Ọpụpụ 12:1-51

  • A malitere ime Ememme Ngabiga (1-28)

    • A ga-efesa ọbara n’awara ụzọ (7)

  • Ahụhụ nke iri: e gburu nwa mbụ ọ bụla (29-32)

  • Ndị Izrel si n’Ijipt pụwa (33-42)

    • Afọ 430 gwụrụ (40, 41)

  • Ndị ga-eso eri anụ Ememme Ngabiga (43-51)

12  Jehova gwaziri Mosis na Erọn okwu n’Ijipt, sị:  “Ọnwa a ga-abụrụ unu mbido ọnwa. Ọ ga-abụrụ unu ọnwa mbụ n’afọ.+  Gwanụ nzukọ Izrel niile, sị, ‘N’ụbọchị nke iri n’ọnwa a, ka onye ọ bụla n’ime ha were otu atụrụ*+ maka ụlọ nna ya, otu atụrụ maka otu ezinụlọ.  Ma, ọ bụrụ na ya na ndị ezinụlọ ya agaghị atachali otu atụrụ maka na ha adịghị ọtụtụ, ha na ndị agbata obi ha* ga-eke ya n’ụlọ ha. Chọpụtanụ anụ onye nke ọ bụla ga-atachali, unu ejiri ya gbakọọ mmadụ* ole unu ga-adị rie atụrụ ahụ.  Atụrụ* unu ga-ewere ga-abụ nke ahụ́ dị mma.+ Ọ ga-abụ oké gbara otu afọ. Unu nwere ike isi n’ụmụ ebule ma ọ bụ n’ụmụ ewu họrọ.  Unu ga na-elekọta ya ruo n’ụbọchị nke iri na anọ n’ọnwa a.+ Ezinụlọ ọ bụla so ná nzukọ Izrel ga-egbu ya ná mgbede.*+  Ha ga-eweretụ ọbara ya fesa n’awara ụzọ ha abụọ nakwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ebe ndị ha ga-anọ rie ya.+  “Ha ga-eri anụ ya n’abalị ahụ.+ Ha ga-ahụ ya n’ọkụ ma rie ya na achịcha na-ekoghị eko+ na akwụkwọ nri na-elu ilu.+  Erila nke ọ bụla n’anụ ya ná ndụ. Ejikwala mmiri sie ya, kama hụọ ya n’ọkụ, ma isi ya ma ụkwụ ya ma ihe ndị dị n’afọ ya. 10  Unu ahapụkwala nke ọ bụla n’ime ya ruo ụtụtụ, kama unu ga-akpọ ihe ọ bụla dịruru ụtụtụ ọkụ.+ 11  Otú a ka unu ga-esi eri ya: unu ga-eke ájị̀ n’úkwù, yiri akpụkpọ ụkwụ, jirikwa mkpara n’aka. Unu ga-erikwa ya ọkụ ọkụ. Ọ bụ Ememme Ngabiga Jehova. 12  N’ihi na m ga-agafe n’Ijipt n’abalị ahụ gbuo nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ.+ M ga-ekpekwa chi niile nke Ijipt ikpe ma taa ha ahụhụ.+ Abụ m Jehova. 13  Ọbara ahụ ga-abụrụ unu ihe àmà n’ụlọ ebe ndị unu nọ. M ga-ahụ ọbara ahụ ma gafere unu. Agaghị m eme unu ihe ọ bụla mgbe m ga-ata Ijipt ahụhụ.+ 14  “‘Unu ga na-echeta ụbọchị ahụ. Unu ga na-eme ememme na ya ka ọ bụrụ ememme a na-emere Jehova n’ọgbọ unu niile. Unu ga na-eme ya ka ọ bụrụ iwu unu ga na-edebe mgbe niile. 15  Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+ N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-ewepụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu, n’ihi na onye ọ bụla nke riri ihe e tinyere ihe na-eko achịcha, malite n’ụbọchị nke mbụ ruo n’ụbọchị nke asaa, a ga-egbu ya.* 16  N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ, nweekwa mgbakọ dị nsọ ọzọ n’ụbọchị nke asaa. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla n’ụbọchị ndị a.+ Ọ bụ naanị ihe onye* ọ bụla ga-eri ka e nwere ike ịkwadebe. 17  “‘Unu ga na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko+ n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka m ga-esi n’Ijipt kpọpụta ndị unu dị ọtụtụ.