Ndị Eze nke Mbụ 22:1-53

  • Jehoshafat na Ehab jikọrọ aka na-eme ihe (1-12)

  • Mịkaya buru amụma na a ga-emeri Ehab n’agha (13-28)

    • Otu mmụọ ozi ga-eme ka ndị amụma ghaara Ehab ụgha, rafuo ya (21, 22)

  • E gburu Ehab na Remọt-gilied (29-40)

  • Otú ihe dị mgbe Jehoshafat na-achị Juda (41-50)

  • Ehazaya malitere ịchị Izrel (51-53)

22  Ndị Siria na ndị Izrel alụsoghị ibe ha agha ruo afọ atọ.  N’afọ nke atọ, Jehoshafat+ eze Juda gara na nke eze Izrel.+  Eze Izrel wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Unu manụ na ọ bụ anyị nwe Remọt-gilied.+ Ma, o nweghị ihe anyị na-eme iji napụta ya eze Siria.”  Ọ jụziri Jehoshafat, sị: “Ị̀ ga-eso m gaa agha na Remọt-gilied?” Jehoshafat asị eze Izrel: “Mụ na gị bụ otu. Ndị m na ndị gị bụ otu. Ịnyịnya m na ịnyịnya gị bụkwa otu.”+  Ma, Jehoshafat sịrị eze Izrel: “Biko, burugodị ụzọ jụta+ ihe Jehova chọrọ ka e mee.”+  Eze Izrel wee kpọkọọ ihe dị ka narị ndị amụma anọ (400), jụọ ha, sị: “Ọ̀ bụ m gaa lụso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ mụ agala?” Ha asị ya: “Gawa, Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.”  Ma Jehoshafat sịrị: “Ọ̀ bụ na e nweghị onye amụma Jehova ebe a? Ka anyị si n’aka ya jụọkwa Chineke ase.”+  Eze Izrel asị Jehoshafat: “A ka nwere otu nwoke anyị ga-esi n’aka ya jụọ Jehova ase.+ Ma akpọrọ m ya asị,+ n’ihi na o nweghị mgbe ọ na-eburu m amụma ihe ọma. Naanị ihe ọ na-eburu m bụ amụma ihe ọjọọ.+ Ọ bụ Mịkaya nwa Imla.” Ma, Jehoshafat sịrị ya: “Eze, ekwula otú ahụ.”  Eze Izrel wee kpọọ otu onye na-eje ozi n’obí ya, sị ya: “Gaa ọsọ ọsọ kpọta Mịkaya nwa Imla.”+ 10  N’oge ahụ, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda yicha uwe ndị eze, nọrọkwa n’ocheeze ha. Ha nọ n’ebe a na-azọcha ọka, nke dị n’ọnụ ụzọ ámá Sameria. Ndị amụma niile ahụ nọkwa n’ihu ha na-ebu amụma.+ 11  Zedekaya nwa Keneana chịkwa mpi ndị o ji ígwè rụọ bịakwute Ehab ma sị ya: “Jehova kwuru, sị, ‘Ị ga-eji mpi ndị a na-egbu ndị Siria ruo mgbe i gbuchara ha.’” 12  Ndị amụma niile ahụ nọkwa na-ebu otu ihe ahụ n’amụma, na-asị: “Gawa Remọt-gilied. Ị ga-emeri. Jehova ga-enyefe ya n’aka eze.” 13  Onye ahụ gara ịkpọ Mịkaya gwara ya, sị: “Ndị amụma niile na-agwa eze ihe dị mma. Biko, gwa ya ihe dị mma, ka ihe ị ga-agwa ya na nke hanwa gwara ya bụrụ otu.”+ 14  Ma Mịkaya sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na ọ bụ ihe Jehova gwara m ka m ga-ekwu.” 15  Ọ bịakwuteziri eze, eze asị ya: “Mịkaya, ọ̀ bụ anyị gaa lụso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ anyị agala?” Mịkaya asị ya ozugbo ahụ: “Gaanụ, unu ga-emeri. Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.” 16  Eze asị ya: “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi n’aha Jehova na ị gaghị agwa m ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị naanị eziokwu?” 