Ọpụpụ 24:1-18

  • Ndị Izrel kwetara ime ihe Jehova gwara ha (1-11)

  • Mgbe Mosis gara n’Ugwu Saịnaị (12-18)

24  O wee sị Mosis: “Gbagoo n’ugwu a gakwuru Jehova, gị na Erọn, Nedab na Abaịhu,+ na mmadụ iri asaa n’ime ndị okenye Izrel, nọrọkwanụ n’ebe dịtụ anya kpọọ isiala.  Naanị Mosis ga-abịa Jehova nso. Ma ndị ọzọ agaghị abịa nso, ndị Izrel ndị ọzọ agaghịkwa eso ya gbagoo.”+  Mosis wee bịa kọọrọ ndị Izrel ihe niile Jehova kwuru na ihe niile o kpebiri.+ Mmadụ niile wee jiri otu olu zaa, sị: “Anyị ga-eme ihe niile Jehova kwuru.”+  Mosis deziri ihe niile Jehova kwuru ede.+ O bilikwara n’isi ụtụtụ rụọ ebe ịchụàjà n’ala ala ugwu ahụ, gwunyekwa ogidi iri na abụọ nke dabara n’ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel.  Mgbe e mechara, o dunyere ụmụ okorobịa ndị Izrel, ha achụọ àjà a na-esu ọkụ, jirikwa oké ehi dị iche iche chụọrọ Jehova àjà udo.+  Mosis buuru ọkara ọbara ehi ndị ahụ gbanye n’efere ole na ole, fesa ọkara ọbara nke ọzọ n’ebe ịchụàjà.  O wee were akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ gụpụtara ha ya.+ Ha wee sị: “Anyị ga-eme ihe niile Jehova kwuru, anyị ga-erubekwa isi.”+  Mosis wee buru ọbara ahụ fesa ha+ ma sị: “Ihe a bụ ọbara ọgbụgba ndụ unu na Jehova gbara. Ihe ndị ha na ọgbụgba ndụ a so bụ ihe niile a unu nụrụ.”+  Mosis na Erọn, Nedab na Abaịhu, na mmadụ iri asaa n’ime ndị okenye Izrel gbagooro n’ugwu, 10  ha wee hụ Chineke Izrel.+ N’okpuru ụkwụ ya, e nwere ihe dị ka pevment e ji nkume safaya rụọ. Ọ na-enwu gbaa ka eluigwe.+ 11  Ma o meghị ụmụ nwoke ahụ na-anọchite anya ndị Izrel ihe ọ bụla,+ kama ha hụrụ ezi Chineke n’ọhụụ, ha rikwara nri ma ṅụọ mmanya. 12  Jehova wee sị Mosis: “Gbagote n’ugwu bịakwute m, nọrọkwa na ya. M ga-enye gị mbadamba nkume ndị m ga-edere ha iwu na ntụziaka m chọrọ ka ha na-eso.”+ 13  Mosis na Joshụa onye na-ejere ya ozi+ gawara, Mosis wee gbagoro n’ugwu ezi Chineke.+ 14  Ma ọ gwara ndị okenye ahụ, sị: “Cherenụ anyị n’ebe a ruo mgbe anyị ga-alọghachikwute unu.+ Unu na Erọn na Họọ+ nọ. Onye ọ bụla nwere okwu, ya gakwuru ha.”+ 15  Mosis wee gbagowe n’ugwu ahụ mgbe ígwé ojii na-ekpuchi ugwu ahụ.+ 16  Ebube Jehova+ dịgidere n’Ugwu Saịnaị,+ ígwé ojii kpuchikwara ugwu ahụ ruo ụbọchị isii. N’ụbọchị nke asaa, Chineke si n’ígwé ojii kpọọ Mosis. 17  N’anya ndị Izrel ndị na-ele ihe na-emenụ, ebube Jehova dị ka nnukwu ọkụ n’elu ugwu ahụ. 18  Mosis wee banye n’ime ígwé ojii ahụ ma gbagoo n’ugwu ahụ.+ Mosis nọrọ n’ugwu ahụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji