Ndị Eze nke Mbụ 11:1-43

  • Ndị nwunye Solomọn mere ka obi ya pụọ n’ife Chineke (1-13)

  • Ndị iro Solomọn (14-25)

  • E kwere Jeroboam nkwa na ọ ga-achị ebo iri n’Izrel (26-40)

  • Solomọn nwụrụ, Rehoboam achịwazie (41-43)

11  Ma, Eze Solomọn hụrụ nwa Fero+ na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ si mba ọzọ n’anya,+ ma ụmụ nwaanyị ndị Moab,+ ma ndị nke Amọn,+ ma ndị nke Ịdọm, ma ndị nke Saịdọn,+ ma ndị nke Het.+  Ha si ná mba ndị ahụ Jehova gwara ndị Izrel gbasara ha, sị: “Unu na ha emekọrịtakwala ihe,* n’ihi na ha ga-arata unu* ka unu fewe chi ha.”+ Ma Solomọn bịara na-akpa ha nnọọ nso, hụkwa ha n’anya.  Ọ lụrụ narị ụmụ nwaanyị asaa (700), bụ́ ụmụ ndị eze, nweekwa narị ndị iko atọ (300). Ndị nwunye ya jikwa nwayọọ nwayọọ mee ka obi ya gharazie ịdị n’ife Chineke.  Mgbe Solomọn mere agadi,+ ndị nwunye ya mere ka o fewe chi ọzọ dị iche iche.+ O jighị obi ya niile fee Jehova bụ́ Chineke ya. O meghị ka Devid nna ya, onye ji obi ya niile fee Chineke.  Solomọn bidoro ife Ashtọret,+ bụ́ chi* ndị Saịdọn, nakwa Milkọm,+ bụ́ chi rụrụ arụ ndị Amọn na-efe.  Solomọn mere ihe dị njọ n’anya Jehova, o jighịkwa obi ya niile fee Jehova. O meghị ka Devid nna ya, onye ji obi ya niile fee Chineke.+  Mgbe ahụ ka Solomọn rụrụ ebe dị elu+ a ga-anọ na-efe Kimọsh, bụ́ chi rụrụ arụ ndị Moab na-efe, rụọkwa ebe a ga-anọ na-efe Molek,+ bụ́ chi rụrụ arụ ndị Amọn na-efe.+ Ọ rụrụ ha n’ugwu chere Jeruselem ihu.  Ọ rụkwaara ndị nwunye ya niile, bụ́ ndị mba ọzọ, ebe dị elu ha ga-anọ na-esu àjà ọkụ.  Jehova wesara Solomọn ezigbo iwe maka na o jighịzi obi ya niile na-efe Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ onye mere ka ọ hụ ya ná nrọ ugboro abụọ,+ 10  dọọkwa ya aka ná ntị ka ọ ghara ịga fewe chi ọzọ dị iche iche.+ Ma, o geghị Jehova ntị. 11  Jehova gwaziri Solomọn, sị: “N’ihi ihe a i mere, nakwa n’ihi na i mebiri ọgbụgba ndụ m, i debeghịkwa iwu ndị m nyere gị, m ga-anapụta gị alaeze a nye ya otu n’ime ndị na-ejere gị ozi.+ 12  Ma n’ihi Devid nna gị, agaghị m eme ya n’oge ị dị ndụ. Kama, ọ bụ nwa gị nwoke ka m ga-anapụta ya.+ 13  Ma, ọ bụghị alaeze a niile ka m ga-anapụta ya.+ M ga-enye nwa gị nwoke otu ebo+ n’ihi Devid ohu m nakwa n’ihi Jeruselem, bụ́ obodo m họọrọ.”+ 14  Jehova meziri ka Solomọn nwee onye iro.+ Onye iro ahụ bụ Hedad onye Ịdọm, onye si n’ezinụlọ eze ndị Ịdọm.+ 15  Mgbe Devid meriri Ịdọm,+ Joab bụ́ onyeisi ndị agha ya gara ili ndị e gburu egbu, gbaakwa mbọ igbu nwoke ọ bụla nọ n’Ịdọm. 16  (Joab na ndị agha Izrel niile biri ebe ahụ ọnwa isii ruo mgbe o gbuchara ụmụ nwoke niile nọ n’Ịdọm.) 17  Ma, Hedad na ụfọdụ ụmụ nwoke ndị Ịdọm ndị na-ejere nna ya ozi gbapụrụ, gbaga Ijipt. Hedad ka bụ nwata mgbe ahụ. 18  Ha si Midian gaa Peran. Ha kpọọrọ ụmụ nwoke ndị Peran+ gaa Ijipt gakwuru Fero eze Ijipt, ya enye Hedad ụlọ, nye ya ala, na-enyekwa ya nri. 19  Ihe Hedad masịrị Fero, nke na ọ kpọnyere ya nwanne nwunye ya ka ọ lụwa, ya bụ, nwanne Tapenes bụ́ nwunye eze. 20  Ka oge na-aga, nwanne Tapenes mụtaara Hedad nwa nwoke. Aha nwa ahụ bụ Genubat. Tapenes kpọọrọ ya, nọrọ n’ụlọ Fero na-azụ ya.* Genubat na ụmụ Fero nọkwa n’ụlọ Fero. 21  Hedad nọ n’Ijipt nụ na Devid anwụọla otú nna nna ya hà nwụrụ+ nakwa na Joab bụ́ onyeisi ndị agha anwụọla.+ N’ihi ya, Hedad sịrị Fero: “Hapụ m ka m laghachi n’obodo m.” 22  Ma Fero sịrị ya: “È nwere ihe kọrọ gị ebe a mụ na gị nọ, nke mere i ji na-achọ ịlaghachi n’obodo gị?” Ya asị ya: “Ọ dịghị ihe kọrọ m, ma hapụ m ka m laa.” 23  Chineke mekwara ka Solomọn nwee onye iro ọzọ,+ ya bụ, Rizọn nwa Elayada, onye gbapụrụ na nke onyenwe ya, bụ́ Hadadiza,+ eze Zoba. 24  Mgbe Devid meriri* ndị Zoba, Rizọn kpọkọrọ ụmụ nwoke ụfọdụ, ha aghọọ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga, yanwa abụrụ onyeisi ha.