Nehemaya 10:1-39
10 Ndị bịanyere aka na ya+ bụ:
Nehemaya+ onye bụ́ Tesheta,+ nwa Hakalaya,+Na Zedekaya,
2 Seraya,+ Azaraya, Jeremaya,
3 Pash-họ, Amaraya, Malkaịja,
4 Hatọsh, Shebanaya, Malọk,
5 Herim,+ Meremọt, Obedaya,
6 Daniel,+ Ginetọn, Barọk,
7 Meshọlam, Abaịja, Mijamin,
8 Meazaya, Bilgaị na Shemaya, bụ́ ndị nchụàjà.
9 Ndị Livaị bụ: Jeshụa+ nwa Azanaya, Binuaị nwa Henadad,+ Kadmiel
10 na ụmụnne ha bụ́ Shebanaya,+ Hodaya, Kelaịta, Peleya, Henan,
11 Maịka, Rihọb, Hashabaya,
12 Zakọ, Sherebaya,+ Shebanaya,
13 Hodaya, Benaị na Benaịnu.
14 Ndị isi ndị Izrel bụ: Perọsh, Pehat-moab,+ Ilam, Zatu, Benaị,
15 Bọnaị, Azgad, Bibaị,
16 Adọnaịja, Bigvaị, Edin,
17 Eta, Hezekaya, Azọ,
18 Hodaya, Heshọm, Bizaị,
19 Herif, Anatọt, Nibaị,
20 Magpiash, Meshọlam, Hiza,
21 Meshezabel, Zedọk, Jadua,
22 Pelataya, Henan, Anaya,
23 Hoshia, Hananaya, Hashọb,
24 Halohesh, Pilha, Shobek,
25 Rihọm, Hashabna, Measaya,
26 nakwa Ahaịja, Henan, Enan,
27 Malọk, Herim, Beana.
28 Ma ndị anyị ndị ọzọ, ndị nchụàjà,+ ndị Livaị,+ ndị nche ọnụ ụzọ ámá,+ ndị na-abụ abụ,+ ndị Netinim+ na ndị niile kewapụrụ onwe ha n’ebe ndị ala a nọ+ ka ha wee debe iwu+ ezi Chineke, ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, onye ọ bụla nke maara ihe ma nwee nghọta,+
29 ha na-arapara n’ahụ́ ụmụnne ha,+ bụ́ ndị ukwu ha,+ na-aṅụ iyi+ nke pụrụ iwetara ha ọbụbụ ọnụ+ na ha ga na-eje ije n’iwu ezi Chineke, nke e nyere site n’aka Mozis bụ́ ohu ezi Chineke,+ na ha ga na-edebekwa+ ma na-eme ntụziaka niile nke Jehova bụ́ Onyenwe anyị+ nakwa mkpebi ikpe ya na ụkpụrụ ya;+
30 nakwa na anyị agaghị ekenye ndị ala a ụmụ anyị ndị inyom, anyị agaghịkwa alụtara ụmụ anyị ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.+
31 Anyị agaghị azụ ndị ala a+ ihe n’ụbọchị izu ike+ ma ọ bụ n’ụbọchị dị nsọ,+ bụ́ ndị na-ebute ngwá ahịa na ụdị ọka niile n’ụbọchị izu ike ka ha ree, anyị ga-ahapụ afọ nke asaa+ na ụgwọ onye ọ bụla ji.+
32 Anyị manyekwara onwe anyị, onye ọ bụla n’ime anyị, inye otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ego shekel kwa afọ maka ozi a na-eje n’ụlọ Chineke anyị,+
33 maka achịcha a na-edo n’usoro+ na àjà ọka* a na-achụ mgbe niile+ na àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe niile n’ụbọchị izu+ ike nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ maka oriri a kara aka+ na ihe ndị dị nsọ+ nakwa maka àjà mmehie+ a ga-eji kpuchie mmehie Izrel nakwa ọrụ niile a na-arụ n’ụlọ Chineke anyị.+
34 Anyị fekwara nza+ maka nkụ+ ndị nchụàjà, ndị Livaị na ndị ọzọ ga na-ebute n’ụlọ Chineke anyị, dị ka ụlọ nna nna anyị hà si dị, n’oge a kara aka, kwa afọ, nke a ga-eji mee ka ọkụ na-ere n’elu ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke anyị,+ dị ka ihe e dere n’iwu ahụ si dị;+
35 na iwebata mkpụrụ mbụ kara aka nke ala mepụtara+ nakwa mkpụrụ mbụ niile chara acha nke ụdị osisi niile mịrị,+ kwa afọ, n’ụlọ Jehova;
36 kpọtakwa ọkpara+ anyị ma weta anụ e bu ụzọ mụọ n’anụ ụlọ+ anyị, dị ka ihe e dere n’iwu+ ahụ si dị, nakwa anụ e bu ụzọ mụọ n’etiti ìgwè ehi anyị na ìgwè ewu na atụrụ+ anyị, iweta ha n’ụlọ Chineke anyị, inye ha ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọ Chineke+ anyị.
37 Ntụ ọka+ nke si ná mkpụrụ mbụ anyị na onyinye+ anyị na mkpụrụ nke ụdị osisi niile,+ mmanya ọhụrụ+ na mmanụ+ ka anyị ga-ebutekwara ndị nchụàjà n’ebe a na-eri ihe+ n’ụlọ Chineke anyị, nyekwa ndị Livaị+ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ala anyị mepụtara, ebe ọ bụ na ha, bụ́ ndị Livaị, bụ ndị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri n’obodo anyị dị iche iche a na-akọ ugbo.
38 Onye nchụàjà, bụ́ nwa Erọn, na ndị Livaị ga na-anọ mgbe ndị Livaị ga na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri; ndị Livaị ga-ewetakwa n’ụlọ Chineke+ anyị otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ụzọ n’ụzọ iri a ga-edebe n’ebe a na-eri ihe+ n’ụlọ ebe a na-akwakọba ihe.
39 N’ihi na ọ bụ n’ebe a na-eri ihe ka ụmụ Izrel na ụmụ ndị Livaị ga-eweta onyinye+ ọka, mmanya ọhụrụ+ na mmanụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka arịa ebe nsọ dị, bụrụkwa ebe ndị nchụàjà ndị na-eje ozi+ na ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ na ndị na-abụ abụ+ nọ; anyị ekwesịghị ileghara ụlọ Chineke anyị anya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.