* Unu ga na-echeta ụbọchị ahụ n’ọgbọ unu niile ka ọ bụrụ iwu unu ga na-edebe mgbe niile. 18  N’ọnwa mbụ, n’ụbọchị nke iri na anọ ya, ná mgbede, unu ga na-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ná mgbede ụbọchị nke iri abụọ na otu n’ọnwa ahụ.+ 19  A gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu ruo ụbọchị asaa, n’ihi na onye ọ bụla riri ihe e tinyere ihe na-eko achịcha, ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa ma ọ̀ bụ nwa afọ,+ a ga-egbu ya.*+ 20  Unu erila ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha. Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko n’ụlọ unu niile.’” 21  Mosis kpọrọ ndị okenye niile nke Izrel ngwa ngwa,+ sị ha: “Onye ọ bụla gaa họrọ anụmanụ* maka ezinụlọ ya, gbuokwanụ anụmanụ ahụ maka Ememme Ngabiga. 22  Unu ga-ewere ùkwù ahịhịa hisop bịanye n’ọbara dị n’efere ma tee ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ unu nakwa n’awara ya abụọ. E nweghịkwa onye ọ bụla n’ime unu ga-apụta n’ọnụ ụzọ ụlọ ya ruo n’ụtụtụ. 23  Mgbe Jehova ga-agafe ka ọ taa ndị Ijipt ahụhụ, wee hụ ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ nakwa n’awara ya abụọ, Jehova ga-agafere ọnụ ụzọ ahụ. Ọ gaghị ekwe ka ahụhụ ahụ* gbuo onye ọ bụla n’ụlọ unu.+ 24  “Unu ga na-eme ememme a ka ọ bụrụ iwu unu na ụmụ unu ga na-edebe mgbe niile.+ 25  Mgbe unu batara n’ala ahụ Jehova ga-enye unu otú o kwuru, unu ga na-eme ememme a.+ 26  Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu, ‘Gịnị ka ihe a unu na-eme pụtara?’+ 27  unu ga-asị, ‘Ọ bụ àjà Ememme Ngabiga a na-achụrụ Jehova, bụ́ onye gafere ụlọ ndị Izrel n’Ijipt mgbe ọ tara ndị Ijipt ahụhụ, ma ọ hapụrụ ụlọ anyị.’” Ha* wee hulata kpọọ isiala. 28  Ndị Izrel wee gaa mee ihe Jehova nyere Mosis na Erọn n’iwu.+ Ha mere nnọọ otú ahụ. 29  N’etiti abalị, Jehova gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+ malite na nwa mbụ Fero, onye nọ n’ocheeze, ruo na nwa mbụ nke onye a dọtara n’agha nọ n’ụlọ mkpọrọ, nakwa nwa ọ bụla anụmanụ bu ụzọ mụọ.+ 30  Fero na ndị niile na-ejere ya ozi na ndị niile ọzọ bụ́ ndị Ijipt biliri n’abalị ahụ. Ndị Ijipt bekwara nnukwu ákwá n’ihi na e nweghị ụlọ mmadụ na-anwụghị na ya.+ 31  Fero kpọrọ Mosis na Erọn+ ozugbo n’abalị ahụ, sị: “Bilienụ, hapụnụ ndị obodo m pụọ, ma unu ma ndị Izrel ndị ọzọ. Gaanụ fee Jehova,* otú unu kwuru.+ 32  Chịrịkwanụ ìgwè ewu na atụrụ unu na ìgwè ehi unu pụwa, otú unu kwuru.+ Ma, unu ga-agọzikwa m.” 33  Ndị Ijipt wee malite ịgwa ndị Izrel ka ha pụwa ọsọ ọsọ+ n’ala ha, ha nọ na-asị, “n’ihi na anyị niile anwụọla anwụọ!”+ 34  Ndị Izrel wee jiri ákwà fụchie ihe* ha ji agwọ ntụ ọka ma buru ya n’ubu ha, ya na ntụ ọka ha gwọrọ agwọ nke ha na-etinyebeghị ihe na-eko achịcha. 