Ọpụpụ 2:1-25

  • A mụrụ Mosis (1-4)

  • Ada Fero kpọọrọ Mosis, ya abụrụ nwa ya (5-10)

  • Mosis gbagara Midian ma lụọ Zipora (11-22)

  • Chineke nụrụ ude ndị Izrel na-asụ (23-25)

2  N’oge ahụ, otu nwoke nke si n’ezinụlọ Livaị lụrụ otu nwaanyị sikwa n’ezinụlọ Livaị.+  Nwaanyị ahụ wee dị ime, mụọ nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ otú nwa ahụ si maa mma, o zoro ya ruo ọnwa atọ.+  Mgbe ọ na-enweghịzi ike izo ya,+ o wetara nkata* e ji okporo papaịrọs kpaa, were bitumen na ihe yiri korota techie ya, nyiwe nwa ahụ n’ime ya ma dọsa ya n’ahịhịa amị ndị dị n’akụkụ Osimiri Naịl.  Ma nwanne ya nwaanyị+ guzo n’ebe dịtụ anya na-ele anya ka ọ mara ihe ga-eme ya.  Mgbe ada Fero gara ịsa ahụ́ n’Osimiri Naịl, ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi nọ na-agagharị n’akụkụ Osimiri Naịl. Ọ hụrụ nkata ahụ dị n’etiti ahịhịa amị. O wee dunye ohu ya nwaanyị ozugbo ka ọ gaa bute ya.+  Mgbe o meghere ya, ọ hụrụ nwa ahụ, nwa ahụ nọkwa na-ebe ákwá. O meteere nwa ahụ ebere.* Ma ọ sịrị: “Nwa a bụ otu n’ime ụmụ ndị Hibru.”  Nwanne ya nwaanyị wee sị ada Fero: “Ọ̀ bụ m gaa kpọọ otu nwaanyị Hibru ka o nyere gị nwa a ara?”  Ada Fero sịrị ya: “Gawa!” Ozugbo ahụ, nwata nwaanyị ahụ gara kpọọ nne nwatakịrị ahụ.+  Ada Fero sịrị ya: “Kuru nwa a nyewere m ya ara, m ga na-akwụ gị ụgwọ.” Nwaanyị ahụ wee kuru nwa ahụ na-enye ya ara. 10  Mgbe nwa ahụ tolitetụrụ, ọ kpọgaara ya ada Fero, ya abụrụ nwa ya.+ Ada Fero gụrụ ya Mosis* ma sị: “Ọ bụ maka na m si ná mmiri kupụta ya.”+ 11  N’oge ahụ, mgbe Mosis bụzi dimkpa,* ọ gakwuuru ụmụnne ya ka ọ hụ ọrụ ike ha na-arụ.+ Ọ hụrụ ka otu onye Ijipt na-eti onye Hibru, bụ́ otu n’ime ụmụnne ya, ihe. 12  Mosis legharịrị anya, ma e nweghị onye ọ hụrụ, ya egbuo onye Ijipt ahụ, zoo ya n’ime ájá.+ 13  Ma mgbe ọ pụrụ n’echi ya, ọ hụrụ ụmụ nwoke abụọ bụ́ ndị Hibru ka ha na-alụ ọgụ. O wee gwa onye nke mejọrọ ibe ya, sị: “Gịnị mere i ji eti nwanne gị ihe?”+ 14  O wee sị: “Ònye mere gị onye na-achị anyị na onyeikpe anyị? Ị̀ chọrọ igbu m otú i gburu onye Ijipt?”+ Ụjọ jidere Mosis, ya asị: “N’eziokwu, a matala ihe a!” 15  Fero nụrụ ihe merenụ, ya agbalịa ka o gbuo Mosis. Ma, Mosis gbara ọsọ, gawa ka o biri na Midian.+ Ọ gara nọdụ ọdụ n’akụkụ otu olulu mmiri. 16  Onye nchụàjà Midian+ nwere ụmụ nwaanyị asaa. Ụmụ nwaanyị ahụ bịara isere mmiri ka ha gbajuo ihe anụmanụ ji aṅụ mmiri, ka ha wee nye ìgwè ewu na atụrụ nna ha mmiri. 17  Ma ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Ọ bụ ihe ha na-emekarị. Mosis wee bilie nyere ụmụ nwaanyị ahụ aka* ma nye ìgwè ewu na atụrụ ha mmiri. 18  Mgbe ha lọtara gakwuru Ruel* nna ha,+ o juru ya anya, ya asị ha: “Olee otú unu si mee lọta ngwa ngwa taa?” 19  Ha zara, sị: “Otu onye Ijipt+ napụtara anyị n’aka ndị ọzụzụ atụrụ. O sepụtadịịrị anyị mmiri ma nye ìgwè ewu na atụrụ anyị mmiri.” 20  Ọ sịrị ha: “Oleekwanụ ebe nwoke ahụ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya? Gaanụ kpọọ ya, ka anyị na ya rie ihe.” 21  Mgbe e mechara, Mosis kwetara ibi na nke nwoke ahụ. Nwoke ahụ wee kpọnye Mosis Zipora nwa ya nwaanyị+ ka ọ lụwa. 22  Zipora mechara mụọ nwa nwoke, Mosis agụọ ya Geshọm,*+ maka na ọ sịrị: “Abụrụla m onye mbịarambịa n’ala ọzọ.”+ 23  Mgbe ogologo oge* gachara, eze Ijipt nwụrụ.+ Ma ndị Izrel ka nọ na-asụ ude maka na e ji ha mere ndị ohu, ha na-ebekwa ákwá arịrị. Ha nọkwa na-ebesara ezi Chineke ákwá ka o nyere ha aka maka na e ji ha mere ndị ohu.+ 24  Ka oge na-aga, Chineke nụrụ ude ha na-asụ.+ Chineke chetara ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, Aịzik, na Jekọb.+ 25  Chineke wee lebara ndị Izrel anya ma hụ ahụhụ ha na-ata.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “igbe.”
Ma ọ bụ “nweere ya ọmịiko.”
Mosis pụtara “Onye E Kupụtara Ekupụta,” ya bụ, onye a gụpụtara ná mmiri.
Ma ọ bụ “mgbe Mosis siwere ike.”
Ma ọ bụ “gbachitere ha.”
Ya bụ, Jetro.
Geshọm pụtara “Onye Mbịarambịa n’Ebe Ahụ.”
Na Hibru, “ọtụtụ ụbọchị.”