Job 32:1-22

32  Ndị ikom atọ a wee kwụsị ịsa Job okwu, n’ihi na ọ bụ onye ezi omume n’anya onwe ya.+  Iwe Elaịhu nwa Barakel onye si n’agbụrụ Bọz,+ n’ezinụlọ Ram, wee dị ọkụ. Ọ bụ Job ka o wesoro iwe dị ọkụ n’ihi na ọ kpọrọ mkpụrụ obi nke ya onye ezi omume kama ịkpọ Chineke onye ezi omume.+  O wesokwara ndị enyi ya atọ iwe dị ọkụ n’ihi na ọ dịghị ihe ha maara ha ga-aza, kama ha kpọrọ Chineke onye ajọ omume.+  Ma Elaịhu nwere ihe ọ chọrọ ikwu, ma o cheere ka Job kwuchaa, n’ihi na ha tọrọ ya.+  Elaịhu wee hụ na ọ dịghị ihe ọzọ ndị ikom atọ ahụ nwere ikwu,+ iwe ya wee dịkwuo ọkụ.  Elaịhu nwa Barakel onye si n’agbụrụ Bọz wee zaa, sị:“Abụ m nwataMa unu bụ ndị okenye.+Ọ bụ ya mere m ji chere, egwu tụkwara mỊgwa unu ihe m maara.   M sịrị, ‘Ka ọtụtụ ụbọchị kwuo okwu,Ọ bụkwa ọtụtụ afọ ndụ kwesịrị ime ka a mara ihe bụ́ amamihe.’+   N’ezie, ọ bụ mmụọ nke dị n’ime ụmụ mmadụ efu,Ya na ume nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, na-eme ka ha nwee nghọta.+   Ọ bụghị ndị gbara naanị ọtụtụ afọ bụ ndị maara ihe,+Ọ bụghịkwa ndị mere naanị agadi na-aghọta ikpe ziri ezi.+ 10  Ya mere, m sịrị, ‘Gee m ntị.Mụ onwe m ga-ekwupụta ihe m maara.’ 11  Lee! Echerewo m ka unu kwuchaa,Anọwo m na-anụ echiche unu,+Ruo mgbe unu na-achọzi ihe unu ga-ekwu achọ. 12  M nọkwa na-ege unu ntị,Ma, lee, ọ dịghị onye na-abara Job mba,Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime unu na-asa ya okwu, 13  Ka unu wee ghara ịsị, ‘Anyị achọtawo amamihe;+Ọ bụ Chineke na-asa ya okwu,* ọ bụghị mmadụ.’ 14  Ebe ọ na-abụghị m ka ọ na-agwa,Agaghị m eji ihe unu kwuru saa ya okwu. 15  Ụjọ ejidela ha, ọ dịghịkwa ihe ọzọ ha na-asa ya;Okwu agwụla ha n’ọnụ. 16  Echerewokwa m, n’ihi na ọ dịghịzi ihe ha na-ekwu;N’ihi na ha gbachiri nkịtị, ọ dịghịkwa ihe ha na-asa ya. 17  Mụ onwe m ga-asa ya okwu;Mụ onwe m ga-ekwupụta ihe m maara. 18  N’ihi na okwu juru m ọnụ;Mmụọ nke dị n’ime afọ m arụgidewo+ m. 19  Lee! Afọ m dị ka mmanya na-enweghị ebe o si ekupụ;Ọ chọrọ ịgbawa dị ka karama akpụkpọ ọhụrụ.+ 20  Ka m kwuo okwu, ka ahụ́ wee dajụọ m.M ga-emeghe ọnụ m gwa unu okwu.+ 21  Biko, agaghị m ele mmadụ ọ bụla anya n’ihu;+Agaghịkwa m etu mmadụ aha;+ 22  N’ihi na amaghị m otú m ga-esi etu mmadụ aha;Onye kere+ m ga-ewepụ m n’egbughị oge.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ‘na-achụpụ ya.’