Jọn Nke Mbụ 4:1-21
4 Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu niile yiri ka hà si n’aka Chineke,*+ kama chọpụtanụ ma hà si n’aka Chineke n’eziokwu,+ n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abanyela n’ụwa.+
2 Otú a ka unu ga-esi mata okwu si n’aka Chineke: Okwu ọ bụla nke na-egosi na Jizọs Kraịst bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa* bụ okwu si n’aka Chineke.+
3 Ma okwu ọ bụla nke yiri ka ò si n’aka Chineke, nke na-anaghị egosi na Jizọs bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa, esighị n’aka Chineke.+ Ọ bụkwa ya bụ okwu si n’aka onye na-emegide Kraịst, onye unu nụrụ na ọ na-abịa.+ Ugbu a, ọ nọrọla anọrọ n’ụwa.+
4 Ụmụntakịrị, unu si na Chineke, unu emeriekwala ha,+ n’ihi na onye unu na ya dị n’otu+ karịrị onye ya na ụwa dị n’otu.+
5 Ha si n’ụwa.+ Ọ bụ ya mere ha ji na-ekwu ihe si n’ụwa, ụwa na-egekwa ha ntị.+
6 Anyị si na Chineke. Onye ọ bụla nke ma Chineke na-ege anyị ntị.+ Onye ọ bụla na-esighị na Chineke anaghị ege anyị ntị.+ Ọ bụ otú a ka anyị si amata okwu nke bụ́ eziokwu na nke bụ́ ụgha.+
7 Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya,+ n’ihi na ịhụnanya si n’aka Chineke. Onye ọ bụla nke hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ nwa Chineke, ọ makwa Chineke.+
8 Onye ọ bụla na-anaghị ahụ ndị ọzọ n’anya amaghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.+
9 Ọ bụ otú a ka e si mee ka anyị mata na Chineke hụrụ anyị n’anya: Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya+ n’ụwa ka anyị wee si n’aka ya nweta ndụ.+
10 Otú a ka ịhụnanya a dị: Ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà maka mmehie anyị+ nke ga-eme ka anyị na ya dị n’udo.+
11 Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya, anyị kwesịkwara ịna-ahụ ibe anyị n’anya.+
12 E nweghị onye hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.+ Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ahụ ibe anyị n’anya, Chineke ga-anọgide n’ime anyị, a ga-emekwa ka ịhụnanya ya zuo okè n’ime anyị.+
13 Otú anyị si mara na anyị na ya ka dị n’otu, yanwa na anyịnwa adịrịkwa n’otu, bụ maka na o nyela anyị mmụọ ya.
14 Anyị ahụkwala ma na-agba àmà na Nna anyị zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ onye ga-azọpụta ụwa.+
15 Onye ọ bụla nke kwetara na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke,+ Chineke na onye ahụ ga na-adị n’otu, onye ahụ na Chineke ga na-adịkwa n’otu.+
16 Anyị amatakwala ma kwere na Chineke hụrụ anyị n’anya.+
Chineke bụ ịhụnanya.+ Onye nọgidere na-ahụ ndị ọzọ n’anya, ya na Chineke ga na-adị n’otu, Chineke na onye ahụ ga na-adịkwa n’otu.+
17 Otú a ka e si mee ka ịhụnanya zuo okè n’ime anyị, ka anyị wee jiri obi ike kwuo okwu+ n’ụbọchị ikpe, n’ihi na ọ bụ otú onye ahụ dị ka anyịnwa dị n’ụwa a.
18 Egwu ọ bụla adịghị n’ịhụnanya,+ kama ịhụnanya nke zuru okè na-achụpụ egwu, n’ihi na egwu na-egbochi anyị ime ihe anyị ga-emeli. N’eziokwu, e mebeghị ka onye na-atụ egwu zuo okè n’ịhụnanya.+
19 Anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.+
20 Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị: “Ahụrụ m Chineke n’anya,” ma ya akpọọ nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha.+ N’ihi na onye na-ahụghị nwanna ya n’anya,+ bụ́ onye ọ na-ahụ anya, agaghị ahụli Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-anaghị ahụ anya.+
21 Ọ bụkwa ihe a ka o nyere anyị n’iwu, na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya kwesịkwara ịhụ nwanna ya n’anya.+