Job 4:1-21
4 Elifaz+ onye Timan wee zaa ya, sị:
2 “Ọ bụrụ na mmadụ anwaa ịgwa gị okwu, ike ọ̀ ga-agwụ gị?Ma, ònye nwere ike igbochi mmadụ ikwu okwu?
3 Lee! Ị gbaziwo ọtụtụ ndị,+Ị na-emebukwa ka aka ndị na-adịghị ike dị ike.+
4 Okwu gị na-eme ka onye ọ bụla sụrụ ngọngọ bilie;+Ị na-emekwa ka ikpere na-adịghị ike sie ike.+
5 Ma ugbu a, ọ bịarala gị, ike wee gwụ gị;O meela gị, i wee na-echegbu onwe gị.
6 Ọ́ bụghị nsọpụrụ ị na-enye Chineke bụ obi ike gị?Ọ́ bụghị iguzosi ike n’ihe+ n’ụzọ gị bụ olileanya gị?
7 Biko, cheta: Olee onye aka ya dị ọcha nke latụworo n’iyi?Olee ebe e kpochapụtụrụla ndị ezi omume?+
8 Dị ka m hụworo, ndị na-echepụta ihe ọjọọNa ndị na-agha nsogbu dị ka mkpụrụ, ọ bụ ha ga-aghọrọ ya.+
9 Ha na-ala n’iyi site n’ume Chineke kupụrụ,Ha na-anwụkwa site ná mwụpụ nke iwe ya.
10 Ọdụm na-ebigbọ, a na-anụkwa olu nwa ọdụm,Ma a na-agbaji ezé ụmụ ọdụm tojuru etoju.
11 Ọdụm na-ala n’iyi n’ihi na o nweghị anụ ọ dọgbutere,Ụmụ ya na-ahapụkwa ibe ha gbasasịa.
12 A takwunyeere m okwu,Ntị m wee nụpere ya,+
13 Mgbe obi na-ezughị m ike n’ihi ọhụụ m na-ahụ n’abalị,Mgbe oké ụra ji ndị mmadụ.
14 Ụjọ jidere m, m makwara jijiji,O mekwara ka ọkpụkpụ m niile jupụta n’ụjọ.
15 Otu mmụọ wee gafere n’ihu m;Ajị dị m n’ahụ́ wee guzoro ọtọ.
16 Ọ kwụụrụ ọtọ ma nọrọ jii,Ma amataghị m ihe ọ bụ;E nwere ihe guzo n’ihu m;Ebe niile dara jụụ, m wee nụ otu olu:
17 ‘Mmadụ efu—ò nwere ike ịbụ onye ezi omume karịa Chineke?Ka mmadụ ò nwere ike ịdị ọcha karịa Onye mere ya?’
18 Lee! Ọ tụkwasịghị ndị ohu ya obi,Ọ na-ebokwa ndị ozi ya ebubo na ha na-emejọ,
19 Ma ya fọdụzie ndị bi n’ụlọ ájá,Ndị a tọrọ ntọala ha n’ájá!+A na-azọpịa ha ọsọ ọsọ karịa nla.
20 Malite n’ụtụtụ ruo n’anyasị, a na-azọpịa ha;Ha na-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi n’enweghị onye ọ na-emetụ n’obi.
21 Ọ̀ bụ na e fopụghị ụdọ ụlọikwuu ha?Ha na-anwụ n’ihi enweghị amamihe.