Ọnụ Ọgụgụ 34:1-29
34 Jehova gwakwara Mosis, sị:
2 “Gwa ndị Izrel ihe ndị a m na-agwa gị: ‘Mgbe unu banyere n’ala Kenan,+ bụ́ ala a ga-ekere unu ka ọ bụrụ nke unu, ebe ndị a ga-abụ ókè ala Kenan ahụ.+
3 “‘Ókè ebe ndịda unu ga-amalite n’ala ịkpa Zin n’akụkụ Ịdọm. Ókè ebe ndịda unu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-amalite na nsọtụ Oké Osimiri Nnu.+
4 Ókè unu ga-echezi ihu ebe ọzọ gaa n’ebe ndịda ụzọ e si agbago Akrabim+ wee ruo Zin. Ọ ga-ejedebe na ndịda Kedesh-bania.+ Ọ ga-eru Heza-ada,+ ruokwa Azmọn.
5 Ókè ahụ ga-eche ihu ebe ọzọ n’Azmọn wee ruo na Ndagwurugwu* Ijipt. Ọ ga-ejedebe n’Oké Osimiri Mediterenian.*+
6 “‘Ókè unu n’ebe ọdịda anyanwụ ga-abụ Oké Osimiri Mediterenian* na ụsọ ya. Ọ bụ ya bụ ókè unu n’ebe ọdịda anyanwụ.+
7 “‘Ihe a ga-abụ ókè unu n’ebe ugwu: Ókè unu ga-amalite n’Oké Osimiri Mediterenian ruo n’Ugwu Họọ.
8 Ókè unu ga-amalite n’Ugwu Họọ ruo Libo-hemat.*+ Ebe ókè ahụ ga-ejedebe bụ na Zidad.+
9 Ókè ahụ ga-erukwa Zifrọn. Ebe ọ ga-ejedebe bụ na Heza-inan.+ Ọ ga-abụ ókè unu n’ebe ugwu.
10 “‘Ókè unu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-amalite na Heza-inan ruo Shifam.
11 Ókè ahụ ga-esi na Shifam ruo Ribla, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Eyin. Ókè ahụ ga-agbada ma gafere mkpọda ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Kineret.*+
12 Ókè ahụ ga-eru n’Osimiri Jọdan. Ebe ọ ga-ejedebe bụ n’Oké Osimiri Nnu.+ Ọ bụ ya bụ ala unu+ na ókè ya niile gbaa gburugburu.’”
13 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Ọ bụ ala a ka unu ga-efe nza kee ka ọ bụrụ nke unu,+ otú Jehova nyere n’iwu ka e keere ebo itoolu na ọkara.
14 N’ihi na ebo ụmụ Ruben n’ọnụmara n’ọnụmara na ebo ụmụ Gad n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa ọkara ebo Manase enwetala ala nke ha.+
15 Ebo abụọ na ọkara ahụ enwetala ala nke ha ná mpaghara Osimiri Jọdan n’akụkụ Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ.”+
16 Jehova gwakwara Mosis, sị:
17 “Ihe a bụ aha ụmụ nwoke ndị ga-ekere unu ala unu ga-ebi na ya: Elieza+ onye nchụàjà na Joshụa+ nwa Nọn.
18 Unu ga-akpọrọ otu onyeisi n’ebo nke ọ bụla ka ha nye aka kee ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu.+
19 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke ndị ahụ: n’ebo Juda,+ Keleb+ nwa Jefune;
20 n’ebo ụmụ Simiọn,+ Shemuel nwa Amaịhọd;
21 n’ebo Benjamin,+ Elaịdad nwa Kislọn;
22 n’ebo ụmụ Dan,+ Bọkaị nwa Jọglaị, onye bụ́ onyeisi;
23 n’ime ụmụ Josef+ ndị si n’ebo ụmụ Manase,+ Haniel nwa Ịfọd, onye bụ́ onyeisi;
24 n’ebo ụmụ Ifrem,+ Kemuel nwa Shiftan, onye bụ́ onyeisi;
25 n’ebo ụmụ Zebulọn,+ Elizefan nwa Panak, onye bụ́ onyeisi;
26 n’ebo ụmụ Ịsaka,+ Paltiel nwa Azan, onye bụ́ onyeisi;
27 n’ebo ụmụ Asha,+ Ahaịhọd nwa Shilomaị, onye bụ́ onyeisi;
28 n’ebo ụmụ Naftalaị,+ Pedahel nwa Amaịhọd, onye bụ́ onyeisi.”
29 Ọ bụ ndị a ka Jehova nyere iwu ka ha keere ndị Izrel ala Kenan.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “Oké Osimiri ahụ.”
^ Na Hibru, “Oké Osimiri ahụ.”
^ Ma ọ bụ “ebe e si abanye Hemat.”
^ Ya bụ, ọdọ mmiri Genesaret, ma ọ bụ Oké Osimiri Galili.