Ọrụ Ndịozi 26:1-32

  • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu Agrịpa (1-11)

  • Pọl kọrọ otú o si ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs (12-23)

  • Ihe Festọs na Agrịpa gwara Pọl (24-32)

26  Agrịpa+ wee sị Pọl: “I nwere ike ịzara ọnụ gị.” Pọl wee gbasaa aka ya, sị:  “Eze Agrịpa, obi dị m ụtọ na m nọ n’ihu gị taa na-azara ọnụ m n’okwu gbasara ebubo niile ndị Juu na-ebo m.+  Ihe kacha atọ m ụtọ bụ na ị bụ ọkachamara n’okwu gbasara omenala niile nke ndị Juu, ihe na-esere ha okwu dokwara gị anya. N’ihi ya, biko, nwee ndidi ka m na-azara ọnụ m.  “N’eziokwu, ọtụtụ ndị Juu ma m kemgbe m bụ nwata, malite n’oge m nọ n’obodo anyị ruo n’oge m bịara Jeruselem.+  Ọ bụrụkwa na ha chọrọ, ha ga-agwa gị na m bụbu onye Farisii.+ Ị makwa na ndị Farisii ka ndị Juu ndị ọzọ ekwu otú a ga-esi na-edebe iwu dị iche iche.+  Ma, ihe mere e ji na-ekpe m ikpe ugbu a bụ maka na m nwere olileanya na nkwa Chineke kwere nna nna anyị hà ga-emezu.+  Mmadụ niile n’ebo iri na abụọ anyị nwekwara olileanya na Chineke ga-emezu nkwa a. Ọ bụ ya mere ha ji na-efesi ya ike ehihie na abalị. Eze, ọ bụ maka na m nwere olileanya a mere ndị Juu ji na-ebo m ebubo.+  “Gịnị mere o ji esiri unu ike ikweta na Chineke na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?  E nwere oge m kpebiri na m ga na-emegide Jizọs onye Nazaret.* 10  Anọ m na-emegide ya na Jeruselem. Ndị isi nchụàjà nyekwara m ikike,+ mụ akpọchie ọtụtụ ndị nsọ n’ụlọ mkpọrọ.+ A chọọ igbu ha, m na-akwado ka e gbuo ha. 11  Atara m ha ahụhụ ọtụtụ ugboro n’ụlọ nzukọ niile iji manye ha ka ha kwụsị ikwere ihe ndị ha kweere. M na-agadị obodo dị iche iche na-akpagbu ha n’ihi otú m si kpọ ha asị. 12  “Otu ụbọchị, m nọ na-aga Damaskọs n’ihi na ndị isi nchụàjà nyere m ikike ka m gaa kpagbuo ha otú m na-eme. 13  Eze, ka m nọ na-aga n’okporo ụzọ n’etiti ehihie, ìhè karịrị ìhè anyanwụ si n’eluigwe nwuo gburugburu mụ na ndị so m na-aga.+ 14  Mgbe anyị niile dara n’ala, anụrụ m olu gwara m n’asụsụ Hibru, sị: ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ́ ma ị na-alụso m ọgụ.’* 15  Ma asịrị m, ‘Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?” Onyenwe anyị asị: “Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu. 16  Ma, bilie guzoro. Ihe mere m ji pụta n’ihu gị bụ ka m họrọ gị ka ị bụrụ ohu m nakwa ka ị na-ekwusa ihe ndị ị hụrụ na ihe ndị m ga-eme ka ị hụ banyere m.+ 17  M ga-anapụta gị n’aka ndị Juu nakwa n’aka ndị mba ọzọ, ndị m na-ezi gị ka ị gakwuru.+ 18  M na-eziga gị ka i meghee anya ha,+ ka ha wee si n’ọchịchịrị+ baa n’ìhè,+ sikwa n’aka Setan+ pụọ banye n’aka Chineke, ka Chineke gbaghara ha mmehie ha.+ Ọ ga-ejikwa maka okwukwe ha nwere na m doo ha nsọ ma gọzie ha otú o meere ndị ohu ya ndị ọzọ.’ 19  “N’ihi ya, Eze Agrịpa, ọ bụ ihe Jizọs gwara m n’ọhụụ ahụ ka m mere. 20  Ma, ebu m ụzọ zie ndị bi na Damaskọs+ ozi ahụ, mechaakwa zie ndị bi na Jeruselem,+ na Judia niile, nakwa ndị mba ọzọ, ka ha niile chegharịa, na-emekwa ihe gosiri na ha echegharịala+ ma lọghachikwute Chineke. 21  Ọ bụ ihe a ka ndị Juu kwo jide m n’ụlọ nsọ, chọọkwa igbu m.+ 22  Ma, n’ihi aka Chineke na-enyere m, ana m ezi ma ndị nta ma ndị ukwu ozi ọma ruo taa. Naanị ihe m na-ekwu bụ ihe Mosis na ndị amụma dere na ọ ga-eme.+ Ha dere na 23  Kraịst ga-ata ahụhụ,+ nakwa na ọ bụ onye mbụ a ga-akpọlite n’ọnwụ,+ onye ga-ekwusara mba a na ndị mba ọzọ ozi ọma, meekwa ka ìhè dị.”+ 24  Ma ka Pọl na-ekwu ihe ndị a iji zara ọnụ ya, Festọs ji oké olu, sị: “Pọl, isi emebiela gị! Oké akwụkwọ ị ma na-agbazi gị ara!” 25  Ma Pọl sịrị: “Festọs Onye Ukwu, ara anaghị agba m, kama, ihe m na-ekwu bụ eziokwu, uche zukwara m okè. 26  N’eziokwu, ihe mere m ji tụsara ahụ́ na-agwa eze ihe ndị a bụ maka na ọ ma ha nke ọma. O doro m anya na o nweghị otu n’ime ihe ndị a ọ na-amaghị, n’ihi na e nweghị nke e mere na nzuzo.+ 27  Eze Agrịpa, ì kweere ihe ndị amụma kwuru? Ama m na i kweere.” 28  Ma Agrịpa sịrị Pọl: “N’oge na-adịghị anya, ị ga-eme ka m ghọọ Onye Kraịst.” 29  Pọl wee sị: “Ihe m na-arịọ Chineke bụ ka ma gị ma ndị niile na-anụ olu m taa bụrụ Ndị Kraịst otú m bụ, ma ọ̀ bụ n’oge na-adịghị anya, ma ọ bụ ma e mechaa. Ma, achọghị m ka e kee unu agbụ otú a e kere m.” 30  Eze Agrịpa na gọvanọ na Benis nakwa ndị ha na ha nọ ọdụ wee bilie. 31  Ma ka ha na-apụ, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “O nweghị ihe nwoke a mere a ga-eji maka ya gbuo ya ma ọ bụ tụọ ya mkpọrọ.”+ 32  Agrịpa wee sị Festọs: “E wezụga na nwoke a sị na ọ chọrọ ka Siza kpee ikpe ya, a gaara ahapụ ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “na-emegide aha Jizọs onye Nazaret.”
Na Grik, “Ị na-emerụ onwe gị ahụ́ ma ị na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ.”