Ọpụpụ 33:1-23

  • Chineke baara ndị Izrel mba (1-6)

  • A mara ụlọikwuu nzute n’ebe dịpụtụrụ adịpụ (7-11)

  • Mosis rịọrọ Jehova ka o gosi ya ebube ya (12-23)

33  Jehova gwakwara Mosis, sị: “Si n’ebe a kwalie, gị na ndị a i dupụtara n’Ijipt. Gawanụ n’ala m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi, sị, ‘M ga-enye ya ụmụ* gị.’+  M ga-edunye otu mmụọ ozi ka o butere gị ụzọ+ wee chụpụ ndị Kenan, ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+  Gawanụ n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Ma agaghị m eso unu gaa n’ihi na unu bụ ndị isi ike,*+ m nwekwara ike ibibi unu n’ụzọ.”+  Mgbe ndị Izrel nụrụ okwu a na-agba agba ná ntị, ha malitere iru uju, e nweghịkwa onye ọ bụla n’ime ha yiiri ihe o ji achọ mma.  Jehova sịrị Mosis: “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Unu bụ ndị isi ike.*+ M nwere ike ịbịa n’ebe unu mara ụlọikwuu bibie unu n’otu ntabi anya.+ N’ihi ya, unu eyila ihe ndị unu ji achọ mma, ka m chegodị ihe m ga-eme unu.’”  Ndị Izrel eyighịzi* ihe ndị ha ji achọ mma malite mgbe ha nọ n’Ugwu Horeb gawa.  Mosis sizi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu foro ụlọikwuu ya wee maa ya n’ebe dịpụtụrụ adịpụ ma kpọọ ya ụlọikwuu nzute. Onye ọ bụla chọrọ ịjụ Jehova ase+ na-esi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gaa n’ụlọikwuu nzute ahụ.  Ọ na-abụ Mosis gawa n’ụlọikwuu ahụ, mmadụ niile na-ebili guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ha. Ha na-elegidekwa Mosis anya ruo mgbe ọ banyere n’ụlọikwuu ahụ.  Ozugbo Mosis banyere n’ụlọikwuu ahụ, ogidi ígwé ojii+ na-agbadata kwụrụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ mgbe Chineke na Mosis na-ekwurịta okwu.+ 10  Mgbe ọ bụla ha niile hụrụ ka ogidi ígwé ojii ahụ kwụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, onye ọ bụla n’ime ha na-anọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya kpọọ isiala. 11  Jehova gwara Mosis okwu ihu na ihu+ otú mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu. Mgbe ọ bụla Mosis gaghachiri n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, Joshụa+ nwa Nọn, bụ́ onye ozi ya na onye na-enyere ya aka,+ anaghị esi n’ụlọikwuu ahụ apụ. 12  Mosis gwara Jehova, sị: “Lee, ị na-asị m, ‘Duru ndị a gawa,’ ma i mebeghị ka m mara onye ị ga-edunye m ka mụ na ya soro. I kwuokwala, sị, ‘Ama m gị nke ọma,* ihe gị masịkwara m.’ 13  Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, mee ka m mara ụzọ gị,+ ka m wee mara gị, ka ihe m na-adịkwa gị mma. Chetakwa na mba a bụ ndị gị.”+ 14  N’ihi ya, Chineke* sịrị: “Mụnwa* ga-eso gị aga.+ M ga-emekwa ka i zuru ike.”+ 15  Mosis wee sị ya: “Ọ bụrụ na gịnwa* agaghị eso anyị aga, edurula anyị pụọ ebe a. 16  Oleekwanụ otú a ga-esi amata na ihe mụ na ndị gị masịrị gị? Ọ́ bụghị ma i soro anyị gawa,+ ka mụ na ndị gị wee dị iche ná ndị niile ọzọ nọ n’ụwa?”+ 17  Jehova wee gwa Mosis, sị: “M ga-emekwa ihe a ị rịọrọ n’ihi na ihe gị masịrị m, amakwa m gị nke ọma.”* 18  Mosis wee sị: “Biko, gosi m ebube gị.” 19  Ma ọ sịrị: “M ga-agafe n’ihu gị ma mee ka ị hụ otú m si dị mma. M ga-akọsakwa aha m bụ́ Jehova n’ihu gị.+ Onye m chọrọ imere amara ka m ga-emere amara. Onye m chọkwara imere ebere ka m ga-emere ebere.”+ 20  Ma ọ sịkwara: “I nweghị ike ịhụ ihu m, n’ihi na e nweghị mmadụ ga-ahụ ihu m ma dị ndụ.” 21  Jehova kwukwara, sị: “Ebe a dị nso n’ebe m nọ. Nọrọ n’oké nkume a. 22  Mgbe ebube m na-agafe, m ga-eme ka ị banye n’ọgba dị n’oké nkume a. M ga-ejikwa aka m kpuchie gị ruo mgbe m gafere. 23  M gafechaa, m ga-ewepụ aka m. Ị ga-ahụkwa azụ m, ma ị gaghị ahụ ihu m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”
Na Hibru, “yipụrụ.”
Na Hibru, “Ama m gị n’aha.”
Na Hibru, “Ọ.”
Na Hibru, “Ihu m.”
Na Hibru, “ihu gị.”
Na Hibru, “ama m gị n’aha.”