Matiu 18:1-35

18  N’oge awa ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya wee sị: “Ònye n’ezie bụ onye kasị ukwuu n’alaeze eluigwe?”+  O wee kpọrọ otu nwatakịrị, mee ka o guzoro n’etiti ha,+  o wee sị: “N’ezie, ana m asị unu, Ọ bụrụ na unu echigharịghị wee dịrị ka ụmụntakịrị,+ unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị.+  Ya mere, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya ala+ dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze eluigwe;+  onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị dị otú a n’aha m na-anabatakwa m.+  Ma onye ọ bụla nke na-eme ka otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe n’ebe m nọ sụọ ngọngọ, ọ baara ya uru karị ka e jiri nkume igwe nri+ nke ịnyịnya ibu na-akwagharị konye ya n’olu ma tụba ya n’ogbu oké osimiri.+  “Ahụhụ ga-adịrị ụwa n’ihi ihe ịsụ ngọngọ! N’ezie, ihe ịsụ ngọngọ aghaghị ịbịa,+ ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ihe ịsụ ngọngọ+ si n’aka ya bịa!  Ya mere, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya tụfuo;+ ọ kaara gị mma ibu nkwarụ ma ọ bụ ịda ngwọrọ nweta ndụ kama inwe aka abụọ ma ọ bụ ụkwụ abụọ e wee tụba gị n’ọkụ ebighị ebi.+  Ọ bụrụkwa na anya gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya ma tụfuo ya; ọ kaara gị mma ibu otu anya nweta ndụ kama inwe anya abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+ 10  Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi+ ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.+ 11 * —— 12  “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị atụrụ ma otu n’ime ha akpafuo,+ ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’elu ugwu wee gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu?+ 13  Ọ bụrụ na ọ chọta ya, n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị akpafu.+ 14  N’otu aka ahụ, ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.+ 15  “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emehie, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ.+ Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritewo nwanna gị n’uru.+ 16  Ma ọ bụrụ na o geghị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ, ka e wee site n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu.+ 17  Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na o geghị ọbụna ọgbakọ ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ+ na onye ọnaụtụ.+ 18  “N’ezie, ana m asị unu, Ihe ọ bụla unu ga-eke agbụ n’ụwa bụ ihe e kere agbụ n’eluigwe, ihe ọ bụla unu ga-atọpụkwa n’ụwa bụ ihe a tọpụrụ n’eluigwe.+ 19  N’ezie, ana m asị unu ọzọ, Ọ bụrụ na mmadụ abụọ n’ime unu ekwekọrịta n’ihe ọ bụla dị mkpa nke ha chọrọ ịrịọ, Nna m nke bi n’eluigwe ga-emere ha ya.+ 20  N’ihi na n’ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara n’aha m,+ anọ m n’ebe ahụ n’etiti ha.”+ 21  Pita wee bịa, sị ya: “Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie m, mụ agbaghara ya?+ Ọ̀ bụ ruo ugboro asaa?”+ 22  Jizọs sịrị ya: “Ana m asị gị, ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.+ 23  “Ọ bụ ya mere alaeze eluigwe ji dị ka otu nwoke, bụ́ eze,+ nke chọrọ ka ya na ndị ohu ya mee mpịazi.+ 24  Mgbe ha na ya malitere ime mpịazi, a kpọbatara otu nwoke nke ji ya ụgwọ puku mkpụrụ ego talent iri, ya bụ, nde dinarịọs iri isii. 25  Ma ebe ọ bụ na o nweghị otú ọ ga-esi akwụ ya, nna ya ukwu nyere iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya na ihe niile o nwere ka e wee kwụọ ụgwọ ahụ.+ 26  Ya mere, ohu ahụ dara n’ala wee malite ịkpọrọ ya isiala, sị, ‘Nweere m ndidi, m ga-akwụ gị ụgwọ niile m ji gị.’ 27  Nna ukwu nke ohu ahụ wee nwee ọmịiko, o wee hapụ ya+ ma kagbuo ụgwọ o ji.+ 28  Ma ohu ahụ pụrụ wee hụ otu n’ime ndị ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị mkpụrụ ego dinarịọs;+ ọ nwụchiri ya wee malite ịtọgide ya n’akpịrị, sị, ‘Kwụọ m ihe niile i ji m n’ụgwọ.’ 29  Ya mere, ohu ibe ya dara n’ala wee malite ịrịọsi ya arịrịọ ike, sị, ‘Nweere m ndidi,+ m ga-akwụ gị ya.’ 30  Ma o kweghị, kama ọ pụrụ wee mee ka a tụba ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụ ihe o ji n’ụgwọ. 31  Ya mere, mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe merenụ, o wutere ha nke ukwuu, ha wee gaa kọọrọ nna ha ukwu ihe niile merenụ.+ 32  Nna ya ukwu wee kpọọ ya, sị ya, ‘Ajọ ohu, m kagbuuru gị ụgwọ niile i ji, mgbe ị rịọsiri m arịrịọ ike. 33  Ọ̀ bụ na gị onwe gị ekwesịghị imere ohu ibe gị ebere,+ dị ka m mekwaara gị ebere?’+ 34  Nna ya ukwu wee wee iwe,+ nyefee ya n’aka ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ, ruo mgbe ọ ga-akwụ ihe niile o ji n’ụgwọ. 35  Otú ahụ+ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lee Ihe Odide Ntụkwasị nke 2.
Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 17:21.