Ọnụ Ọgụgụ 11:1-35

  • Chineke zitere ọkụ maka na ndị Izrel nọ na-eme mkpesa (1-3)

  • Ndị Izrel bere ákwá ka e nye ha anụ (4-9)

  • Mosis kwuru na ya erughị eru (10-15)

  • Jehova nyere ndị okenye iri asaa mmụọ nsọ (16-25)

  • Eldad na Midad; Joshụa kwochiteere Mosis ekworo (26-30)

  • Chineke zitere nnụnụ kwel; a tara ndị Izrel ahụhụ maka anyaukwu (31-35)

11  Ndị Izrel malitere ime mkpesa n’ihu Jehova. Mgbe Jehova nụrụ ya, iwe were ya. Jehova wee zite ọkụ, ya amalite iregbu ụfọdụ ndị ná nsọtụ ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.  Mgbe ha malitere ibesara Mosis ákwá, Mosis rịọsiri Jehova arịrịọ ike,+ ọkụ ahụ anyụọ.  A kpọziri ebe ahụ Tabera* maka na ọkụ Jehova zitere rere ha.+  Ndị dị iche iche*+ ha na ha so wee nwewe akpịrị ogologo.+ Ndị Izrel malitekwara ibe ákwá, na-asị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa?+  Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu, nakwa kukumba, wọtamelọn, lik, yabaasị, na galik!+  Ma ugbu a, ike na-agwụzi anyị.* E nweghị ihe ọzọ anyị na-ahụ ma ọ́ bụghị mana a.”+  Mana+ yiri mkpụrụ kọrịanda,+ ọ na-achakwa ka eso* deliọm.  Ndị Izrel na-agagharị kporo ya ma jiri nkume e ji egwe nri gwee ya ma ọ bụ sụọ ya n’ikwe, ha ejirizie ite e ji esi nri sie ya ma ọ bụ jiri ya mee achịcha dị okirikiri.+ Ọ na-atọ ka keeki dị ụtọ a gwara mmanụ.  Ọ na-abụ igirigi daa n’abalị n’ebe ha mara ụlọikwuu, mana adaakwa.+ 10  Mosis nụrụ ka ndị Izrel na-ebe ákwá n’ezinụlọ n’ezinụlọ, onye nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya. Ezigbo iwe were Jehova,+ ihe ahụ wutekwara Mosis. 11  Mosis wee sị Jehova: “Gịnị mere i ji emesi ohu gị ike? Gịnịkwa mere na ihe m amasịghị gị, i wee buru ibu mmadụ niile a bokwasị m?+ 12  Ọ̀ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ̀ bụ m mụrụ ha, nke mere i ji sị m, ‘Kuru ha n’obi gị otú onye na-elekọta nwa si eku nwa na-aṅụ ara,’ ka m wee kuba ha n’ala ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ị ga-enye ha?+ 13  Olee ebe m ga-esi nweta anụ m ga-enye ndị a niile? N’ihi na ha na-ebesara m ákwá, sị, ‘Nye anyị anụ ka anyị taa!’ 14  Naanị m agaghị ebuli ibu mmadụ niile a. Ọ karịrị m akarị.+ 15  Ọ bụrụ otú a ka ị ga-esi na-emeso m, biko, gbuo m ozugbo.+ Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, ekwela ka m hụsikwuo anya.” 16  Jehova wee zaa Mosis, sị: “Si ná ndị okenye Izrel kpọkọtara m ụmụ nwoke iri asaa, ndị ị ma na ha bụ ndị okenye na ndị isi ndị Izrel.+ Kpọga ha n’ụlọikwuu nzute, meekwa ka gị na ha guzo n’ebe ahụ. 17  M ga-agbadata+ ma gwa gị okwu n’ebe ahụ.+ M ga-eweretụ mmụọ nsọ m+ dị n’ahụ́ gị nye ha. Ha ga-enyekwara gị aka n’ibu ibu ndị Izrel ka ị ghara ibu ya naanị gị.+ 18  Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Meenụ onwe unu ka unu dị nsọ maka echi+ n’ihi na unu ga-ata anụ, n’ihi na unu ebeela ákwá ná ntị Jehova,+ sị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa? Ihe dịịrị anyị mma n’Ijipt.”+ Jehova ga-enye unu anụ, unu ga-atakwa anụ.+ 19  Ọ bụghị naanị otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ ụbọchị ise ma ọ bụ ụbọchị iri ma ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka unu ga-ata anụ, 20  kama unu ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu ruo mgbe ọ ga-apụta unu n’imi sọwa unu oyi,+ n’ihi na unu jụrụ Jehova, onye nọnyeere unu. Unu nọkwa na-ebe ákwá n’ihu ya, na-asị: “Gịnị mere anyị ji si n’Ijipt pụta?”’”