Ọrụ Ndịozi 17:1-34

  • Mgbe Pọl na Saịlas nọ na Tesalonaịka (1-9)

  • Mgbe Pọl na Saịlas nọ na Beria (10-15)

  • Mgbe Pọl nọ n’Atens (16-22a)

  • Okwu Pọl kwuru n’Ariopagọs (22b-34)

17  Ha wee na-aga, gafee Amfipọlis na Apọlonịa, bịarute Tesalonaịka,+ bụ́ ebe e nwere ụlọ nzukọ ndị Juu.  Pọl wee banye n’ụlọ nzukọ ahụ otú ọ na-emekarị,+ na-enyere ndị nọ ebe ahụ aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ ruo ụbọchị izu ike atọ.+  Ọ nọ na-akọwa Akwụkwọ Nsọ, jirikwa ihe e dere na ya na-egosi na Kraịst ga-atarịrị ahụhụ,+ nwụọ, ma si n’ọnwụ bilie.+ Ọ sịkwara: “Jizọs bụ Kraịst, onye m na-agwa unu gbasara ya.”  N’ihi ya, ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na Pọl na Saịlas ana-anọkọ.+ Ìgwè ndị Grik na-atụ egwu Chineke na ọtụtụ ụmụ nwaanyị a ma ama mekwara otu ihe ahụ.  Ma iwe were ndị Juu,+ ha akpọkọta ụfọdụ ndị ọjọọ, ndị na-akwụgharị n’ọma ahịa, ha ekworo n’ìgwè, na-akpa aghara n’obodo ahụ niile. Ha gakwara n’ụlọ Jesin ka ha kpụrụ Pọl na Saịlas kpụnye ndị ahụ na-akpa aghara.  Ma mgbe ha na-ahụghị ha, ha kpụụrụ Jesin na ụmụnna ụfọdụ gakwuru ndị na-achị obodo, sị: “Ndị a ọrụ ha bụ ịkpata ọgba aghara ebe niile abịala ebe a,+  Jesin nabatakwara ha. Ndị a niile na-emebi iwu Siza, na-ekwu na e nwere eze ọzọ a na-akpọ Jizọs.”+  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-achị obodo nụrụ ihe ndị a, ezigbo iwe were ha.  Mgbe ha natachara Jesin na ndị nke ọzọ ego ha kwụrụ iji gbapụta onwe ha, ha hapụrụ ha ka ha laa. 10  Ozugbo chi jiri, ụmụnna zipụrụ Pọl na Saịlas ka ha gaa Beria. Mgbe ha garuru, ha banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu. 11  Ndị Beria ka ndị bi na Tesalonaịka achọ ịmụta ihe, n’ihi na ha ji obi ha niile nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe a gwara ha ọ̀ bụ eziokwu. 12  N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Grik a na-akwanyere ùgwù. 13  Ma mgbe ndị Juu ndị si Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusakwa okwu Chineke na Beria, ha bịara ebe ahụ ka ha mee ka ndị mmadụ malite ịkpa aghara.+ 14  Ụmụnna zipụrụ Pọl ozugbo ka ọ gawa n’akụkụ oké osimiri.+ Ma Saịlas na Timoti nọgidere ebe ahụ. 15  Ma, ndị na-edupụ Pọl duuru ya ruo Atens. Mgbe Pọl gwachara ha ka ha gwa Saịlas na Timoti+ ka ha bịakwute ya ozugbo, ha lawara. 16  Ma ka Pọl nọ na-eche Saịlas na Timoti n’Atens, o wutere ya mgbe ọ hụrụ na arụsị juru eju n’obodo ahụ. 17  N’ihi ya, ọ gara n’ụlọ nzukọ na-akụziri ndị Juu na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke ihe, na-enyere ha aka ịghọta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ na-agakwa n’ahịa kwa ụbọchị na-akụziri ndị nọ ebe ahụ ihe. 18  Ma ụfọdụ ndị ọkachamara, bụ́ ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik, malitere ịrụ ya ụka. Ụfọdụ nọ na-asị: “Gịnị ka onye ekwurekwu a chọrọ ikwu?” Ndị ọzọ ana-asị: “Ọ dị ka ọ̀ na-ekwusa gbasara chi ndị mba ọzọ.” Ha na-ekwu ihe a maka na ọ na-ezisa ozi ọma banyere Jizọs na mbilite n’ọnwụ.