Ọpụpụ 27:1-21

  • Ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ (1-8)

  • Ogige ụlọikwuu (9-19)

  • Mmanụ e ji amụ ọkụ (20, 21)

27  “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà.+ Ọ ga-adị kubit* ise n’ogologo na kubit ise n’obosara. Ebe ịchụàjà ahụ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, ọ ga-adịkwa kubit atọ n’ịdị elu.+  Ị ga-arụnye mpi+ n’akụkụ ya anọ. Ị ga-arụkọta mpi ndị ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ka ha bụrụ otu, ị ga-ejikwa ọla kọpa machie ebe ịchụàjà ahụ.+  Ị ga-arụ bọket a ga-eji na-ekpopụ ntụ ya,* rụọkwa shọvel, efere, ndụdụ, na ihe ndị e ji agụnye ọkụ. Ị ga-ejikwa ọla kọpa rụọ arịa ya niile.+  Ị ga-eji ọla kọpa kpaa ihe a ga-etinye n’ime ebe ịchụàjà ahụ, jirikwa ọla kọpa kpụọ ihe anọ dị okirikiri ga-adị n’elu ihe ahụ a kpara akpa, n’akụkụ ya anọ.  Ị ga-etinye ihe ahụ a kpara akpa n’okpuru ọnụ ebe ịchụàjà ahụ. Ọ ga-adị n’ime ebe ịchụàjà ahụ, n’ebe etiti ya.  Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi maka ebe ịchụàjà ahụ, jirikwa ọla kọpa machie ha.  A ga-etinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri, ka okporo osisi ndị ahụ wee dịrị n’akụkụ abụọ nke ebe ịchụàjà ahụ mgbe a na-ebu ya.+  Ị ga-arụ ebe ịchụàjà ahụ ka ọ dị ka igbe osisi nwere oghere. Ị ga-arụ ya ka ọ dị nnọọ otú m gosiri gị n’ugwu.+  “Ị ga-agba ụlọikwuu ahụ ogige.+ N’akụkụ chere ihu n’ebe ndịda, ogige ya ga-enwe ákwà mgbochi ndị e ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa. Otu akụkụ ya ga-adị otu narị (100) kubit n’ogologo.+ 10  Ọ ga-enwe ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ nwere oghere ndị e ji ọla kọpa rụọ. Ị ga-eji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 11  Ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ugwu ya ga-adịkwa otu narị (100) kubit n’ogologo. Ọ ga-enwekwa ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ nwere oghere e ji ọla kọpa rụọ na ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha, bụ́ ndị e jicha ọlaọcha rụọ. 12  A ga-enwe ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ ogige ahụ. Ha ga-adị kubit iri ise n’obosara, nweekwa ogidi iri na ntọala iri ndị nwere oghere. 13  Akụkụ ogige ahụ nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-adị kubit iri ise n’obosara. 14  A ga-enwe ákwà mgbochi ndị dị kubit iri na ise n’otu akụkụ nakwa ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere.+ 15  A ga-enwekwa ákwà mgbochi ndị dị kubit iri na ise n’akụkụ ya nke ọzọ nakwa ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere. 16  “Ọnụ ụzọ ogige ahụ ga-enwe ákwà ngebichi* nke ga-adị kubit iri abụọ n’ogologo. A ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ya.+ Ọ ga-enwekwa ogidi anọ na ntọala anọ ndị nwere oghere.+ 17  Ogidi niile ndị ga-agba ogige ahụ gburugburu ga-enwe ihe ndị e ji ejikọ ihe na ha na ihe ndị e ji ekonye ihe, bụ́ ndị e jicha ọlaọcha rụọ. Ma, a ga-eji ọla kọpa rụọ ntọala ha ndị nwere oghere.+ 18  Ogige ahụ ga-adị otu narị (100) kubit n’ogologo,+ kubit iri ise n’obosara, na kubit ise n’ịdị elu. A ga-eji ezigbo ákwà linin a kpara akpa rụọ ya, ọ ga-enwekwa ntọala ndị nwere oghere e ji ọla kọpa rụọ. 19  A ga-eji ọla kọpa rụọ arịa niile a ga-eji na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ nakwa mkpọ́ ndị e ji ejide ụlọikwuu na mkpọ́ niile e ji ejide ogige ụlọikwuu ahụ.+ 20  “Ị ga-enye ndị Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv a na-agwaghị agwa a ga-eji na-amụ ọkụ, ka ọkụ* ndị ahụ wee na-enwu mgbe niile.+ 21  N’ụlọikwuu nzute, tupu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gebichie, nke dị nso n’igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ, Erọn na ụmụ ya ga na-ahụ na ọkụ* ndị ahụ na-enwu malite ná mgbede ruo n’ụtụtụ n’ihu Jehova.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ niile nke ndị Izrel ga na-edebe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.
Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.
Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Na Hibru, “n’Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “oriọna.”