Ndị Eze nke Mbụ 3:1-28

  • Solomọn lụrụ nwa Fero (1-3)

  • Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ (4-15)

    • Solomọn rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe (7-9)

  • Solomọn kpeere ụmụ nwaanyị abụọ na-azọ nwa ikpe (16-28)

3  Solomọn na Fero eze Ijipt gọrọ ọgọ. Ọ gara lụrụ nwa Fero,+ kpọlatakwa ya n’Obodo Devid+ ka ọ nọrọ ebe ahụ ruo mgbe ọ ga-arụcha ụlọ nke ya,+ na ụlọ Jehova,+ nakwa mgbidi ga-agba Jeruselem gburugburu.+  Ma ndị Izrel ka nọ na-achụ àjà n’ebe ndị dị elu,+ n’ihi na a rụbeghị ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova.+  Solomọn nọ na-eme ihe otú Devid nna ya gwara ya ka ọ na-eme, si otú ahụ gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya. Ma, ọ bụ n’ebe ndị dị elu ka ọ na-achụ àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ.+  Otu ụbọchị, eze gara ịchụ àjà na Gibiọn, n’ihi na ebe ahụ bụ ebe dị elu ndị mmadụ kacha mara.*+ O jikwa otu puku (1,000) anụ chụọ àjà a na-esu ọkụ n’elu ebe ịchụàjà dị ebe ahụ.+  Na Gibiọn, Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ, sịkwa ya: “Rịọ m ihe ị chọrọ ka m nye gị.”+  Solomọn asị: “I gosiri ohu gị Devid nna m na ị hụrụ ya nnọọ n’anya* maka otú o si rubere gị isi, kpaa àgwà dị mma, ma jiri obi ọcha ya jeere gị ozi. Ruokwa taa, ị kwụsịbeghị igosi na ị hụrụ ya nnọọ n’anya, n’ihi na i nyere ya nwa nwoke ka ọ nọchie n’ocheeze ya.+  Jehova bụ́ Chineke m, i meela mụnwa bụ́ ohu gị eze, ka m nọchie Devid nna m, n’agbanyeghị na m ka bụ nwata, o nweghịkwa ihe m ma.*+  Ohu gị so ná ndị gị ị họọrọ,+ ndị a na-enweghị ike ịgụta ọnụ maka na ha karịrị akarị.  Biko, nyere ohu gị aka ka o jiri obi ya niile na-erubere gị isi, ka o nwee ike ịna-ekpe ndị gị ikpe,+ na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ,+ n’ihi na ònye ga-ekpeli ndị gị a dị ọtụtụ* ikpe ma ọ bụrụ na i nyereghị ya aka?” 10  Ihe a Solomọn rịọrọ dịkwa Jehova mma.+ 11  Chineke wee sị ya: “Ebe ọ bụ na ị rịọrọ ihe a, ị rịọghị ka ị dị ogologo ndụ ma ọ bụ ka i nwee akụnụba ma ọ bụ ka ndị iro gị nwụọ, kama ị rịọrọ ka m nyere gị aka ịma otú ị ga-esi na-ekpe ikpe ziri ezi,+ 12  m ga-emere gị ihe ị rịọrọ m.+ M ga-eme ka ị mara ihe, na-aghọtakwa ihe+ karịa onye ọ bụla dịrịla ndụ tupu gịnwa. Ọ dịghịkwa onye ga-ama ihe otú ị ma.+ 13  M ga-enyekwa gị ihe ndị ị na-arịọghị,+ ma akụnụba ma ebube,+ nke na a gaghị enwe eze ọ bụla ga-adị ka gị ná ndụ gị niile.+ 14  Ọ bụrụkwa na i soro ntụziaka m, na-edebekwa iwu m, otú Devid nna gị mere,+ m ga-eme ka ị dị ogologo ndụ.”+ 15  Mgbe Solomọn tetara, ọ matara na Chineke nọ na-agwa ya okwu ná nrọ. Ọ gaziri Jeruselem, guzoro n’ihu igbe ọgbụgba ndụ Jehova, chụọ àjà a na-esu ọkụ na àjà udo,+ meekwara ndị niile na-ejere ya ozi oriri. 16  Mgbe e mechara, ụmụ nwaanyị abụọ, bụ́ ndị akwụna, bịakwutere eze ma guzoro n’ihu ya. 17  Nwaanyị nke mbụ sịrị: “Biko, onyenwe m, mụ na nwaanyị a bi n’otu ụlọ. Ọ nọkwa n’ụlọ mgbe m mụrụ nwa. 18  Mgbe o mere abalị atọ m mụrụ nwa, nwaanyị a mụrụ nwa nke ya. Anyị bi otu ebe. Naanị anyị abụọ bi. Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ anyị na ya nọ n’ụlọ. 19  Ma, nwa nwaanyị a nwụrụ n’abalị, n’ihi na o dinagidere ya. 20  O biliziri n’etiti abalị, kuru nwa m n’akụkụ m mgbe ohu gị nwaanyị nọ n’ụra ma nyiwe ya n’akụkụ* ya, nyiwezie nwa ya nwụrụ anwụ n’akụkụ m. 21  Mgbe m tetara n’ụtụtụ ka m nye nwa m ara, m hụrụ na ọ nwụọla. N’ihi ya, m leruru ya anya nke ọma, ma chọpụta na ọ bụghị nwa m mụrụ.” 22  Ma nwaanyị nke ọzọ sịrị: “Ọ bụghị eziokwu. Nke dị ndụ bụ nwa m. Nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwaanyị nke mbụ ahụ nọkwa na-asị: “Mba, nke dị ndụ bụ nwa m. Nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Ihe a ka ha nọ n’ihu eze na-arụ ụka ya. 23  N’ikpeazụ, eze sịrị: “Onye nke a na-asị, ‘Nke dị ndụ bụ nwa m. Nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.’ Onye nke ọzọ na-asịkwa, ‘Mba, nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị, nke dị ndụ bụ nwa m.’” 24  Eze kwukwara, sị: “Wetaranụ m mma agha.” E wee wetara eze mma agha. 25  Eze asị: “Kpọwaanụ nwa ahụ dị ndụ ụzọ abụọ. Werenụ otu akụkụ nye otu nwaanyị, werekwanụ akụkụ nke ọzọ nye nwaanyị nke ọzọ.” 26  Ozugbo ahụ, nwaanyị nwa ya bụ nke dị ndụ rịọrọ eze ka o gee ya ntị, n’ihi na obi nwa mewere ya. Ọ sịrị: “Biko, onyenwe m, kunyenụ ya nwa ahụ dị ndụ. Unu egbula ya.” Ma nwaanyị nke ọzọ ahụ nọ na-asị: “Ọ gaghị abụ nke gị, ọ gaghịkwa abụ nke m. Kpọwaanụ ya ụzọ abụọ!” 27  Eze wee sị: “Kunyenụ nwaanyị nke mbụ nwa ahụ dị ndụ. Unu egbula ya. Ọ bụ ya bụ nne ya.” 28  Mgbe ndị Izrel niile nụrụ ikpe ahụ eze kpere, ha kwanyeweere ya ùgwù,*+ n’ihi na ha hụrụ na Chineke nyere ya amamihe o ji na-ekpe ikpe ziri ezi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “nnukwu ebe dị elu.”
Ma ọ bụ “I gosiri ohu gị Devid nna m ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “amaghịkwa m otú e si apụ apụ na otú e si abata abata.”
Na Hibru, “dị arọ.”
Na Hibru, “n’obi.”
Na Hibru, “ha tụwara ya egwu.”