Ọnụ Ọgụgụ 1:1-54

  • E debara aha ụmụ nwoke ndị ga-eso aga agha n’akwụkwọ (1-46)

  • Ndị Livaị agaghị eso aga agha (47-51)

  • Otú ndị Izrel ga-esi maa ụlọikwuu n’usoro n’usoro (52-54)

1  Jehova gwakwara Mosis okwu n’ala ịkpa Saịnaị,+ n’ụlọikwuu nzute,+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke abụọ, n’afọ nke abụọ ha pụtachara n’Ijipt.+ Ọ sịrị:  “Gụọnụ nzukọ Izrel niile ọnụ+ n’otu n’otu, ndị nke ọ bụla n’ezinụlọ ha, n’ọnụmara nke ha. Unu ga-agụ ụmụ nwoke niile ọnụ n’aha n’aha.  Gị na Erọn ga-edeba aha ndị dị afọ iri abụọ gbagowe n’akwụkwọ,+ bụ́ ndị nwere ike iso gaa agha n’Izrel. Unu ga-edeba aha ha n’akwụkwọ n’ìgwè ha n’ìgwè ha.  “Kpọrọnụ otu nwoke n’ebo nke ọ bụla. Onye ọ bụla n’ime ha ga-abụ onyeisi n’ọnụmara o si.+  Ihe a bụ aha ụmụ nwoke ndị ga-enyere unu aka: n’ebo Ruben, Elaịzọ+ nwa Shedeọ;  n’ebo Simiọn, Shelumiel+ nwa Zurishadaị;  n’ebo Juda, Nashọn+ nwa Aminadab;  n’ebo Ịsaka, Netanel+ nwa Zua;  n’ebo Zebulọn, Elayab+ nwa Hilọn; 10  n’ime ụmụ Josef: n’ebo Ifrem,+ Elishama nwa Amaịhọd; n’ebo Manase, Gameliel nwa Pedazọ; 11  n’ebo Benjamin, Abidan+ nwa Gidionaị; 12  n’ebo Dan, Ahayiza+ nwa Amishadaị; 13  n’ebo Asha, Pegiel+ nwa Ọkran; 14  n’ebo Gad, Elayasaf+ nwa Duel; 15  n’ebo Naftalaị, Ahaịra+ nwa Inan. 16  Ọ bụ ndị a ka e si ná nzukọ Izrel kpọpụta. Ha bụ ndị isi+ n’ebo ndị nna ha, ndị isi nke puku kwuru puku ndị Izrel.”+ 17  Mosis na Erọn wee kpọrọ ụmụ nwoke ndị a a kpọrọ aha. 18  Ha kpọkọtara nzukọ Izrel niile n’abalị mbụ n’ọnwa nke abụọ, ka ha deba aha ndị dị afọ iri abụọ gbagowe n’akwụkwọ n’otu n’otu, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara,+ 19  otú Jehova nyere Mosis n’iwu. O wee deba aha ha n’akwụkwọ n’ala ịkpa Saịnaị.+ 20  E debara aha ụmụ Ruben, bụ́ ọkpara Izrel,+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ n’otu n’otu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 21  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ruben dị puku iri anọ na isii na narị ise (46,500). 22  E debara aha ụmụ Simiọn+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ n’otu n’otu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 23  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Simiọn dị puku iri ise na itoolu na narị atọ (59,300). 24  E debara aha ụmụ Gad+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 25  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Gad dị puku iri anọ na ise, narị isii na iri ise (45,650). 26  E debara aha ụmụ Juda+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 27  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Juda dị puku iri asaa na anọ na narị isii (74,600). 28  E debara aha ụmụ Ịsaka+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 29  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ịsaka dị puku iri ise na anọ na narị anọ (54,400). 30  E debara aha ụmụ Zebulọn+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 31  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Zebulọn dị puku iri ise na asaa na narị anọ (57,400). 32  E debara aha ụmụ Josef, bụ́ ndị Ifrem mụrụ,+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 33  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ifrem dị puku iri anọ na narị ise (40,500). 34  E debara aha ụmụ Manase+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 35  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Manase dị puku iri atọ na abụọ na narị abụọ (32,200). 36  E debara aha ụmụ Benjamin+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 37  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Benjamin dị puku iri atọ na ise na narị anọ (35,400). 38  E debara aha ụmụ Dan+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 39  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Dan dị puku iri isii na abụọ na narị asaa (62,700). 40  E debara aha ụmụ Asha+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 41  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Asha dị puku iri anọ na otu na narị ise (41,500). 42  E debara aha ụmụ Naftalaị+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 43  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Naftalaị dị puku iri ise na atọ na narị anọ (53,400). 44  Ọ bụ ndị a ka Mosis na Erọn na mmadụ iri na abụọ bụ́ ndị isi Izrel debara aha ha n’akwụkwọ. Onye nke ọ bụla ná ndị isi a nọchiri anya ọnụmara o si. 45  E debara aha ndị Izrel niile dị afọ iri abụọ gbagowe, bụ́ ndị nwere ike ịga agha n’Izrel, n’akwụkwọ. E debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara. 46  Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+ 47  Ma, e debaghị aha ndị Livaị+ n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara mgbe e dere aha ndị Izrel ndị ọzọ.+ 48  Jehova gwara Mosis, sị: 49  “Ọ bụ naanị ebo Livaị ka ị na-agaghị edeba aha ha n’akwụkwọ. Agụnyekọtala ha ná ndị Izrel ndị ọzọ.+ 50  Ị ga-ahọpụta ndị Livaị ka ha na-elekọta ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya*+ na arịa ya niile na ihe niile a rụrụ maka ya.+ Ha ga na-ebu ụlọikwuu ahụ na arịa ya niile,+ ha ga na-ejekwa ozi na ya.+ Ha ga-ebi n’ụlọikwuu ha ndị ha ga-ama gburugburu ụlọikwuu ahụ.+ 51  Mgbe ọ bụla a ga-eburu ụlọikwuu ahụ gaa n’ebe ọzọ, ọ bụ ndị Livaị ga-atọtu ya.+ Mgbe ọ bụla a ga-akwụwa ụlọikwuu ahụ, ọ bụ ndị Livaị ga-akwụwa ya. Onye ọ bụla na-abụghị onye Livaị* bịara nso, a ga-egbu ya.+ 52  “Onye Izrel ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe e kenyere ya. Nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe ìgwè ebo atọ nke ebo ya so na ya mara ụlọikwuu,+ n’ìgwè ha n’ìgwè ha. 53  Ndị Livaị ga-ebi n’ụlọikwuu ndị ha ga-ama gburugburu ụlọikwuu ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị na ya,* ka a ghara iwesa nzukọ Izrel iwe.+ Ọ bụkwa ndị Livaị ga na-elekọta ụlọikwuu ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.”+ 54  Ndị Izrel mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla.”
Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”