Ọpụpụ 1:1-22
1 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke Izrel mụrụ, ya bụ, ndị so ya* bịa n’Ijipt, onye ọ bụla n’ime ha kpọ ezinụlọ ya bịa:+
2 Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda;+
3 Ịsaka, Zebulọn, na Benjamin;
4 Dan na Naftalaị; Gad na Asha.+
5 Ndị* niile a mụụrụ Jekọb dị mmadụ* iri asaa. Ma Josef nọ anọ n’Ijipt.+
6 Josef mechara nwụọ,+ ụmụnne ya niile na ọgbọ ahụ niile nwụkwara.
7 Ndị Izrel wee na-amụ ụmụ, malitekwa ịdị ọtụtụ. Ha nọkwa na-amụba n’ike n’ike ma na-esikwu nnọọ ike, nke mere na ha juru ebe niile n’ala ahụ.+
8 Ka oge na-aga, eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt.
9 O wee gwa ndị obodo ya, sị: “Lee, ndị Izrel ka anyị dị ọtụtụ, ha dịkwa ike karịa anyị.+
10 Ka anyị gosi ha na anyị ma ihe. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga na-amụba. Ọ bụrụkwa na agha adaa, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha ma si n’obodo a laa.”
11 Ha họpụtaziri ndị isi ga na-amanye ha ịrụ ọrụ ike ma na-emegbu ha.+ Ha manyekwara ha ịrụrụ Fero obodo ndị a ga na-akwakọba ihe na ha, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+
12 Ma ọ na-abụ ha na-emegbukwu ha, ha ana-amụbakwu ma na-agbasakwu n’ebe niile, nke mere na oké ụjọ jidere ha n’ihi ndị Izrel.+
13 N’ihi ya, ndị Ijipt ji ndị Izrel mere ndị ohu, na-echikwa ha ọnụ n’ala.+
14 Ha ji ọrụ ike ha na-amanye ha ịrụ mee ka ndụ kwụsị ịtọ ha ụtọ, na-amanye ha ịgwọ ájá ụrọ na ịkpụ brik, meekwa ka ha na-arụ ụdị ọrụ ike dị iche iche n’ubi. N’eziokwu, ha na-echi ha ọnụ n’ala ma na-eme ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.+
15 Mgbe e mechara, eze Ijipt gwara ụmụ nwaanyị Hibru na-aghọ́ nwa okwu. Aha ha bụ Shifra na Pua.
16 Ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-enyere ụmụ nwaanyị Hibru aka ịmụ nwa,+ leruonụ anya mgbe nwa ha na-apụta,* ọ bụrụ nwa nwoke, gbuonụ ya. Ma, ọ bụrụ nwa nwaanyị, hapụnụ ya ndụ.”
17 Ma, ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa na-atụ egwu ezi Chineke. Ha emeghị ihe eze Ijipt gwara ha. Kama, ha na-ahapụ ụmụ nwoke ndụ.+
18 Ka oge na-aga, eze Ijipt kpọrọ ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa, sị ha: “Gịnị mere unu ji ahapụ ụmụ nwoke ndụ?”
19 Ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa gwara Fero, sị: “Ụmụ nwaanyị Hibru adịghị ka ụmụ nwaanyị Ijipt. Ha gbasiri ike. Ha na-amụcha nwa tupu nwaanyị na-aghọ́ nwa abịakwute ha.”
20 Chineke wee meere ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa ihe ọma. Ndị Izrel nọkwa na-amụba ma na-esikwu nnọọ ike.
21 Chineke mechara mee ka ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa nwee ezinụlọ nke ha n’ihi na ha na-atụ egwu ya.
22 N’ikpeazụ, Fero nyere ndị obodo ya niile iwu, sị: “Tụbanụ nwa nwoke ọ bụla ndị Hibru mụrụ ọhụrụ n’osimiri Naịl, ma hapụnụ nwa nwaanyị ọ bụla ndụ.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Jekọb.”
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Na Hibru, “unu ahụ ha n’oche a na-anọ amụ nwa.”