Ndị Eze nke Mbụ 14:1-31

  • Ahaịja buru amụma ihe ga-eme Jeroboam (1-20)

  • Rehoboam nọ na-achị Juda (21-31)

    • Shaịshak bịara lụso Jeruselem agha (25, 26)

14  N’oge ahụ, Abaịja nwa Jeroboam dara ọrịa.  N’ihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya: “Biko, bilie jigharịa ejiji ka a ghara ịmata na ị bụ nwunye m, gaakwa Shaịlo. Ahaịja onye amụma nọ ebe ahụ. Ọ bụ ya gwara m na m ga-abụ eze ndị a.+  Werekwa ogbe achịcha iri na keeki ndị a ghasara ihe n’elu nakwa otu karama mmanụ aṅụ gakwuru ya. Ọ ga-agwazi gị ihe ga-eme nwa anyị nwoke.”  Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru. O biliri gawa Shaịlo,+ rute n’ụlọ Ahaịja. Ma, anya Ahaịja anaghịzi emegharị emegharị, ọ naghịkwa ahụ ụzọ n’ihi na o meela agadi.  Ma Jehova gwara Ahaịja, sị: “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụ gị ase banyere nwa ya nwoke na-arịa ọrịa. M ga-agwa gị ihe ị ga-agwa ya.* Ya rute, ọ ga-eme ka a ghara ịmata onye ọ bụ.”  Ozugbo Ahaịja nụrụ ụda ụkwụ ya ka ọ na-abata n’ọnụ ụzọ, ọ sịrị ya: “Nwunye Jeroboam, batawa. Gịnị mere i ji na-eme ka a ghara ịmata onye ị bụ? O nwere ozi ọjọọ Chineke sị m zie gị.  Lawa, gwa Jeroboam, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: “N’ime ndị obodo unu niile, m họọrọ gị ka ị na-edu ndị Izrel bụ́ ndị m.+  M napụtara ezinụlọ Devid alaeze ha na-achị ma nye gị ya.+ Ma, ị dịghị ka Devid ohu m, onye debere iwu m, jiri obi ya niile soro m, meekwa naanị ihe ziri ezi n’anya m.+  Kama ị bịara na-eme ihe ọjọọ karịa ndị niile bu gị ụzọ. I meere onwe gị chi ọzọ, ya bụ, arụsị ndị a kpụrụ akpụ, iji kpasuo m iwe.+ Ị gbakụtakwara m azụ.+ 10  Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka ọdachi dakwasị ezinụlọ gị. M ga-egbukwa nwa nwoke ọ bụla si n’ezinụlọ gị, ma onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ma onye na-enweghị ume n’Izrel. M ga-ekpochapụkwa ndị ezinụlọ Jeroboam+ otú mmadụ si ekpopụ nsị anụmanụ ruo mgbe o kpopụchara ya. 11  Onye ezinụlọ Jeroboam ọ bụla nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ozu ya, onye nke nwụrụ n’ọhịa, nnụnụ ga-eri ozu ya, n’ihi na Jehova ekwuola ya.”’ 12  “Ugbu a, bịa lawa n’ụlọ gị. Ụkwụ gị kpahaala n’obodo unu, nwa ahụ ga-anwụ. 13  Ndị Izrel niile ga-eruru ya uju ma lie ya. Naanị ya ka a ga-eli eli n’ime ndị ezinụlọ Jeroboam, n’ihi na a bịa n’ezinụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị ya ka Jehova bụ́ Chineke Izrel hụrụ ihe dị mma n’obi ya. 14  Jehova ga-eme ka e nwee eze ga-achị Izrel, onye ga-ebibi ndị ezinụlọ Jeroboam+ mgbe oge ruru. O nwedịrị ike ime ya ugbu a. 15  Jehova ga-ebibikwa ndị Izrel, ha adị ka ahịhịa amị na-aṅagharị na mmiri. Ọ ga-efopụkwa ndị Izrel n’ọmarịcha ala a o nyere ndị nna nna ha.+ Ọ ga-achụsasịkwa ha, chụrụ ha gafee Osimiri Yufretis,+ n’ihi na ha mere ogwe osisi arụsị* ha na-efe,+ na-akpasu Jehova iwe. 16  Ọ ga-agbahapụkwa ndị Izrel n’ihi mmehie niile Jeroboam mere, ndị mekwara ka ndị Izrel mehie.”+ 17  Nwunye Jeroboam wee lawa, lọrute Teza. Mgbe o ruru n’ọnụ ụzọ ụlọ ha, nwa ha nwoke ahụ nwụrụ. 18  Ha wee lie ya, ndị Izrel niile eruokwara ya uju, otú Jehova si n’ọnụ ohu ya, bụ́ Ahaịja onye amụma, kwuo. 19  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jeroboam, ma otú o si lụọ agha+ ma otú o si chịa, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 20  Jeroboam chịrị afọ iri abụọ na abụọ, mechaakwa nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ.+ Nedab nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+ 21  N’oge ahụ, Rehoboam nwa Solomọn malitere ịchị na Juda. Rehoboam dị afọ iri anọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jeruselem, bụ́ obodo Jehova họọrọ+ n’ime ebo niile n’Izrel ka a nọrọ na-eto aha ya.+ Aha nne Rehoboam bụ Neama. Ọ bụ nwaanyị Amọn.+ 22  Ndị Juda nọkwa na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+ Ihe ọjọọ ha mere kpasukwara ya iwe karịa otú ihe ọjọọ ndị nna nna ha mere kpasuru ya.+ 23  Hanwa nọkwa na-arụ ebe ndị dị elu, ogidi arụsị, na ogwe osisi arụsị*+ n’ugwu ọ bụla dị elu+ nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.+ 24  E nwekwara ụmụ nwoke bụ́ ndị akwụna* n’ala a.+ Ndị a niile na-akpa ụdị arụ niile mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihi ndị Izrel na-akpa. 25  N’afọ nke ise n’ọchịchị Rehoboam, Shaịshak+ eze Ijipt bịara lụso Jeruselem agha.+ 26  O bukọọrọ akụ̀ dị n’ụlọ Jehova nakwa akụ̀ dị n’ụlọ* eze.+ O buuru ihe niile, ma ọta ọlaedo niile Solomọn rụrụ.+ 27  Eze Rehoboam wee were ọla kọpa rụọ ọta ọ ga-eji dochie ha. O nyefekwara ha n’aka ndị isi ndị nche,* ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọ eze nche. 28  Mgbe ọ bụla eze bịara n’ụlọ Jehova, ndị nche ahụ na-abata buru ha. Ha na-emechakwa bughachi ha n’ụlọ ndị nche. 29  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Rehoboam na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda.+ 30  Rehoboam na Jeroboam nọkwa na-alụ agha oge niile.+ 31  N’ikpeazụ, Rehoboam nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ. E likwara ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid.+ Aha nne ya bụ Neama, nwaanyị Amọn.+ Abaịjam* nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Lekwa lekwa ihe ị ga-agwa ya.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”
A na-akpọkwa ya Abaịja.