Ndị Eze nke Mbụ 20:1-43

  • Ndị Siria gara lụso Ehab agha (1-12)

  • Ehab meriri ndị Siria (13-34)

  • E buru ihe ga-eme Ehab n’amụma (35-43)

20  Ben-hedad+ eze Siria+ chịkọtara ndị agha ya niile, kpọọkwa ndị eze iri atọ na abụọ ọzọ, ha agbara ịnyịnya ha na ụgbọ ịnyịnya ha gaa nọchibido+ Sameria,+ lụsokwa ya agha.  O zikwara ndị mmadụ, ha agaa n’obodo ahụ zie Ehab+ eze Izrel, sị: “Ben-hedad kwuru, sị,  ‘Ọlaọcha gị na ọlaedo gị, ndị nwunye gị ndị kacha mma na ụmụ gị ndị kacha mma, bụ nke m.’”  Eze Izrel asị ya: “Onyenwe m eze, ihe i kwuru bụ eziokwu. Abụ m nke gị, ihe m niile bụkwa nke gị.”+  Ndị ahụ Ben-hedad ziri ozi mechara bịa ọzọ sị Ehab: “Ben-hedad kwuru, sị, ‘M ziri gị ozi, sị: “Ị ga-enye m ọlaọcha gị na ọlaedo gị, kpọnyekwa m ndị nwunye gị na ụmụ gị.”  Ma, ụdị ugbu a echi, m ga-ezitere gị ndị na-ejere m ozi. Ha ga-abịa n’ụlọ gị na n’ụlọ ndị na-ejere gị ozi, jiri nwayọọ leruo ihe niile anya, ha ga-ewerekwa ihe ọ bụla ha hụrụ baara unu ezigbo uru.’”  Mgbe eze Izrel nụrụ ihe a, ọ kpọrọ ndị okenye niile nọ n’obodo ya, sị ha: “Biko, lekwanụ otú nwoke a si na-achọ itinye anyị ná nsogbu. O ziteere m ozi ka m kpọnye ya ndị nwunye m na ụmụ m nakwa ka m bunye ya ọlaọcha m na ọlaedo m, mụ ekweta.”  Ma, ndị okenye ahụ niile na mmadụ niile nọ ebe ahụ sịrị ya: “Ekwela, emekwala ihe o kwuru.”  Ọ gwaziri ndị ozi Ben-hedad, sị: “Gwanụ onyenwe m bụ́ eze, sị, ‘M ga-eme ihe niile i ziri ohu gị na mbụ. Ma, agaghị m eme nke ugbu a.’” Ndị ozi ahụ lawaziri gaa kọọrọ Ben-hedad ihe ha jetara. 10  Ben-hedad zigakwaara eze Izrel ozi, sị ya: “Ka chi m taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike,* ma ọ bụrụ na iberibe nkume ndị ga-adị na Sameria ma a kụrichaa ụlọ ndị dị na ya ga-eju ọbụ aka ndị niile so m!” 11  Eze Izrel asị: “Gwanụ ya, sị, ‘Onye ka na-ejike agha ejike ekwesịghị itu ọnụ ka onye meriri n’agha.’”+ 12  Ozugbo ọ nụrụ ihe a, mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ nọ na-aṅụ mmanya n’ụlọikwuu,* ọ gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “Jikerenụ agha!” Ha wee jikere ịlụso ndị Izrel agha. 13  Ma, otu onye amụma gakwuuru Ehab+ eze Izrel, sị ya: “Jehova kwuru, sị, ‘Ị̀ hụrụ ìgwè mmadụ a niile? M ga-enyefe ha n’aka gị taa. Ị ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”+ 14  Ehab asị: “Ònye ka a ga-esi n’aka ya eme ya?” Ya asị: “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-esi n’aka ndị na-enyere ndị isi mpaghara dị iche iche aka.’” Ehab ajụọ ya, sị: “Ònye ga-amalite agha?” Ya asị ya: “Ọ bụ gịnwa.” 15  Ehab gụziri ndị na-enyere ndị isi mpaghara dị iche iche aka ọnụ, gụta ha narị mmadụ abụọ na iri atọ na abụọ (232). Mgbe ọ gụchara ha, ọ gụrụ ndị agha Izrel niile, gụta ha puku mmadụ asaa (7,000). 