+ 21  Mosis wee sị: “Ndị a mụ na ha nọ dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000)+ ndị ji ụkwụ aga, ma i kwuru, sị, ‘M ga-enye ha anụ. Ha ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu.’ 22  E gbuo ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi, ọ̀ ga-ezuru ha? Ma ọ bụ, e gbute azụ̀ niile dị na mmiri, ọ̀ ga-ezuru ha?” 23  Jehova gwara Mosis, sị: “Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova?*+ Ugbu a, ị ga-ahụ ma ihe m kwuru ọ̀ ga-emezuru unu ka ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu.” 24  Mosis wee pụọ gwa ha ihe Jehova kwuru. Ọ kpọkọtara ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel wee mee ka ha guzo n’akụkụ ụlọikwuu ahụ.+ 25  Jehova wee gbadata n’ígwé ojii+ gwa ya okwu.+ O weretụụrụ mmụọ nsọ+ dị n’ahụ́ ya nye ndị okenye iri asaa ahụ. Ozugbo ha nwetara mmụọ nsọ ahụ, ha malitere ime ka ndị amụma.*+ Ma, ha emeghị ya ọzọ. 26  E nwere mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwoke ahụ ka nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu. Aha ha bụ Eldad na Midad. Ha nwetara mmụọ nsọ maka na ha so ná ndị e dere aha ha n’akwụkwọ. Ma ha agabeghị n’ụlọikwuu.* Ha wee malite ime ka ndị amụma n’ebe ha mara ụlọikwuu. 27  Otu nwa okorobịa gbaara ọsọ gaa gwa Mosis, sị: “Eldad na Midad na-eme ka ndị amụma n’ebe anyị mara ụlọikwuu!” 28  Joshụa+ nwa Nọn, onye na-ejere Mosis ozi kemgbe ọ bụ okorobịa, kwuru, sị: “Onyenwe m Mosis, kwụsị ha ime otú ahụ.”+ 29  Ma Mosis sịrị ya: “Ị̀ na-ekwochitere m ekworo? Emela otú ahụ, n’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na ndị Jehova niile bụ ndị amụma nakwa na Jehova ga-enye ha mmụọ nsọ ya.” 30  Mgbe e mechara, Mosis gaghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu, ya na ndị okenye Izrel. 31  Jehova wee mee ka ifufe fewe. Ifufe ahụ si n’oké osimiri na-ebute nnụnụ kwel ma na-eme ka ha na-efedata n’ebe niile ndị Izrel mara ụlọikwuu.+ Ha fedatara ruo n’ebe ga-ewe otu ụbọchị iji garuo ya ná mpaghara niile, gbaa gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu. Ha juru n’ala ruo ihe dị ka kubit* abụọ n’ịdị elu. 32  N’ihi ya, n’ehihie ụbọchị ahụ niile na n’abalị ya niile nakwa n’echi ya niile, ndị Izrel nọ na-anwụrụ nnụnụ kwel. E nweghị onye nwụtara nnụnụ kwel na-agaghị eju homa* iri. Ha nọ na-awụsara onwe ha nnụnụ ahụ gburugburu ebe niile ha mara ụlọikwuu.* 33  Ma mgbe ha ka kpụ anụ ahụ n’ọnụ, tupu ha ataa ya, Jehova wesara ha ezigbo iwe. Jehova wee gbuwe ọtụtụ n’ime ha.+ 34  Ha wee kpọọ ebe ahụ Kibrọt-hateeva,*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha liri ndị ahụ nwere akpịrị ogologo.+ 35  Ndị Izrel si na Kibrọt-hateeva kwaga Hazirọt. Ha wee nọrọ na Hazirọt.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Tabera pụtara “Nnukwu Ọkụ.”
O nwere ike ịbụ ndị na-abụghị ndị Izrel so ha.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “gọm.”
Na Hibru, “Aka Jehova ọ̀ dị mkpụmkpụ?”
Ma ọ bụ “malitere ibu amụma.”
Ya bụ, n’ụlọikwuu nzute.
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu homa bụ lita 220. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ na ha nọ na-eme ihe a ka anụ nnụnụ ndị ahụ kpọọ.
Kibrọt-hateeva pụtara “Ebe E Liri Ndị Akpịrị Ogologo.”