+ 19  Ha kpọọrọ ya gaa n’Ariopagọs,* sị ya: “Kọwaara anyị ihe ọhụrụ a ị na-akụzi. 20  N’ihi na ị na-akụzi ihe ntị anyị na-anụtụbeghị. Anyị chọkwara ịma ihe ihe ndị a pụtara.” 21  N’eziokwu, ndị Atens na ndị mba ọzọ niile bịara ịnọtụ ebe ahụ anaghị eji oge ha ji ezu ike eme ihe ọzọ ma e wezụga ịkọ ihe ọhụrụ ma ọ bụ igere ihe ọhụrụ. 22  Ma Pọl guzooro ọtọ n’etiti Ariopagọs+ wee sị: “Ndị Atens, ahụrụ m na, n’ihe niile, o yiri ka ùnu na-ekpere chi dị iche iche karịa ndị ọzọ.+ 23  Dị ka ihe atụ, mgbe m na-agafe ma na-eleru anya n’ihe ndị unu na-asọpụrụ,* ahụrụ m otu ebe ịchụàjà nke ihe e dere n’elu ya bụ: ‘Nke A Bụ nke Chi A Na-amaghị Ama.’ N’ihi ya, ọ bụ chi unu na-amaghị, nke unu na-efe, ka m na-ekwusara unu. 24  Chineke, onye kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, anaghị ebi n’ụlọ nsọ e ji aka rụọ+ n’ihi na ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa.+ 25  Ọ naghịkwa atụ anya ka ụmụ mmadụ nyere ya aka dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya,+ n’ihi na ọ bụ yanwa na-enye mmadụ niile ndụ na ume+ na ihe niile. 26  O sikwa n’otu mmadụ+ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị, meekwa ka ha biri n’elu ụwa niile.+ O kpebikwara oge ihe dị iche iche ga-eme nakwa ebe ụmụ mmadụ ga-ebi na ebe ha na-agaghị ebi.+ 27  N’ihi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ chọọ ya. Ọ bụrụkwa na ha agbaa mbọ chọọ ya, ha ga-achọta ya.+ N’eziokwu, ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso. 28  N’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije, na-adịkwa ndụ, otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ndị na-ede uri kwuru, sị: ‘N’ihi na anyị niile bụ ụmụ ya.’ 29  “Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ Chineke,+ anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume. Anyị ekwesịghịkwa iche na ọ dị ka ihe ụmụ mmadụ chepụtara kpụọ.+ 30  N’eziokwu, Chineke elefurula oge ahụ ndị mmadụ na-amaghị ihe ha na-eme anya.+ Ma ugbu a, ọ na-agwa mmadụ niile n’ebe niile ka ha chegharịa. 31  N’ihi na o wepụtala otu ụbọchị ọ ga-esi n’aka otu nwoke ọ họpụtara kpee mmadụ niile bi n’ụwa ikpe+ n’eleghị ha anya n’ihu. O meekwala ka obi sie mmadụ niile ike na ọ ga-eme ya, n’ihi na ọ kpọlitere nwoke ahụ n’ọnwụ.”+ 32  Mgbe ha nụrụ gbasara ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ, ụfọdụ malitere ịkwa ya emo.+ Ma, ndị ọzọ sịrị: “Anyị ga-achọ ịnụ gbasara ihe a n’oge ọzọ.” 33  Pọl wee si ebe ahụ pụọ. 34  Ma ụfọdụ ndị sooro ya, ghọọkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha bụ Dayọnisiọs, onye bụ́ ọkàikpe n’ụlọikpe Ariopagọs, na otu nwaanyị aha ya bụ Damaris, nakwa ndị ọzọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ bụ ugwu dị n’Atens n’oge ochie, ebe ụlọikpe kacha elu na-anọkwa ekpe ikpe.
Ma ọ bụ “na-efe.”