17  Ya asịzie ya: “M na-ahụ ka a chụsasịrị ndị Izrel niile n’ugwu,+ dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Jehova asị: ‘O nweghị ndị nwe ndị a. Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’” 18  Eze Izrel asịzie Jehoshafat: “Ọ̀ kwa m gwara gị agwa na ọ gaghị eburu m amụma ihe ọma, kama, naanị amụma ihe ọjọọ?”+ 19  Mịkaya asị: “Nụrụnụ ihe Jehova chọrọ ka m gwa unu: M hụrụ ka Jehova nọ n’ocheeze ya+ nakwa ka ndị mmụọ ozi niile guzo n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.+ 20  Jehova asị, ‘Ònye ga-arafu Ehab, ka o wee gaa nwụọ na Remọt-gilied?’ Ha ebido na-ekwu ihe dị iche iche. Otu onye kwuo otu ihe, onye ọzọ ekwuo ihe ọzọ. 21  Otu mmụọ ozi*+ mechara bịa guzo n’ihu Jehova, sị, ‘M ga-arafu ya.’ Jehova asị ya, ‘Olee otú ị ga-esi arafu ya?’ 22  Ya asị, ‘M ga-aga mee ka ndị amụma ya niile ghaara ya ụgha.’+ Chineke asị ya, ‘Ị ga-arafu ya, ije gị ga-enwekwa isi. Gaa rafuo ya.’ 23  Ugbu a, Jehova emeela ka ndị amụma gị ndị a niile ghaara gị ụgha.+ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ekpebiela na ihe ọjọọ ga-eme gị.”+ 24  Zedekaya nwa Keneana wee bịaruo Mịkaya nso ma maa ya ụra, sị ya: “Olee nnọọ otú mmụọ Jehova si hapụ m gaa gwawa gị okwu?”+ 25  Mịkaya asị ya: “Ụbọchị ị ga-ama otú o si hapụ gị bụ ụbọchị ị ga-agbaba n’ime ime ụlọ gị zoo.” 26  Eze Izrel asị: “Kpọrọnụ Mịkaya kpọgara Emọn bụ́ onyeisi obodo nakwa Joash nwa eze. 27  Gwakwanụ ha, sị, ‘Eze kwuru, sị: “Tụbanụ onye a n’ụlọ mkpọrọ,+ na-enyekwanụ ya obere nri na obere mmiri ruo mgbe m lọtara n’udo.”’” 28  Ma Mịkaya sịrị: “Ị lọta n’udo, mara na Jehova agwaghị m okwu.”+ O kwukwara, sị: “Unu niile, burunụ ihe a m kwuru n’obi.” 29  Eze Izrel na Jehoshafat eze Juda wee gawa Remọt-gilied.+ 30  Eze Izrel wee sị Jehoshafat: “M ga-ejigharị ejiji banye n’ọgbọ agha, ma gịnwa ga-eyiri uwe eze nke gị.” Eze Izrel wee jigharịa ejiji+ banye n’ọgbọ agha. 31  Ma, eze Siria gwara ndị isi iri atọ na abụọ na-agba ụgbọ ịnyịnya ya,+ sị: “Unu alụsola onye ọ bụla ọgụ, ma onye ukwu ma onye nta, ma e wezụga eze Izrel.” 32  Ozugbo ndị isi ahụ na-agba ụgbọ ịnyịnya hụrụ Jehoshafat, ha kwuru n’obi ha, sị: “Ọ ga-abụrịrị ya bụ eze Izrel.” Ha wee tụgharịa ka ha lụso Jehoshafat agha, ya amalite iti mkpu ka e nyere ya aka. 33  Ozugbo ndị isi ahụ na-agba ụgbọ ịnyịnya hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụ ya. 34  Ma, e nwere otu nwoke gbara ụta n’ebughị onye ọ bụla n’obi, ma ọ gbatara ya eze Izrel n’ebe e jikọrọ uwe agha ya. Eze asị onye na-anya ụgbọ ịnyịnya ya: “Tụgharịa, bupụ m n’ọgbọ agha a, n’ihi na e merụọla m ezigbo ahụ́.”+ 35  Agha ahụ bịara sie ezigbo ike n’ụbọchị ahụ, nke na a kwụwara eze ọtọ n’ụgbọ ịnyịnya ahụ chee ya ihu n’ebe ndị Siria nọ. Ọbara nke si n’ebe e merụrụ ya ahụ́ na-agbapụta nọ na-awụsa n’ime ụgbọ ịnyịnya agha ahụ. Ma, ọ nwụrụ ná mgbede ụbọchị ahụ.