35  Ndị Izrel mere ihe Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee nakwa ákwà.+ 36  Jehova mere ka ihe ha masị ndị Ijipt, nke mere na ha nyere ha ihe ndị ha rịọrọ. Ha wee gbawa ndị Ijipt aka.+ 37  Ndị Izrel wee si na Ramesis+ pụọ gawa Sọkọt.+ Ha dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000) ji ụkwụ aga, ma e wepụ ụmụntakịrị.+ 38  Ọtụtụ ndị dị iche iche*+ sokwa ha gawa. Ha chịkwa ìgwè atụrụ na ìgwè ehi dị nnọọ ọtụtụ. 39  Ha ji ntụ ọka ahụ a gwọrọ agwọ ha si n’Ijipt buru pụta mewe achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri. Ha etinyeghị ya ihe na-eko achịcha n’ihi na a chụpụrụ ha n’Ijipt ọkụ ọkụ, nke mere na ha enweghị ike iweta ihe ndị ha ga-eri.+ 40  Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt,+ ha ebiela narị afọ anọ na iri atọ (430)+ ka ndị mbịarambịa. 41  Mgbe narị afọ anọ na iri atọ (430) ahụ gwụrụ, ndị Jehova niile ndị dị ọtụtụ* si n’Ijipt pụọ. Ọ bụ nnọọ n’ụbọchị a ka ha pụrụ. 42  Ọ bụ abalị ha ga-emere Jehova ememme maka na ọ kpọpụtara ha n’Ijipt. Ndị Izrel niile ga na-echeta abalị a ka ọ bụrụ abalị a ga na-emere Jehova ememme n’ọgbọ ha niile.+ 43  Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: “Ihe a bụ iwu na-achị Ememme Ngabiga a: E nweghị onye mbịarambịa ga-eri ya.+ 44  Ma, ọ bụrụ na e nwere onye nwere ohu nwoke o ji ego zụta, a ga-ebi ya úgwù.+ Ọ bụzi mgbe ahụ ka o nwere ike iso rie ya. 45  Onye ọbịa na onye ọrụ e goro ego agaghị eri ya. 46  Ọ bụ n’otu ụlọ ka a ga-eri ya. Esila n’ụlọ were anụ ya ọ bụla pụọ n’èzí. Agbajikwala ọkpụkpụ ya ọ bụla.+ 47  Nzukọ Izrel niile ga-eme ememme a. 48  Ọ bụrụ na onye mbịarambịa bi n’ụlọ gị, ya achọọ imere Jehova Ememme Ngabiga, a ga-ebi ya na nwoke ọ bụla bi n’ụlọ ya úgwù. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-eme ememme a, ọ ga-adịzi ka nwa afọ. Ma, e nweghị nwoke a na-ebighị úgwù ga-eri ya.+ 49  Otu iwu ga na-achị nwa afọ na onye mbịarambịa nke binyeere unu.”+ 50  Ndị Izrel niile wee mee ihe Jehova nyere Mosis na Erọn n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ. 51  Ọ bụ n’ụbọchị a ka Jehova si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel na ìgwè ha dị iche iche.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, atụrụ ma ọ bụ ewu.
Na Hibru, “ya na onye agbata obi ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ya bụ, atụrụ ma ọ bụ ewu.
O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
Na Hibru, “a ga-egbupụ mkpụrụ obi ahụ n’Izrel.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “ndị agha unu.”
Na Hibru, “a ga-esi ná nzukọ Izrel gbupụ mkpụrụ obi ahụ.”
Ya bụ, atụrụ ma ọ bụ ewu.
Na Hibru, “mbibi ahụ.”
O nwere ike ịbụ ndị okenye Izrel.
Na Hibru, “jeere Jehova ozi.”
Ma ọ bụ “efere.”
Ya bụ, ndị dị iche iche na-abụghị ndị Izrel. Ndị Ijipt sokwa na ha.
Na Hibru, “ndị agha niile.”
Na Hibru, “ndị agha ha.”