Ndị Eze nke Mbụ 4:1-34

  • Ndị na-enyere Solomọn aka n’ọchịchị (1-19)

  • Ihe na-agaziri ndị mmadụ mgbe Solomọn na-achị (20-28)

    • Obi ruru onye ọ bụla ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya (25)

  • Amamihe Solomọn na ilu ndị ọ tụrụ (29-34)

4  Eze Solomọn nọ na-achị ndị Izrel niile.+  Ndị a bụ ndị nọ n’isi n’ọchịchị ya: Azaraya nwa Zedọk+ bụ onye nchụàjà.  Elihoref na Ahaịja, ụmụ Shaịsha, bụ ndị odeakwụkwọ.+ Jehoshafat+ nwa Ahaịlọd bụ onye na-edekọ ihe.  Benaya+ nwa Jehoyada bụ onyeisi ndị agha. Zedọk na Abayata+ bụ ndị nchụàjà.  Azaraya nwa Netan+ bụ onyeisi ndị na-enyere eze aka. Zebọd nwa Netan bụ onye nchụàjà, bụrụkwa enyi eze.+  Ahaịsha bụ onye na-elekọta obí eze. Adọnaịram+ nwa Abda bụkwa onyeisi ndị eze manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ.+  Solomọn nwere mmadụ iri na abụọ na-enyere ya aka n’Izrel niile, ndị na-ewetara ya na ezinụlọ ya nri. Onye nke ọ bụla n’ime ha na-eweta nri nke ya otu ọnwa zuru ezu n’afọ.+  Otu n’ime ha bụ nwa Họọ, onye na-elekọta ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu.  Onye ọzọ bụ nwa Dika, onye na-elekọta Mekaz, Shealbim,+ Bet-shimesh, na Ịlọn-bet-henan. 10  Onye ọzọkwa bụ nwa Hised, onye na-elekọta Arọbọt (ọ bụkwa ya na-elekọta Soko na ala Hifa niile). 11  Onye ọzọ bụ nwa Abinadab, onye na-elekọta ugwu niile dị na Dọọ (ọ lụrụ Tefat nwa Solomọn). 12  Onye ọzọ bụ Beana nwa Ahaịlọd, onye na-elekọta Teanak, Megido,+ na Bet-shian,+ nke dị nso na Zaretan na ndịda ndịda Jezril, malite na Bet-shian ruo Ebel-mehola, ruokwa na Jọkmiam.+ 13  Onye ọzọkwa bụ nwa Giba, onye na-elekọta Remọt-gilied+ (ọ bụkwa ya na-elekọta obere obodo ndị dị na Gilied,+ ndị Jeya+ nwa Manase nwe. Ọ bụkwa ya na-elekọta Agọb,+ nke dị na Beshan.+ Ha dị nnukwu obodo iri isii. Ha niile nwechara mgbidi, nweekwa ọnụ ụzọ ámá ndị e ji ihe e ji ọla kọpa rụọ atụchi). 14  Onye ọzọ bụ Ahinadab nwa Ido, onye na-elekọta Mahaneyim.+ 15  Onye ọzọkwa bụ Ahimaz, onye na-elekọta Naftalaị (ọ lụrụ Basemat nwa Solomọn). 16  Onye ọzọ bụ Beana nwa Hushaị, onye na-elekọta Asha na Bielọt. 17  Onye ọzọkwa bụ Jehoshafat nwa Parua, onye na-elekọta Ịsaka. 18  Onye ọzọ bụ Shimiaị+ nwa Ila, onye na-elekọta Benjamin.+ 19  Onye ọzọ bụ Giba nwa Yuraị, onye na-elekọta ala Gilied,+ ya bụ, ala Saịhọn+ eze ndị Amọraịt na Ọg+ eze Beshan nọbu na-achị. E nwekwara onye na-enyere eze aka bụ́ onyeisi ndị ọzọ a niile na-enyere eze aka. 20  Ndị Juda na ndị Izrel dị ọtụtụ ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ Ha nọkwa na-eri, na-aṅụ, na-enwekwa aṅụrị.