Ọnụ Ọgụgụ 10:1-36

  • Opi ọlaọcha abụọ (1-10)

  • Ndị Izrel si na Saịnaị pụọ (11-13)

  • Otú ndị Izrel si akwali (14-28)

  • A gwara Hobab ka ọ na-ezi ndị Izrel ụzọ (29-34)

  • Ekpere Mosis na-ekpe ma ha pụwa (35, 36)

10  Jehova wee gwa Mosis, sị:  “Jiri ọlaọcha rụọrọ onwe gị opi abụọ.+ Ị ga-eji hama kụọ ha. Ị ga-eji ha na-akpọkọta nzukọ Izrel, jirikwa ha na-agwa ha mgbe ha ga-akwali.  Ọ bụrụ na a fụọ ha abụọ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta n’ebe ị nọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+  Ọ bụrụ otu ka a fụrụ, ọ bụ naanị ndị isi, ya bụ, ndị isi puku kwuru puku ndị Izrel, ga-ezukọta n’ebe ị nọ.+  “Ọ bụrụ na unu afụọ opi otú ọ ga-abụ ya dasitụ ike ya adalatatụ, ndị mara ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-akwali.  Ọ bụrụ na unu afụọ opi nke ugboro abụọ otú ọ ga-abụ ya dasitụ ike ya adalatatụ, ndị mara ụlọikwuu n’ebe ndịda+ ga-akwali. Ọ bụ otú a ka a ga-esi na-afụ opi mgbe ọ bụla otu n’ime ìgwè ndị Izrel na-akwali.  “Mgbe unu chọrọ ịkpọkọta ọgbakọ ahụ, unu ga-afụ opi,+ ma unu agaghị afụ ya otú ọ ga-abụ ya dasitụ ike ya adalatatụ.  Ọ bụ ụmụ Erọn ndị nwoke, bụ́ ndị nchụàjà, ga na-afụ opi ndị ahụ.+ Unu ga na-afụ ha n’ọgbọ unu niile. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide unu ga na-edebe.  “Ọ bụrụ na unu agaa agha n’ala unu ka unu lụso onye iro nke na-achọ unu okwu agha, unu ga-eji opi ndị ahụ fụọ opi agha.+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-echetakwa unu ma zọpụta unu n’aka ndị iro unu. 10  “N’oge dị iche iche unu na-aṅụrị ọṅụ,+ ya bụ, n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu, unu ga-afụ opi mgbe unu na-achụ àjà unu a na-esu ọkụ+ na àjà udo unu.+ Ịfụ opi ndị ahụ ga-eme ka Chineke unu cheta unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+ 11  N’afọ nke abụọ, n’abalị iri abụọ n’ọnwa nke abụọ,+ ígwé ojii ahụ si n’elu ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya* pụọ.+ 12  Ndị Izrel wee malite ịpụ n’ala ịkpa Saịnaị otú e nyere ha iwu ka ha si na-akwali mgbe ha na-akwaga ebe ọzọ.+ Ígwé ojii ahụ kwụsịrị n’ala ịkpa Peran.+ 13  Ihe a bụ nke mbụ ha kwaliri kemgbe Jehova si n’ọnụ Mosis nye ha ntụziaka otú ha ga-esi na-akwali.+ 14  Ìgwè ebo atọ nke ụmụ Juda wee buru ụzọ kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ọ bụ Nashọn+ nwa Aminadab bụ onyeisi ha. 15  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Ịsaka bụ Netanel+ nwa Zua. 16  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Zebulọn bụ Elayab+ nwa Hilọn. 17  Mgbe a tọturu ụlọikwuu ahụ,+ ụmụ Geshọn+ na ụmụ Meraraị,+ bụ́ ndị na-ebu ụlọikwuu ahụ, kwaliri. 18  Ìgwè ebo atọ Ruben wee kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ọ bụ Elaịzọ+ nwa Shedeọ bụ onyeisi ha. 19  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Simiọn bụ Shelumiel+ nwa Zurishadaị. 20  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Gad bụ Elayasaf+ nwa Duel. 21  Ụmụ Kohat, bụ́ ndị na-ebu ihe ndị dị n’ebe nsọ,+ kwaliziri. E kwesịrị ịma ụlọikwuu ahụ tupu ha erute. 22  Ìgwè ebo atọ ụmụ Ifrem wee kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ọ bụ Elishama+ nwa Amaịhọd bụ onyeisi ha. 23  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Manase bụ Gameliel+ nwa Pedazọ. 24  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Benjamin bụ Abidan+ nwa Gidionaị. 25  Ìgwè ebo atọ ụmụ Dan wee kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ha ga-anọ n’azụ na-eche ndị Izrel niile nche. Ọ bụ Ahayiza+ nwa Amishadaị bụ onyeisi ha. 26  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Asha bụ Pegiel+ nwa Ọkran. 27  Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Naftalaị bụ Ahaịra+ nwa Inan. 28  Ọ bụ otú a ka ndị Izrel si na-akwali n’ìgwè ha n’ìgwè ha mgbe ha na-akwaga ebe ọzọ.+ 29  Mosis wee gwa Hobab, nwa Ruel*+ onye Midian, bụ́ nna nwunye Mosis, sị: “Anyị na-akwaga n’ebe Jehova gwara anyị gbasara ya, sị, ‘M ga-enye ya unu.’+ Soro anyị gaa,+ anyị ga-emeta gị mma, n’ihi na Jehova ekwela ndị Izrel nkwa na ya ga-emere ha ihe ọma.”+ 30  Ma ọ sịrị ya: “Agaghị m aga. M ga-alaghachi n’obodo m ka m lakwuru ndị ikwu m.” 31  Mosis wee sị: “Biko, ahapụla anyị n’ihi na ị ma ebe anyị kwesịrị ịma ụlọikwuu n’ala ịkpa. Ị ga na-ezi anyị ụzọ.* 32  I soro anyị,+ anyị ga-emere gị ihe ọma ọ bụla Jehova meere anyị.” 33  Ha wee si n’ugwu Jehova pụwa+ gaa ije ụbọchị atọ. E bukwa igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova na-aga n’ihu ha n’ụbọchị atọ ahụ, ka ha chọta ebe ha ga-ezu ike.+ 34  Ígwé ojii+ Jehova nọkwa na-edu ha n’ehihie mgbe ha si n’ebe ha mara ụlọikwuu na-aga ebe ọzọ. 35  Mgbe ọ bụla e bu Igbe ahụ na-apụ, Mosis na-asị: “Jehova, biko, bilie+ chụsasịa ndị iro gị, ka ndị kpọrọ gị asị gbaa ọsọ n’ihi gị.” 36  Mgbe e buturu ya, ọ na-asị: “Jehova, biko, lọghachikwute puku kwuru puku ndị Izrel.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Ya bụ, Jetro.
Ma ọ bụ “Ị ga-abụ anya anyị.”