+Ọ na-ahụkwa okpuru eluigwe dum,
25 Iji mee ka ifufe dị arọ,+Ya onwe ya atụwokwa mmiri n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀;+
26 Mgbe ọ tụụrụ mmiri ozuzo ụkpụrụ,+Meekwara oké mmiri ozuzo na égbè eluigwe ụzọ,
27 Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ hụrụ amamihe wee kọọ banyere ya;Ọ kwadebere ya ma nyochaa ya nke ọma.
28 O wee sị mmadụ,‘Lee! Ịtụ egwu Jehova—ọ bụ ya bụ amamihe,+Mmadụ isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya bụkwa nghọta.’”+