+ 21  Solomọn nọkwa na-achị obodo niile dị malite n’Osimiri Yufretis+ ruo n’ala ndị Filistia, ruokwa n’ókè Ijipt. Ha nọ na-atụrụ ya ụtụ, na-ejekwara ya ozi oge niile ọ dị ndụ.+ 22  Nri a na-eri n’ezinụlọ Solomọn kwa ụbọchị bụ ntụ ọka e gwere nke ọma dị kọọ* iri atọ, ntụ ọka nkịtị dị kọọ iri isii, 23  ehi iri gbara agba, ehi iri abụọ ndị e si ebe ha na-ata ahịhịa kpụta, otu narị (100) atụrụ, ele, mgbada, mmoro, na obu ndị gbara agba. 24  Ọ bụ Solomọn na-achị ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,+ malite na Tifsa ruo Gaza.+ Ọ na-achịkwa ndị eze niile nọ n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. Udo dị n’obodo ya niile, ya na obodo ndị ha na ha gbara agbata obi dịkwa ná mma.+ 25  N’oge niile Solomọn na-achị, obi ruru ndị Juda na ndị Izrel ala. Onye ọ bụla n’ime ha bikwa n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, malite na Dan ruo Bia-shiba. 26  Solomọn nwekwara puku ụlọ ịnyịnya anọ* (4,000) maka ụgbọ ịnyịnya ya, nweekwa puku ịnyịnya* iri na abụọ (12,000).+ 27  Ndị na-enyere Eze Solomọn aka na-ebutere ya na onye ọ bụla na-eri nri na tebụl ya ihe oriri. Onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ọnwa o ketara ibute nri. N’ọnwa ahụ, ọ ga-ahụ na nri akọghị ụkọ.+ 28  Ha na-ewegakwa ọka bali na okporo ọka ebe ọ bụla a chọrọ ha ka ịnyịnya dị iche iche taa, ma ịnyịnya ndị nke na-adọkpụ ụgbọ ịnyịnya. Onye nke ọ bụla na-eweta ihe o kwesịrị iweta. 29  Chineke nyere Solomọn amamihe pụrụ iche. O mekwara ka ọ na-aghọta ihe otú na-enweghị atụ, nyekwa ya obi na-aghọta ọtụtụ ihe.+ 30  Solomọn ma ihe karịa ndị Ọwụwa Anyanwụ niile nakwa ndị Ijipt niile.+ 31  Ọ makwa ihe karịa mmadụ ọ bụla ọzọ, ma Itan+ onye Zira ma Himan+ ma Kalkọl+ ma Dada bụ́ ụmụ Mehọl. Aha Solomọn nọkwa na-ede ude ná mba niile gbara ha gburugburu.+ 32  Ọ tụkwara puku ilu atọ (3,000),+ abụ ya+ dịkwa otu puku na ise (1,005). 33  Ọ na-ekwu okwu gbasara ụdị osisi dị iche iche, ma osisi sida dị na Lebanọn ma osisi hisop+ na-epu n’ahụ́ ụlọ. Ọ na-ekwukwa gbasara ụdị anụ dị iche iche,+ ma nnụnụ+ ma ihe ndị na-arị arị*+ ma azụ̀. 34  Ndị si ebe dị iche iche nọkwa na-abịa ka ha nụ okwu onye amamihe Solomọn na-ekwu. Ndị eze niile nọ n’ụwa, ndị nụrụ gbasara amamihe ya, sokwa bịa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kọọ bụ lita 220. Gụọ B14.
Puku anọ a ka e dere n’Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị e ji aka dee n’oge ochie nakwa n’ebe ọzọ akụkọ a gbara na Baịbụl. Ma, e nwere ndị nke ihe e dere na ha bụ puku iri anọ.
Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “ihe ndị na-akpụ akpụ.”