16  Ha gawara n’ehihie mgbe Ben-hedad na ndị eze ahụ bịara inyere ya aka nọ n’ụlọikwuu* na-aṅụ mmanya, ya ana-egbu ha. Ndị eze ahụ dị iri atọ na abụọ. 17  Ndị ahụ na-enyere ndị isi mpaghara dị iche iche aka bu ụzọ pụta ịlụso ha agha. Ozugbo ha pụtara, Ben-hedad zigara ndị ozi ka ha gaa mata ndị ha bụ. Ha gara ma bịa gwa ya, sị: “Ha si Sameria bịa.” 18  Ben-hedad asị ha: “Ọ bụrụ na ha bịara ime udo, jidenụ ha ná ndụ. Ọ bụrụ na ha bịara agha, jidekwanụ ha ná ndụ.” 19  Ma, mgbe ndị ahụ na-enyere ndị isi mpaghara dị iche iche aka nakwa ndị agha so ha n’azụ si n’obodo ha pụta, 20  ha gburu ndị iro ha. Ndị Siria wee gbaa ọsọ,+ ndị Izrel achụwa ha. Ma Ben-hedad bụ́ eze Siria rịgooro n’ịnyịnya gbaa ọsọ, ya na ụfọdụ ndị na-agba ịnyịnya. 21  Ma eze Izrel pụrụ, na-egbu ndị na-agba ịnyịnya na ndị nke na-agba ụgbọ ịnyịnya, si otú ahụ sụọ ndị Siria akwụ.* 22  Mgbe e mechara, onye amụma+ bịakwutere eze Izrel, sị ya: “Lawa, mee ka ndị agha gị sikwuo ike. Mara ihe ị ga-eme,+ n’ihi na ná mbido afọ ọzọ, eze Siria ga-abịa ịlụso gị agha.”+ 23  Ma ndị na-adụ eze Siria ọdụ sịrị ya: “Chineke ha bụ Chineke ugwu. Ọ bụ ya mere ha ji merie anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị alụso ha agha n’ala dị larịị, anyị ga-emeri ha. 24  Meekwa ihe a: Jiri ndị gọvanọ dochie ndị eze niile,+ ka ọ bụrụ ha ga na-edu ndị agha. 25  Kpọkọta ndị agha há ka ndị agha gị ahụ e gburu, nwetakwa ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị ị ga-eji dochie ole i nweburu. Ka anyị gazie lụso ha agha n’ala dị larịị, ka anyị hụ ma ọ̀ bụ na anyị agaghị emeri ha.” Eze Siria gere ha ntị, meekwa ihe ha kwuru. 26  Ná mbido afọ, Ben-hedad kpọkọtara ndị Siria ha agaa Efek+ ka ha lụso ndị Izrel agha. 27  A kpọkọtakwara ndị Izrel, nye ha ihe ndị dị ha mkpa, ha agawa ịlụso ndị Siria agha. Mgbe ndị Izrel mara ụlọikwuu n’ihu ha, ha dị ka obere ìgwè ewu abụọ. Ma, ndị Siria juru ebe niile.+ 28  Onye nke ezi Chineke gara gwa eze Izrel, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị Siria sịrị: “Jehova bụ Chineke ugwu, ọ bụghị Chineke ala dị larịị.” N’ihi ya, m ga-enyefe ìgwè mmadụ a niile n’aka gị.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”+ 29  Ha nọgidere n’ụlọikwuu ruo ụbọchị asaa, cherịta ibe ha ihu. N’ụbọchị nke asaa, ha malitere ịlụ agha. Ndị Izrel gbukwara otu narị puku (100,000) ndị agha ndị Siria ji ụkwụ aga, n’otu ụbọchị. 30  Ndị fọdụrụ gbara ọsọ gbaga Efek.+ Ma mgbidi ya dakwasịrị puku mmadụ iri abụọ na puku asaa (27,000) fọrọnụ. Ben-hedad gbagakwara obodo ahụ, gaa zoo n’otu akụkụ ọnụ ụlọ dị n’ime ime. 31  Ndị na-adụ ya ọdụ sịrị ya: “Anyị nụrụ na ndị eze Izrel na-eme ebere.* Biko, ka anyị kee ákwà iru uju n’úkwù, keekwa eriri n’isi, ka anyị gakwurukwa eze Izrel. O nwere ike ghara igbu gị.”*+ 32  Ha keziri ákwà iru uju n’úkwù, keekwa eriri n’isi, bịakwute eze Izrel, sị ya: “Ohu gị bụ́ Ben-hedad sịrị, ‘Biko, egbula m.’”