Matiu 16:1-28

16  Ndị Farisii+ na ndị Sadusii wee bịakwute ya, iji nwaa ya ọnwụnwa, ha rịọkwara ya ka o gosi ha ihe ịrịba ama si n’eluigwe.+  O wee sị ha: “[Mgbe o ruru uhuruchi, unu na-asịkarị, ‘Ihu ígwé ga-adị mma, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara’;  n’ụtụtụ, unu na-asịkwa, ‘Taa, mmiri ga-eruju n’ígwé, oyi ga-adịkwa, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara, ma gbaa ọchịchịrị.’ Unu maara otú e si akọwa ihu ígwé, ma unu apụghị ịkọwa ihe ịrịba ama nke oge ndị a.]*+  Ọgbọ ọjọọ nke na-akwa iko* na-achọ ihe ịrịba ama, ma a gaghị enye ya ihe ịrịba ama ọ bụla+ ma e wezụga ihe ịrịba ama Jona.”+ O wee hapụ ha pụọ.+  Ma ndị na-eso ụzọ ya gafere n’ofe nke ọzọ ma chefuo iwere achịcha.+  Jizọs wee sị ha: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii na ndị Sadusii.”+  Ya mere, ha malitere ikwurịta n’etiti onwe ha, sị: “Ọ dịghị achịcha anyị wetara.”  Ebe Jizọs maara ihe ha na-ekwu, ọ sịrị: “Gịnị mere unu ji na-ekwurịta ihe a n’etiti onwe unu, n’ihi na unu ejighị achịcha, unu ndị okwukwe nta?+  Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị isi ihe m na-ekwu, ka ọ̀ bụ na unu echetaghị ogbe achịcha ise ahụ e nyere puku mmadụ ise ahụ nakwa nkata ole unu tụtụjuru?+ 10  Ka ọ̀ bụ na unu echetaghị ogbe achịcha asaa ahụ e nyere puku mmadụ anọ ahụ nakwa nkata ole unu tụtụjuru?+ 11  Olee otú unu si ghara ịghọta na ọ bụghị achịcha ka m gwara unu banyere ya? Kama lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii na ndị Sadusii.”+ 12  Mgbe ahụ, ha ghọtara na o kwuru ka ha lezie anya, ọ bụghị maka ihe iko achịcha nkịtị, kama maka ozizi+ ndị Farisii na ndị Sadusii. 13  Ma mgbe Jizọs banyere n’akụkụ ụfọdụ nke Sesaria Filipaị, ọ malitere ịjụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke mmadụ bụ?”+ 14  Ha wee sị: “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim,+ ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja,+ ndị ọzọkwa na-asị na ị bụ Jeremaya ma ọ bụ otu n’ime ndị amụma.” 15  O wee sị ha: “Ma, unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?”+ 16  Saịmọn Pita zara, sị: “Ị bụ Kraịst,+ Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”+ 17  Jizọs wee zaa ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị gị, Saịmọn nwa Jona, n’ihi na ọ bụghị anụ ahụ́ na ọbara kpugheere gị ya, kama ọ bụ Nna m nke nọ n’eluigwe.+ 18  Ana m asịkwa gị, Ị bụ Pita,+ ọ bụkwa n’oké nkume a+ ka m ga-ewukwasị ọgbakọ m, ọnụ ụzọ ámá nke Hedis+ agaghịkwa aka ya ike.+ 19  M ga-enye gị mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe, ihe ọ bụla ị ga-eke agbụ n’ụwa bụ ihe e kere agbụ n’eluigwe, ihe ọ bụla ị ga-atọpụ n’ụwa bụkwa ihe a tọpụrụ n’eluigwe.”+ 20  Mgbe ahụ, o nyesiri ndị na-eso ụzọ ya iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na ya bụ Kraịst.+ 21  Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, Jizọs Kraịst bidoro igosi ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-aga Jeruselem wee taa ọtụtụ ahụhụ n’aka ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, a ga-egbukwa ya. N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.+ 22  Pita wee kpọpụ ya n’akụkụ wee bido ịbara ya mba, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.”+ 23  Ma ọ gbanyeere Pita azụ, sị ya: “Gaa m n’azụ, Setan!+ Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke,+ kama nke mmadụ.” 24  Mgbe ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile.+ 25  N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-achọta ya.+ 26  N’ihi na olee uru ọ ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o rite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?+ ka ọ̀ bụ gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere+ mkpụrụ obi ya? 27  N’ihi na a kawo ya aka na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya, mgbe ahụkwa, ọ ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka omume ya si dị.+ 28  N’ezie, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Akara ngebichi na-egosi ihe na-adịghị n’ụfọdụ ihe odide ndị kasị mee ochie, ma ọ dị ná ndị ọzọ.
Ma ọ bụ, “nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ.”