Matiu 24:1-51
24 Ugbu a, Jizọs si n’ụlọ nsọ ahụ pụwa, ma ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya ka ha gosi ya ihe niile e wuru n’ụlọ nsọ ahụ.+
2 O wee sị ha: “Ùnu na-ahụ ihe ndị a niile? N’ezie, ana m asị unu, A gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya ma ọlị n’ebe a n’akwatughị ya.”+
3 Mgbe ọ nọ ọdụ n’Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya naanị ha, sị ya: “Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị+ na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?”+
4 Jizọs zara ha, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu;+
5 n’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Abụ m Kraịst,’ ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị.+
6 Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha; hụnụ na unu atụghị ụjọ. N’ihi na ihe ndị a aghaghị ime, ma ọgwụgwụ erubeghị.+
7 “N’ihi na mba ga-ebuso mba ọzọ agha,+ alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha,+ a ga-enwekwa ụkọ nri+ na ala ọma jijiji+ n’ebe dị iche iche.
8 Ihe ndị a niile bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.
9 “Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-enyefe unu ka a kpagbuo unu,+ ha ga-egbukwa+ unu, mba niile ga-akpọkwa unu asị+ n’ihi aha m.+
10 Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ga-asụ ngọngọ,+ rara ibe ha nye, kpọọkwa ibe ha asị.+
11 Ọtụtụ ndị amụma ụgha+ ga-ebilikwa wee duhie ọtụtụ ndị;+
12 n’ihi ịba ụba nke mmebi iwu,+ ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.+
13 Ma ọ bụ onye tachiri obi+ ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.+
14 A ga-ekwusakwa ozi ọma+ nke a nke alaeze+ n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile;+ mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ+ ga-abịa.
15 “Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu,+ nke Daniel onye amụma kwuru banyere ya, ka o guzo n’ebe nsọ,+ (onye na-agụ, ya jiri nghọta mee ihe,)
16 mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga+ n’ugwu.
17 Ka onye nọ n’elu ụlọ ghara ịrịdata iburu ngwongwo n’ụlọ ya;
18 onye nọ n’ubi, ya alaghachikwala n’ụlọ ka ọ chịrị uwe elu ya.
19 Ahụhụ ga-adịrị ụmụ nwaanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara n’ụbọchị ndị ahụ!+
20 Na-ekpenụ ekpere ka mgbapụ unu ghara ịbụ n’oge oyi, ma ọ bụ n’ụbọchị izu ike;
21 n’ihi na mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu+ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a,+ ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.
22 N’eziokwu, ọ bụrụ na e meghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla; ma n’ihi ndị a họọrọ,+ a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.+
23 “Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Lee! Kraịst nọ n’ebe a,’+ ma ọ bụ, ‘Ọ nọ n’ebe ahụ!’ unu ekwela.+
24 N’ihi na Kraịst ụgha+ na ndị amụma ụgha+ ga-ebili, ha ga-emekwa ihe ịrịba ama+ na ihe ijuanya dị ukwuu ka ha wee duhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.+
25 Lee! Ebuwo m ụzọ dọọ unu aka ná ntị.+
26 Ya mere, ọ bụrụ na ndị mmadụ asị unu, ‘Lee! Ọ nọ n’ala ịkpa,’ unu agala; ‘Lee! Ọ nọ n’ọnụ ụlọ dị n’ime,’ unu ekwela.+
27 N’ihi na dị nnọọ ka àmụ̀mà+ na-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ apụta ma gbuo ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka ọnụnọ nke Nwa nke mmadụ ga-adị.+
28 Ebe ọ bụla ozu dị, n’ebe ahụ ka ugo+ ga-ezukọta.+
29 “Ozugbo mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,+ ọnwa+ agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ike nke eluigwe maa jijiji.+
30 Mgbe ahụ, ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ+ ga-apụta n’eluigwe, mgbe ahụkwa, ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị,+ ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu.+
31 Ọ ga-ejikwa ụda oké opi zipụ ndị mmụọ ozi ya,+ ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa*+ chịkọta ndị ọ họọrọ,+ site n’otu nsọtụ eluigwe ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.
32 “Dị ka ihe atụ, sinụ n’osisi fig mụta isi ihe a: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee na-epupụta akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso.+
33 Otú ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.+
34 N’ezie, ana m asị unu na ọgbọ a+ agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.
35 Eluigwe na ụwa ga-agabiga,+ ma okwu m agaghị agabiga ma ọlị.+
36 “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ,+ ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.+
37 N’ihi na dị nnọọ ka ụbọchị Noa+ dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.+
38 N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa+ banyere n’ụgbọ ahụ;+
39 ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile,+ otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.
40 Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ ga-anọ n’ubi: a ga-akpọrọ otu ma hapụ onye nke ọzọ;
41 ndị inyom abụọ ga na-egwe nri na nkume igwe nri:+ a ga-akpọrọ otu ma hapụ onye nke ọzọ.+
42 Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.+
43 “Ma maranụ otu ihe, na a sị na onyeisi ezinụlọ maara oge nche nke onye ohi ji abịa,+ ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a waba n’ụlọ ya.
44 N’ihi nke a, unu onwe unu, dịrịnụ njikere,+ n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.
45 “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?+
46 Obi ụtọ+ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ!
47 N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.+
48 “Ma ọ bụrụ na ajọ ohu ahụ ekwuo mgbe ọ bụla n’obi ya, sị,+ ‘Nna m ukwu na-egbu oge,’+
49 wee malite iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị aṅụrụma a ma ama na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ,
50 nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya, n’oge awa+ ọ na-amaghịkwa,
51 ọ ga-enyekwa ya oké ahụhụ+ ma nye ya òkè ya n’ebe ndị ihu abụọ nọ. N’ebe ahụ ka ọ ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ifufe anọ.”