Ndị Eze nke Mbụ 19:1-21

  • Ịlaịja gbara ọsọ ndụ ka Jezibel ghara igbu ya (1-8)

  • Jehova mere ka Ịlaịja hụ ya n’ugwu Horeb (9-14)

  • Ịlaịja ga-ete Hazel, Jihu, na Ịlaịsha mmanụ (15-18)

  • A họpụtara Ịlaịsha ka ọ nọchie Ịlaịja (19-21)

19  Ehab+ gara kọọrọ Jezibel+ ihe niile Ịlaịja mere na otú o si jiri mma agha gbuo ndị amụma ahụ niile.+  Jezibel wee zie mmadụ ka o zie Ịlaịja, sị: “Ka chi m taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike,* ma ọ bụrụ na n’ụdị oge a echi emeghị m ka ị dị ka ndị amụma ahụ i gburu!”*  Egwu wee tụwa Ịlaịja, ya ebilie gbaa ọsọ ndụ,*+ gbaga Bia-shiba+ dị na Juda.+ Ọ hapụkwara onye na-ejere ya ozi ebe ahụ.  O ji otu ụbọchị gaa ije garuo ala ịkpa. Mgbe o ruru, ọ gara nọrọ ọdụ n’okpuru otu osisi a na-akpọ brum. Ọ rịọkwara Chineke ka ọ* nwụọ. Ọ sịrị: “Jehova, biko, o zuola. Mee ka m nwụọ,*+ n’ihi na akaghị m nna nna m hà mma.”  Mgbe o kwuchara ihe a, ya edinara ala n’okpuru osisi brum ahụ, ụra eburu ya. Ma, otu mmụọ ozi bịara metụ ya aka,+ sị ya: “Bilie rie nri.”+  Mgbe o lere anya, ọ hụrụ achịcha dị n’elu nkume dị ọkụ na otu nnukwu iko mmiri. E dosara ha n’akụkụ isi ya. Ọ tara achịcha ahụ, ṅụọ mmiri ahụ, dinarakwa.  Mmụọ ozi Jehova mechara bịa nke ugboro abụọ metụkwa ya aka, sị: “Bilie rie nri, n’ihi na ebe ị ga-aga dị ezigbo anya.”  O biliri rie nri, ṅụọkwa mmiri, nwetazie ume o ji gaa ije ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. Ọ gagidere ruo Horeb, bụ́ ugwu nke ezi Chineke.+  Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ banyere n’otu ọgba,+ rahụkwa na ya n’abalị ahụ. Ma, Jehova jụrụ ya, sị: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme ebe a?” 10  Ya asị: “Eji m ezigbo ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha.+ Ma ndị Izrel ahapụla ọgbụgba ndụ gị.+ Ha akụtuola ebe ịchụàjà gị, jirikwa mma agha gbuo ndị amụma gị,+ ya afọzie naanị m. Ugbu a, ha na-achọ igbu m.”*+ 11  Ma Chineke sịrị ya: “Gaa guzoro n’ihu Jehova n’ugwu a.” Jehova nọkwa na-agafe Ịlaịja,+ oké ifufe ana-agbawa ugwu na nnukwu nkume n’ihu Jehova.+ Ma, Jehova anọghị n’ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ kwụsịrị, ala mara jijiji,+ ma, Jehova anọghị n’ala ọma jijiji ahụ. 12  Mgbe ala ọma jijiji ahụ kwụsịrị, ọkụ gbawara.+ Ma, Jehova anọghị n’ọkụ ahụ. Mgbe ọkụ ahụ nyụrụ, a nụrụ olu onye weturu olu na-ekwu okwu.+ 13  Ozugbo Ịlaịja nụrụ ya, ọ chịịrị uwe e ji mara ya fụchie ihu ya+ gaa guzoro n’ọnụ ọgba ahụ. Ma, otu olu jụrụ ya, sị: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme ebe a?” 14  Ya asị: “Eji m ezigbo ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha. Ma ndị Izrel ahapụla ọgbụgba ndụ gị.+ Ha akụtuola ebe ịchụàjà gị, jirikwa mma agha gbuo ndị amụma gị, ya afọzie naanị m. Ugbu a, ha na-achọ igbu m.”*+ 15  Jehova asị ya: “Gaghachi n’ala ịkpa Damaskọs. Ị garuo, tee Hazel mmanụ+ ka ọ bụrụ eze Siria. 16  Ị ga-agakwa tee Jihu nwa nwa Nimshaị mmanụ+ ka ọ bụrụ eze Izrel, teekwa Ịlaịsha* nwa Shefat, onye Ebel-mehola, mmanụ ka ọ bụrụ onye amụma ga-anọchi gị.+ 17  Onye ọ bụla Hazel na-ejighị mma agha gbuo,+ Jihu ga-egbu ya.+ Onye ọ bụla Jihu na-ejighị mma agha gbuo, Ịlaịsha ga-egbu ya.+ 18  A ka nwere puku mmadụ asaa (7,000) n’Izrel,+ ndị na-egbutụbereghị Bel ikpere n’ala,+ ndị na-esusutụbeghịkwa ya ọnụ.”+ 19  Ịlaịja wee si ebe ahụ pụọ, hụ Ịlaịsha nwa Shefat ka o ji ehi iri abụọ na anọ e jikọrọ abụọ abụọ na-akọ ọrụ. Ha niile nọ ya n’ihu, ma, yanwa nọ na-edu abụọ ndị ikpeazụ. Ịlaịja gakwuuru ya wụkwasị ya uwe e ji mara ya.+ 20  Ịlaịsha wee hapụ ehi ndị ahụ gbakwuru Ịlaịja, sị ya: “Biko, ka m gaa susuo nne m na nna m ọnụ, mụ abịazie sowe gị.” Ya asị ya: “Gawa, egbochighị m gị ịga.” 21  Ọ laghachiziri, kpụrụ ehi abụọ chụọ àjà, jiri osisi e ji jikọta ehi ndị ahụ sie anụ ha, bupụtakwara ya ndị mmadụ, ha erie. Mgbe ha richara, o sooro Ịlaịja, malitekwa ijere ya ozi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ka chi m mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya.”
Ma ọ bụ “ka mkpụrụ obi gị dị ka mkpụrụ obi ndị amụma ahụ i gburu.”
Ma ọ bụ “gbaa ọsọ maka mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “wepụ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “iwepụ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “iwepụ mkpụrụ obi m.”
Ịlaịsha pụtara “Chineke Bụ Nzọpụta.”