+ Ha gara biri na Damaskọs,+ malitekwa ịchị ebe ahụ. 25  Ọ nọ na-emegide ndị Izrel n’oge niile Solomọn na-achị, n’otu oge ahụ Hedad nọkwa na-enye ndị Izrel nsogbu. Rizọn ejighị anya ahụ ndị Izrel mgbe ahụ ọ na-achị ndị Siria. 26  Onye ọzọkwa malitere inupụrụ Solomọn isi+ bụ Jeroboam+ nwa Nibat, onye Zereda dị n’Ifrem. Jeroboam bụ onye na-ejere Solomọn ozi.+ Aha nne ya bụ Zerua, nwaanyị isi mkpe. 27  Otú a ka o si malite inupụrụ Solomọn isi: Solomọn rụrụ Milo,*+ rụsiekwa Obodo Devid, bụ́ obodo nna ya, ike.+ 28  Ma, Jeroboam bụ nwoke gbasiri ike. Mgbe Solomọn hụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike, o mere ya onye na-elekọta+ ndị o si n’ebo Josef kpọrọ ka ha na-arụ ọrụ. 29  N’oge ahụ, Jeroboam si na Jeruselem pụọ, Ahaịja onye amụma+ ahụ ya n’ụzọ. Ahaịja bụ onye Shaịlo, o yikwa uwe ọhụrụ mgbe ahụ. Naanị ha abụọ nọkwa. 30  Ahaịja wee dọwaa uwe ọhụrụ ahụ o yi iberibe iberibe ụzọ iri na abụọ. 31  Ọ gwakwara Jeroboam, sị: “Chịrị iberibe iri, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: ‘M ga-anapụta Solomọn alaeze ya, m ga-enyekwa gị ebo iri.+ 32  Ma, otu ebo ga-abụ nke ya+ n’ihi ohu m Devid+ nakwa n’ihi Jeruselem, bụ́ obodo m họọrọ n’ebo niile n’Izrel.+ 33  Ihe mere m ga-eji napụta ya alaeze ya bụ maka na ndị m ahapụla m,+ na-akpọrọ chi ọzọ dị iche iche isiala, ma Ashtọret bụ́ chi* ndị Saịdọn, ma Kimọsh bụ́ chi ndị Moab, ma Milkọm bụ́ chi ndị Amọn. Ha anaghị eme ka Devid nna Solomọn. Ha anaghị eme ihe otú m kwuru, ha anaghị eme ihe ziri ezi n’anya m, ha anaghị eso ntụziaka m, ha anaghịkwa eme ihe ndị m kpebiri. 34  Ma agaghị m anapụ ya alaeze ahụ niile. M ga-ahapụ ya ka ọ bụrụ onyeisi n’oge niile ọ dị ndụ, n’ihi ohu m Devid, bụ́ onye m họọrọ+ maka na o debere iwu m, sorokwa ntụziaka m. 35  Ma, m ga-anapụta nwa ya nwoke ebo iri ọ na-achị ma nye gị ha.+ 36  M ga-enye nwa ya otu ebo, ka e nwee onye si n’ezinụlọ ohu m Devid ga na-achị* n’ihu m na Jeruselem,+ bụ́ obodo m họọrọ ka a nọrọ na-eto aha m. 37  M ga-akpọrọ gị, ị ga-achịwa ebe niile ị chọrọ* ịchị, ị ga-abụkwa eze Izrel. 38  Ọ bụrụ na i debe iwu niile m ga-enye gị, na-eje ije n’ụzọ m, na-eme ihe ziri ezi n’anya m, na-eme ihe ndị m kwuru, na-edebekwa iwu m, otú ohu m Devid mere,+ m ga-anọnyere gị, meekwa ka ndị ezinụlọ gị chịtee aka, otú m meere ezinụlọ Devid.+ M ga-enyekwa gị Izrel. 39  M ga-eweda ụmụ Devid ala n’ihi ihe a ha mere,+ ma m gaghị eme ya mgbe niile.’”+ 40  Ihe a mere ka Solomọn chọwa otú ọ ga-esi gbuo Jeroboam. Ma, Jeroboam gbagara Ijipt, gbakwuru Shaịshak+ eze Ijipt.+ Ebe ahụ ka ọ nọkwa ruo mgbe Solomọn nwụrụ. 41  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Solomọn n’akwụkwọ e dere gbasara ndụ ya. E dere ihe niile o mere nakwa otú o si mara ihe.+ 42  Solomọn nọ na Jeruselem chịa Izrel niile afọ iri anọ. 43  N’ikpeazụ, Solomọn nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ, e liekwa ya n’Obodo Devid nna ya. Rehoboam nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Unu na ha agọkwala ọgọ.”
Na Hibru, “ga-enweta obi unu.”
Ya bụ, chi nwaanyị.
O nwere ike ịbụ, “kwụsị ya ara.”
Na Hibru, “gburu.”
Ọ bụ okwu Hibru nke pụtara “ebe e kpojuru ájá, ya adị mkputamkpu.”
Ya bụ, chi nwaanyị.
Na Hibru, “ka e nwee ọkụ ohu m Devid ga na-enwu mgbe niile.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị chọrọ.”