Job 36:1-33
36 Elaịhu wee gaa n’ihu ikwu, sị:
2 “Nwetụkwuoro m ndidi, m ga-agwakwa gịNa ọ ka dị ihe m ga-ekwu banyere Chineke.
3 M ga-esi n’ebe dị anya nweta ihe ọmụma m,M ga-akpọkwa Onye kpụrụ m onye ezi omume.+
4 N’ihi na, n’ezie, ihe m na-ekwu abụghị okwu ụgha;Onye nwere ihe ọmụma+ zuru okè nọ n’ihu gị.
5 Lee! Chineke dị ike,+ ọ gaghịkwa ajụ mmadụ;Ọ dị ike ná nghọta nke obi ya;
6 Ọ gaghị ahapụ onye ajọ omume ọ bụla ndụ,+Ma ọ ga-ekpe ndị nọ n’ahụhụ ikpe ziri ezi.+
7 Ọ gaghị ewepụ anya ya n’ahụ́ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume;+Ọbụna ndị eze nọ n’ocheeze+—Ọ ga-emekwa ka ha nọrọ n’ocheeze ruo mgbe ebighị ebi, a ga-ebulikwa ha elu.
8 Ọ bụrụ na e kee ha agbụ,+A na-eji ụdọ mmekpa ahụ́ ejide ha.
9 Mgbe ahụ, ọ ga-akọrọ ha banyere otú ha si eme omumeNakwa njehie ha, n’ihi na ha na-ebuli onwe ha elu.
10 Ọ ga-emeghekwa ntị ha ka ha nụ ndụmọdụ,+Ọ ga-ekwukwa na ha kwesịrị ịhapụ ihe ọjọọ.+
11 Ọ bụrụ na ha erube isi ma jeere ya ozi,Ha ga-enweta ihe ọma n’oge ndụ ha niileBizuokwa ndụ ha n’obi ụtọ.+
12 Ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi, akụ́ ụta+ ga-agbagbu+ ha,Ha ga-anwụkwa n’enweghị ihe ọmụma.
13 Ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ime obi ha na-akpadoro onwe ha iwe.+Ha agaghị eti mkpu enyemaka ọbụna ma o kee ha agbụ.
14 Mkpụrụ obi ha ga-anwụ mgbe ha bụ okorobịa,+Ha ga-anwụkwa n’etiti ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị.+
15 Ọ ga-anapụta onye nọ n’ahụhụ n’ahụhụ ya,Ọ ga-emeghekwa ntị ha mgbe a na-emegbu ha.
16 Ọ ga-anapụtakwa gị n’ọnụ ahụhụ!+Ị ga-anọ n’ebe sara mbara karị,+ nke na-adịghị mkpagide,Ngụgụ obi nke dị na tebụl gị ga-ejupụtakwa n’abụba.+
17 Ikpe a mara onye ajọ omume+ ga-eju gị afọ;Mkpebi ikpe na ikpe ziri ezi ga-adịgide.
18 Lezie anya ka ọnụma+ ghara ịraba gị n’iji obi ilu na-akụ aka,Ekwekwala ka ihe mgbapụta+ buru ibu dufuo gị.
19 Ọ̀ dị ihe mkpu enyemaka ị na-eti ga-arụpụta?+ Ee e, ọ dịghịkwa iheOké mgbalị gị niile ga-arụpụta n’oge ahụhụ.+
20 Atụsila anya abalị ike,Bụ́ mgbe ndị mmadụ na-esi n’ebe ha nọ agbaghachi azụ.
21 Lezie anya ka ị ghara ime ihe ọjọọ,+N’ihi na ọ bụ nke a ka ị họọrọ kama ịhọrọ ịnọ n’ahụhụ.+
22 Lee! Chineke ji ike ya eme ihe n’ụzọ dị ebube;Olee onye ozizi dị ka ya?
23 Ọ̀ dịwo onye mere ka ọ zaa ajụjụ banyere ihe o mere,+Ọ̀ dịwokwa onye sịrị ya, ‘I meela ihe ọjọọ’?+
24 Cheta na i kwesịrị ito ọrụ ya+Bụ́ nke ndị mmadụ jiworo bụọ abụ.+
25 Ihe niile a kpọrọ mmadụ elekwasịwo anya na ya;Mmadụ efu sikwa n’ebe dị anya na-ele ya.+
26 Lee! Chineke dị elu karịa otú anyị pụrụ ịmata;+A pụghịkwa ịchọpụta afọ ndụ ya.+
27 N’ihi na ọ na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala;+Mmiri ahụ na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ ya.
28 Mmiri ewee si n’ígwé ojii na-atapụta,+Na-atasa ụmụ mmadụ n’ụba.
29 N’ezie, ònye pụrụ ịghọta urukpuru ígwé ojii,Oké mkpọtụ nke si n’ụlọ ndò ya?+
30 Lee! O mewo ka ìhè ya gbasaa n’elu ya,+O kpuchiwokwa ala ala oké osimiri.
31 N’ihi na ọ bụ ha ka o ji ekpechitere ndị mmadụ;+Ọ na-enyekwa ihe oriri n’ụba.+
32 O kpuchiwo àmụ̀mà n’ime aka ya,Ọ na-enyekwa ya iwu ka ọ bịakwasị onye mwakpo.+
33 Oké ụda+ ya na-akọ banyere ya,Anụ ụlọ na-akọkwa banyere onye ahụ nke na-abịanụ.