Ọpụpụ 36:1-38
36 “Bezalel na Oholiab ga-arụkọ ọrụ, ha na nwoke ọ bụla nwere nkà,* bụ́ onye Jehova mere ka o nwee amamihe na nghọta ma mara otú e si arụ ọrụ niile gbasara ozi dị nsọ, otú Jehova nyere n’iwu.”+
2 Mosis wee kpọọ Bezalel na Oholiab na nwoke ọ bụla nwere nkà, bụ́ onye Jehova mere ka o nwee amamihe,+ onye ọ bụla o metụrụ n’obi iwepụta onwe ya ịrụ ọrụ ahụ.+
3 Ha wee nara Mosis onyinye niile+ ndị Izrel wetara a ga-eji arụ ọrụ gbasara ozi dị nsọ. Ma, ndị Izrel ka nọ na-ewetara Mosis onyinye si ha n’obi kwa ụtụtụ.
4 Mgbe ha malitere ọrụ ahụ dị nsọ, ndị niile nwere nkà nọ na-abịa n’otu n’otu.
5 Ha nọkwa na-asị Mosis: “Ndị Izrel na-eweta ihe karịrị ihe a chọrọ maka ọrụ a Jehova nyere iwu ka a rụọ.”
6 Mosis nyeziri iwu ka a maa ọkwa n’ebe niile ha mara ụlọikwuu, sị: “Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, unu ewetazila onyinye maka ọrụ a dị nsọ.” N’ihi ya, e mere ka ha kwụsị iweta ihe ọ bụla ọzọ.
7 Ihe ndị e wetara zuru maka ọrụ niile a ga-arụ, ha karịdịrị akarị.
8 Ndị niile nwere nkà+ wee jiri ákwà ụlọikwuu iri rụọ ụlọikwuu ahụ.+ Ha ji ezigbo eri linin a kpara akpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie, kpaa ákwà ụlọikwuu ndị ahụ. Ọ* kpara ndị cherob na ha.+
9 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ dị kubit* iri abụọ na asatọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu niile ahụ hà.
10 O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu ise nke ọzọ ọnụ.
11 O jizi eri na-acha anụnụ anụnụ dụnye oghere n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ise a dụkọtara ọnụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ. O mere otu ihe ahụ n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà ya nke ikpeazụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na nke ọzọ.
12 Ọ dụnyere oghere iri ise n’otu ákwà ụlọikwuu, dụnyekwa oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ, ka oghere ndị ahụ chee ibe ha ihu.
13 N’ikpeazụ, o ji ọlaedo rụọ nko iri ise ma jiri nko ndị ahụ jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ, ya abụrụ otu ụlọikwuu.
14 O wee jiri ajị ewu kpaa ákwà ụlọikwuu a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ. Ọ kpara ákwà ụlọikwuu iri na otu.+
15 Nke ọ bụla n’ime ákwà ụlọikwuu ndị ahụ dị kubit iri atọ n’ogologo na kubit anọ n’obosara. Ákwà ụlọikwuu iri na otu ahụ hà.
16 O wee dụkọta ákwà ụlọikwuu ise ọnụ, dụkọtakwa ákwà ụlọikwuu isii nke ọzọ ọnụ.
17 Ọ dụnyeziri oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu ahụ a dụkọtara ọnụ, n’ákwà ya nke ikpeazụ, n’ebe a ga-ejikọta ya na ákwà ụlọikwuu nke ọzọ. Ọ dụnyekwara oghere iri ise n’ọnụ ọnụ ákwà ụlọikwuu nke ọzọ a ga-ejikọta ya na ya.
18 O ji ọla kọpa rụọ nko iri ise a ga-eji jikọta ákwà ụlọikwuu ndị ahụ ka ha bụrụ otu.
19 O ji akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara mee ihe a ga-eji kpuchie ụlọikwuu ahụ, jirikwa akpụkpọ anụ sil mee ihe a ga-ekpukwasị n’elu ya.+
20 O jizi osisi akeshịa+ rụọ frem ndị kwụcha ọtọ a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ.+
21 Frem nke ọ bụla dị kubit iri n’ogologo na otu kubit na ọkara n’obosara.
22 Frem nke ọ bụla nwere ụkwụ abụọ nọkọtara ọnụ n’okpuru ya. Otú ahụ ka o si rụọ frem niile a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ.
23 Ọ rụrụ frem ndị ga-adị n’akụkụ ebe ndịda ụlọikwuu ahụ. Ha dị frem iri abụọ ndị chere ihu n’ebe ndịda.
24 O wee jiri ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ndị nwere oghere a ga-akwụnye frem iri abụọ ahụ na ha. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, bụ́ ebe ụkwụ ya abụọ ga-abanye, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ, bụ́ ebe ụkwụ ha abụọ abụọ ga-abanye.+
25 Ọ rụkwara frem iri abụọ ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu,
26 jirikwa ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ha ndị nwere oghere. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ.
27 Ọ rụrụ frem isii ndị ga-adị n’ebe azụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ.+
28 Ọ rụrụ frem abụọ ndị ga-adị n’azụ ụlọikwuu ahụ n’isi ngwụcha ya abụọ.
29 A rụrụ ha ka ha gbaa mkpị si n’ala ruo n’elu, ruo n’ebe ihe nke mbụ dị okirikiri dị. Otú ahụ ka o si rụọ frem ndị ga-adị n’isi ngwụcha abụọ nke ụlọikwuu ahụ.
30 Ha wee dịrị frem asatọ nakwa ntọala iri na isii ha nwere oghere bụ́ ndị e ji ọlaọcha rụọ. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru frem nke ọ bụla.
31 O ji osisi akeshịa rụọ okporo osisi, okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’otu akụkụ ụlọikwuu ahụ.+
32 Ọ rụkwara okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ nakwa okporo osisi ise maka frem ndị ga-adị n’akụkụ ebe azụ ụlọikwuu ahụ, n’ebe ọdịda anyanwụ.
33 Ọ rụrụ okporo osisi nke ga-adị n’etiti frem ndị ahụ ka o si n’otu isi ụlọikwuu ahụ ruo n’isi ya nke ọzọ.
34 O ji ọlaedo machie frem ndị ahụ. O jikwa ọlaedo rụọ ihe ndị dị okirikiri ga-ejide okporo osisi ndị ahụ, jirikwa ọlaedo machie okporo osisi ndị ahụ.+
35 O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi.+ Ọ kpara ndị cherob na ya.+
36 O jizi osisi akeshịa rụọrọ ya ogidi anọ ma were ọlaedo machie ha, jirikwa ọlaedo rụọ ihe e ji ekonye ha. O jikwa ọlaọcha rụọ ntọala anọ ndị nwere oghere a ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ha.
37 O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà ngebichi* ga-adị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu ahụ.+
38 Ọ rụkwara ogidi ise ya na ihe a ga-eji ekonye ihe na ha. O ji ọlaedo machie elu ha nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. Ma, ọ bụ ọla kọpa ka e ji rụọ ntọala ise ha ndị nwere oghere.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “onye ọ bụla obi ya ma ihe.”
^ O nwere ike ịbụ Bezalel.
^ Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
^ Ma ọ bụ “ihe ndị dị okirikiri” e ji ejikọta ihe.