Nehemaya 1:1-11
1 Okwu Nehemaya+ nwa Hakalaya kwuru: O wee ruo n’ọnwa Kislev,+ n’afọ nke iri abụọ,+ na mụ onwe m nọ na Shushan+ bụ́ obí eze.
2 Hanenaị,+ otu n’ime ụmụnne m, wee bata, ya na ndị ọzọ ndị si Juda, m wee jụọ+ ha banyere ndị Juu,+ ndị lanahụrụnụ,+ bụ́ ndị fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha,+ nakwa banyere Jeruselem.
3 Ha wee sị m: “Ndị fọdụrụnụ, ndị fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha, n’ógbè ahụ a na-achị achị,+ nọ n’ọnọdụ dị oké njọ,+ a na-akọchakwa ha;+ a kwatuwokwa mgbidi+ Jeruselem, gbaakwa ọnụ ụzọ ámá+ ya ọkụ.”
4 O wee ruo na, ozugbo m nụrụ okwu ndị a, m nọdụrụ ala malite ịkwa ákwá na iru uju ruo ọtụtụ ụbọchị. M nọkwa na-ebu ọnụ+ ma na-ekpe ekpere n’ihu Chineke nke eluigwe.+
5 M wee sị: “Ewoo, Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe, Chineke nke dị ukwuu ma dị egwu,+ onye na-edebere ndị hụrụ ya n’anya+ na ndị na-eme ihe o nyere n’iwu+ ọgbụgba ndụ,+ onye na-egosikwa ha obiọma,*
6 biko, gee ntị,+ ka anya gị gherekwa oghe, ka i wee nụrụ ekpere ohu+ gị, bụ́ nke m na-ekpe n’ihu gị taa, ehihie na abalị,+ banyere ụmụ Izrel bụ́ ndị ohu gị, na-ekwupụta+ mmehie+ ụmụ Izrel mgbe niile, bụ́ nke anyị mere megide gị. Anyị emehiewo, mụ na ụlọ nna m.+
7 N’ezie, anyị emewo omume rụrụ arụ megide gị,+ anyị edebeghịkwa ihe i nyere n’iwu+ na ụkpụrụ+ gị na mkpebi ikpe+ ndị i nyere Mozis ohu gị+ n’iwu.
8 “Biko, cheta+ okwu i nyere Mozis ohu gị n’iwu, sị, ‘Ọ bụrụ na unu onwe unu emee omume ekwesịghị ntụkwasị obi, mụ onwe m kwa ga-achụsasị unu n’etiti ndị dị iche iche.+
9 Mgbe unu laghachikwutere m,+ debekwa ihe niile m nyere n’iwu+ ma mee ha,+ ọ bụrụgodị na ndị unu a chụsasịrị achụsasị nọ na nsọtụ eluigwe, m ga-esi n’ebe ahụ chịkọta+ ha, kpọlatakwa ha+ n’ebe ahụ m họọrọ ime ka aha m biri na ya.’+
10 Ha bụ ndị ohu gị+ na ndị gị,+ ndị i ji ike gị dị ukwuu+ na aka gị dị ike+ napụta.
11 Ewoo, Jehova, biko, ka ntị gị nụrụ ekpere ohu gị na ekpere+ ndị ohu gị, bụ́ ndị ịtụ egwu aha gị+ na-atọ ụtọ; biko, mee ka ohu gị nwee ihe ịga nke ọma taa,+ meekwa ka ọ bụrụ onye nwoke a ga-emere ebere.”+
Mụ onwe m na-eburu eze ihe ọṅụṅụ ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”