Ọrụ Ndịozi 3:1-26
3 Otu ụbọchị, ka Pita na Jọn nọ na-agbago n’ụlọ nsọ n’oge e ji ekpe ekpere, ya bụ, n’awa nke itoolu,*
2 e nwere otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya, onye e bu na-abịa ka e busa ya n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ nsọ a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Mara Mma. A na-ebusa ya ebe ahụ kwa ụbọchị ka o wee na-arịọ ndị na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ arịrịọ.
3 Mgbe ọ hụrụ ka Pita na Jọn na-achọ ịbanye n’ụlọ nsọ, ọ malitere ịrịọ ha arịrịọ.
4 Ma Pita na Jọn legidere ya anya wee sị ya: “Lee anyị anya.”
5 O wee legide ha anya, na-atụ anya ka ha nye ya ihe.
6 Ma, Pita sịrị: “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo. Ihe m nwere ka m ga-enye gị. N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, jewe ije!”+
7 O wee jide ya n’aka nri selite ya.+ Ozugbo ahụ, ụkwụ ya na nkwonkwo ụkwụ ya agbasie ike,+
8 ya amalie elu,+ malite ije ije, sorokwa ha banye n’ụlọ nsọ, na-eje ije, na-amali elu, na-etokwa Chineke.
9 Mmadụ niile hụkwara ya ka ọ nọ na-aga na-eto Chineke.
10 Ha matakwara onye ọ bụ, na ọ bụ ya bụ nwoke ahụ na-anọbu n’Ọnụ Ụzọ Mara Mma n’ụlọ nsọ na-arịọ arịrịọ.+ O juru ha nnọọ anya na ọ na-ejezi ije.
11 Ka nwoke ahụ ka ji Pita na Jọn aka, mmadụ niile kwooro gaa n’ebe ha nọ, n’ebe a na-akpọ Varanda Solomọn.+ Ọ tụkwara ha nnọọ n’anya.
12 Mgbe Pita hụrụ ihe a, ọ gwara ndị ahụ, sị: “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a merenụ ji na-eju unu anya? Gịnịkwa mere unu ji na-ele anyị ka à ga-asị na ọ bụ ike anyị ma ọ bụ maka na anyị na-efesi Chineke ike mere anyị ji mee ka nwoke a jewe ije?
13 Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb,+ ya bụ, Chineke nna nna anyị hà, emeela ka Jizọs,+ bụ́ Ohu ya, dị ebube,+ onye unu nyefere+ Paịlet, gọnahụkwa ya n’ihu ya, mgbe ọ chọrọ ịhapụ ya.
14 Unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume. Unu kwukwara ka a hapụrụ unu otu nwoke, bụ́ ogbu mmadụ.+
15 Ma, unu gburu Nnukwu Onye Ndú a họpụtara ka o nye ndị mmadụ ndụ.+ Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, anyị jikwa anya anyị hụ ya.+
16 Ọ bụ aha Jizọs ka anyị ji mee ka ụkwụ nwoke a unu na-ahụ, onye unu makwaara, gbasie ike. Ọ bụkwa maka na anyị kweere na aha ya na-akpa ike. Ihe mere ahụ́ ji dị nwoke a mma n’ihu unu niile bụ n’ihi na anyị kweere na Jizọs.
17 Ugbu a, ụmụnna m, ama m na unu mere ihe unu mere n’amaghị ụma,+ otú ndị na-achị unu mere.+
18 Ma, Chineke hapụrụ ka ihe ndị a mee iji mezuo ihe ndị o si n’ọnụ ndị amụma niile kwuo na ha ga-eme, ya bụ, na Kraịst ga-ata ahụhụ.+
19 “N’ihi ya, chegharịanụ,+ lọghachikwutekwanụ Jehova*+ ka o wee hichapụ mmehie unu,+ meekwa ka obi ruo unu ala.
20 Ọ ga-ezitekwa Kraịst ọ họpụtaara unu, ya bụ, Jizọs.
21 N’oge ochie, Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ kwe nkwa na ya ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ. Ma tupu oge ahụ eruo, Jizọs ga-anọgide n’eluigwe.
22 N’eziokwu, Mosis sịrị: ‘Jehova* bụ́ Chineke unu ga-esi n’ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka m.+ Geenụ ntị n’ihe ọ bụla ọ ga-agwa unu.+
23 A ga-ebibi onye ọ bụla* na-egeghị Onye Amụma ahụ ntị.’+
24 Ndị amụma niile, ma Samuel ma ndị sochiri ya, kwuchara gbasara oge a.+
25 Ndị amụma ahụ kwuru gbasara ọgbụgba ndụ Chineke na nna nna unu hà gbara. Unu sokwa n’ọgbụgba ndụ a,+ n’ihi na Chineke kwere Ebreham nkwa, sị: ‘M ga-esi n’aka nwa* gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.’+
26 Mgbe Chineke họpụtachara Ohu ya, o bu ụzọ zitere unu ya+ ka o mee ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ àgwà ọjọọ ya, si otú a gọzie unu.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ọ bụla.”
^ Na Grik, “mkpụrụ.”