+ 36  Ná mgbede ahụ, a malitere iti mkpu ebe niile ndị agha Izrel mara ụlọikwuu, sị: “Onye ọ bụla laa n’obodo ya! Onye ọ bụla laakwa n’ala ya!”+ 37  Otú ahụ ka eze si nwụọ. E butere ya na Sameria, liekwa ya ebe ahụ. 38  Mgbe ha sachara ụgbọ ịnyịnya agha ahụ n’akụkụ ọdọ mmiri Sameria, nkịta rachara ọbara Ehab otú Jehova kwuru.+ Ndị akwụna na-asakwa ahụ́ ebe ahụ.* 39  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ehab, ihe niile o mere na ụlọ* o ji ọdụ́ rụọ+ nakwa obodo niile ọ rụsiri ike, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 40  Ehab nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ.+ Ehazaya nwa ya+ anọchie ya, malite ịchị. 41  Jehoshafat+ nwa Esa malitere ịchị Juda n’afọ nke anọ n’ọchịchị Ehab eze Izrel. 42  Jehoshafat dị afọ iri atọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri abụọ na ise na Jeruselem. Aha nne ya bụ Azuba nwa Shilhaị. 43  Jehoshafat nọkwa na-akpa àgwà ka Esa+ nna ya. Ọ hapụghị ịna-eme ka ya. O mekwara ihe ziri ezi n’anya Jehova.+ Ma, o bibighị ebe ndị dị elu. Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu.+ 44  Jehoshafat mere ka ya na eze Izrel dịrị n’ezigbo mma.+ 45  Ma e dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jehoshafat, ike ọ kpara na otú o si lụọ agha, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 46  O bibikwara ụmụ nwoke niile bụ́ ndị akwụna*+ fọrọ n’obodo ahụ, ndị Esa nna ya na-egbughị n’oge ọ na-achị.+ 47  N’oge ahụ, e nweghị eze n’Ịdọm,+ ọ bụ onye na-anọchite anya eze nọ na-achị.+ 48  Jehoshafat rụrụ ụgbọ mmiri ndị ga na-aga Tashish* ka e jiri ha gaa Ofa bute ọlaedo.+ Ma, ụgbọ mmiri ndị ahụ erughị n’ihi na ha kpuru n’Iziọn-giba.+ 49  Ọ bụ mgbe ahụ ka Ehazaya nwa Ehab gwara Jehoshafat, sị: “Ka ndị na-ejere m ozi soro ndị na-ejere gị ozi jiri ụgbọ mmiri gaa.” Ma Jehoshafat ekweghị. 50  Jehoshafat mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ,+ e lie ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid bụ́ nna nna ya. Jehoram nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị. 51  Ehazaya+ nwa Ehab malitere ịchị Izrel n’afọ nke iri na asaa n’ọchịchị Jehoshafat eze Juda. Ọ chịkwara Izrel afọ abụọ. 52  Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova, na-akpakwa àgwà ka nne ya+ na nna ya+ nakwa ka Jeroboam nwa Nibat, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 53  Ọ nọ na-efe Bel,+ na-akpọrọ ya isiala, na-akpasukwa Jehova bụ́ Chineke Izrel+ iwe otú nna ya mere.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Otu mmụọ.”
O nwere ike ịbụ, “ọ bụkwa n’ebe ndị akwụna na-asa ahụ́ ka nkịta rachara ọbara Ehab.”
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.