Jud 1:1-25
1 Jud, ohu Jizọs Kraịst, ma bụrụ nwanne Jems,+ na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị a kpọrọ,+ ndị a hụrụ n’anya, ndị ha na Chineke bụ́ Nna na-enwe mmekọrịta,+ ndị e chebekwara+ maka Jizọs Kraịst:
2 Ka ebere+ na udo+ na ịhụnanya+ dị ukwuu dịrị unu.+
3 Ndị m hụrụ n’anya,+ ọ bụ ezie na m nọ na-agbalịsi ike idetara unu akwụkwọ banyere nzọpụta anyị nwekọrọ ọnụ,+ ahụrụ m na ọ dị mkpa idetara unu akwụkwọ iji gbaa unu ume ka unu lụsie ọgụ ike maka okwukwe+ ahụ e nyefere ndị nsọ naanị otu ugboro.+
4 Ihe mere m ji na-ede ya bụ na ụfọdụ ndị egbebatawo,+ bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ kara aka kemgbe ogologo oge gara aga+ na a ga-ama ha ikpe a,+ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke,+ ndị na-eme ka obiọma Chineke anyị nke na-erughịrị mmadụ bụrụ ihe ngọpụ maka omume rụrụ arụ,+ ndị na-agọnahụ+ onye naanị ya bụ Nna Nwe anyị+ na Onyenwe anyị,+ bụ́ Jizọs Kraịst.
5 Achọrọ m ichetara unu, n’agbanyeghị na unu maara ihe niile+ naanị otu mgbe, na ọ bụ ezie na Jehova zọpụtara otu ndị n’ala Ijipt,+ o mesịkwara bibie ndị na-egosighị okwukwe.+
6 Ndị mmụọ ozi ndị na-anọgideghị n’ọnọdụ mbụ ha, kama ha hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị,+ ọ bụ ha ka o kere agbụ ebighị ebi+ wee debe ha n’oké ọchịchịrị maka ikpe nke oké ụbọchị ahụ.+
7 Otú ahụkwa, mgbe Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị dị ha gburugburu+ kwasịrị iko gabiga ókè, nweekwa mmekọahụ rụrụ arụ,+ dị ka ndị ahụ e kwuworo banyere ha, ha nwetara ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke ọkụ ebighị ebi,+ ha wee ghọọrọ anyị ihe atụ ịdọ+ aka ná ntị.
8 N’agbanyeghị nke ahụ, otú ahụkwa ka ndị a, bụ́ ndị na-arọ nrọ,+ na-emerụ anụ ahụ́, na-eleda ndị isi anya,+ na-ekwujọkwa ndị dị ebube.+
9 Ma mgbe Maịkel+ onyeisi ndị mmụọ ozi+ na Ekwensu sere okwu+ ma na-arụrịta ụka banyere ozu Mozis,+ ọ nwaghị anwa iji okwu ọjọọ maa Ekwensu ikpe,+ kama ọ sịrị: “Ka Jehova baara gị mba.”+
10 Ma ndị a na-akatọ ihe niile ha na-amaghị;+ ma ihe niile ha ghọtara site n’ọmụmụ, dị ka anụmanụ na-adịghị eche echiche,+ ha na-aga n’ihu na-emerụ onwe ha n’ihe ndị a.+
11 Ahụhụ ga-adịrị ha, n’ihi na ha jere ije n’ụzọ Ken,+ jirikwa ọsọ gbaga n’ụzọ na-ezighị ezi nke Belam+ iji nweta ụgwọ ọrụ, laakwa n’iyi n’okwu nnupụisi+ nke Kora!+
12 Ndị a bụ nkume ndị zoro n’ala ala mmiri n’oriri ịhụnanya unu+ mgbe ha so unu na-eri oriri, ndị ọzụzụ atụrụ na-azụ onwe ha n’atụghị egwu;+ ígwé ojii nke mmiri na-adịghị,+ nke ifufe na-ebugharị;+ osisi ndị na-adịghị amị mkpụrụ n’oge ya,* ebe ha nwụworo ugboro abụọ, ebe e fopụworo ha;+
13 ajọ ebili mmiri nke oké osimiri nke na-agbọlite ihe ndị na-akpatara ha ihere;+ kpakpando ndị na-awagharị awagharị, bụ́ ndị e debeere oké ịgba itiri ruo mgbe ebighị ebi.+
14 Ee, Inọk,+ bụ́ onye nke asaa n’agbụrụ Adam, bukwara amụma banyere ha, mgbe ọ sịrị: “Lee! Jehova bịara, ya na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya,+
15 ime ha niile ihe e kpere n’ikpe,+ na ịma ndị niile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume ha niile nke asọpụrụghị Chineke, bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, nakwa banyere ihe niile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”+
16 Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu,+ ndị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ, ndị na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha,+ ha na-etukwa ọnụ,+ ebe ha na-enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ+ n’ihi uru ha ga-erite.
17 Ma unu, ndị m hụrụ n’anya, chetanụ okwu e kwuru na mbụ site n’ọnụ ndịozi Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+
18 na ha na-agwa unu, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe ndị na-akwa emo, ndị ga na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha ka ha wee na-eme omume asọpụrụghị Chineke.”+
19 Ndị a bụ ndị na-akpata nkewa,+ ndị anụ ahụ́ na-achị,+ ndị na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.+
20 Ma unu, ndị m hụrụ n’anya, site n’iwuli onwe unu elu+ n’okwukwe unu nke kasị nsọ,+ na ikpe ekpere site na mmụọ nsọ,+
21 nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke,+ ebe unu na-echere ebere+ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.+
22 Na-emekwaranụ ụfọdụ ndị nwere obi abụọ+ ebere;+
23 na-azọpụtanụ ha+ site n’ịdọpụta ha n’ọkụ.+ Ma na-emerenụ ndị ọzọ ebere, jirinụ egwu na-eme otú ahụ. Kpọọkwanụ uwe ime nke anụ ahụ́ tetọrọ asị.+
24 Onye ahụ nke nwere ike ichebe+ unu ka unu ghara ịsụ ngọngọ, onye nwekwara ike iche unu n’ihu ebube ya dị ka ndị na-enweghị ntụpọ+ n’oké ọṅụ,
25 onye naanị ya bụ Chineke bụ́ Onye Nzọpụta+ anyị site na Jizọs Kraịst+ Onyenwe anyị, ka ebube,+ ịdị ukwuu, ike+ na ịbụisi+ dịrị ya site na mgbe niile ebighị ebi gara aga+ ruo ugbu a, ruokwa mgbe niile ebighị ebi.+ Amen.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ná ngwụsị oge mgbụsị akwụkwọ.”