* Ya asị: “Ọ̀ ka dị ndụ? Nwanne m ka ọ bụ.” 33  Ndị ahụ bịaranụ weere ihe a o kwuru ka ihe na-egosi na ije ha enweela isi, werekwa ya na o si ya n’obi. N’ihi ya, ha sịrị: “Ben-hedad bụ nwanne gị.” Ya asịzie: “Gaanụ kpọọ ya.” Ben-hedad wee gakwuru ya, Ehab agwa ya ka ọ rịgote n’ụgbọ ịnyịnya ya, ya arịgoro. 34  Ben-hedad asị ya: “M ga-enyeghachi gị obodo niile nna m naara nna gị. Ị chọọ, gị agaa na Damaskọs rụọ ebe ndị unu ga na-ere ahịa, otú nna m rụrụ na Sameria.” Ehab asị ya: “Ọ bụ maka ihe a mụ na gị kwekọrịtara* ka m ga-eji ahapụ gị ka ị lawa.” Ha abụọ gbaziri ndụ, Ehab ahapụ ya ka ọ lawa. 35  Otu n’ime ụmụ ndị amụma*+ gwara otu nwoke ya na ya nọ ihe Jehova sịrị ya gwa ya. Ọ gwara ya, sị: “Biko, tie m ihe.” Ma nwoke ahụ ekweghị eti ya ihe. 36  Ya asị ya: “Ebe ọ bụ na i meghị ihe Jehova kwuru, ozugbo i si ebe a m nọ pụọ, ọdụm ga-adọgbu gị.” Mgbe o sikwa ebe ahụ ọ nọ pụọ, ọdụm hụrụ ya ma dọgbuo ya. 37  Ọ hụkwara nwoke ọzọ, sị ya: “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ wee tie ya ihe, tirụọ ya ahụ́. 38  Onye amụma ahụ gara guzoro otu ebe n’ụzọ, na-eche ka eze pụta. O jikwa ákwà kechie anya ya ka a ghara ịmata ya. 39  Mgbe eze mechara gafewe n’ụzọ ahụ, onye amụma ahụ gwara ya, sị: “Ohu gị gara ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ. Ma, otu nwoke nke si n’ọgbọ agha ahụ na-apụta duteere m otu nwoke ma sị m, ‘Chewe nwoke a nche. Ya gbapụnahụ gị, ị ga-eji ndụ gị akwụ ụgwọ ya.* Ma ọ bụrụ na ị chọghị iji ndụ gị akwụ ụgwọ ya,+ ị ga-akwụ otu talent* ọlaọcha.’ 40  Ma ka ohu gị nọ na-eme nke a, na-emekwa nke ọzọ, nwoke ahụ gbara ọsọ.” Eze Izrel asị ya: “Ihe ahụ i kwuru ka a ga-eme gị. I kpeela onwe gị ikpe.” 41  O wepụziri ákwà ahụ o ji kechie anya ya ọsọ ọsọ, eze Izrel amata na ọ bụ otu n’ime ndị amụma.+ 42  Ọ gwakwara eze, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na ị hapụrụ igbu nwoke m kwuru ka e gbuo,+ ị ga-eji ndụ gị kwụọ ụgwọ ya,*+ ndị gị ga-anwụkwa, ndị ya adịrị ndụ.’”+ 43  Eze Izrel wee lawa n’ụlọ ya na Sameria.+ Ma obi adịghị ya mma, ihu ya gbarụkwara agbarụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ka chi m mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ ndò.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ ndò.”
Ma ọ bụ “merie ndị Siria ezigbo mmeri.”
Ma ọ bụ “na-egosi ndị mmadụ ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “igbu mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “egbula mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndụ a mụ na gị gbara.”
O yiri ka “ụmụ ndị amụma” a na-ekwu gbasara ha bụ ndị a na-akụziri ihe n’ụlọ akwụkwọ ndị amụma ma ọ bụkwanụ òtù ndị amụma.
Ma ọ bụ “a ga-eji mkpụrụ obi gị dochie mkpụrụ obi ya.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “a ga-eji mkpụrụ obi gị dochie mkpụrụ obi ya.”