Ndị Eze nke Mbụ 5:1-18

  • Eze Haịram buteere Solomọn ihe ndị ọ ga-eji arụ ụlọ (1-12)

  • Ndị Solomọn kpọọrọ ka ha na-arụrụ ya ọrụ (13-18)

5  Mgbe Haịram eze Taya+ nụrụ na e teela Solomọn mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-anọchi nna ya, o ziri ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa hụ Solomọn maka na Haịram na Devid bụ enyi* kemgbe ụwa.+  Solomọn zikwara Haịram ozi,+ sị:  “Ị manụ nke ọma na e kweghị ka Devid nna m rụọ ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova bụ́ Chineke ya n’ihi ọtụtụ agha ọ nọ na-alụso ndị iro ya. Ma, Jehova mere ka o merie ha niile.+  Jehova bụ́ Chineke m emeekwala ugbu a ka m zuoro ndị iro m ike gbaa gburugburu.+ O nweghị onye na-abịa ịlụso m agha. O nweghịkwa ihe anyị na-atụ ụjọ ya.+  Ọ bụ ya mere m ji na-achọ ịrụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova bụ́ Chineke m, otú Jehova kwere Devid nna m ná nkwa, sị: ‘Ọ bụ nwa gị nke m ga-eme ka ọ nọchie n’ocheeze gị ga-arụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m.’+  Ugbu a, gwa ndị gị ka ha gbutere m osisi sida na Lebanọn.+ Ndị na-ejere m ozi ga-eso ndị na-ejere gị ozi rụọ ọrụ. M ga-akwụkwa gị ihe ị chọrọ ka m kwụọ gị maka ọrụ ndị na-ejere gị ozi ga-arụrụ m. Ị manụ na o nweghị onye n’ime anyị hụrụ azụ ndị Saịdọn anya n’igbu osisi.”+  Mgbe Haịram nụrụ ihe Solomọn kwuru, obi bụ ya sọ aṅụrị, ya asị: “Ka e too Jehova taa, n’ihi na o nyere Devid nwa ma ihe ka ọ chịwa ndị a dị ọtụtụ!”+  Haịram gwakwara Solomọn, sị: “Anụla m ozi i ziri m. M ga-eme ihe niile ị chọrọ gbasara osisi sida na osisi junipa.+  Ndị na-ejere m ozi ga-esi na Lebanọn buga ha n’oké osimiri. M ga-ahụkwa na e kere ha n’ùkwù n’ùkwù si n’oké osimiri buga ha ebe ị chọrọ ka m buga ha. M ga-atọsakwa ha ebe ahụ, gị eburuzie ha. Ụgwọ ị ga-akwụ m bụ inye ezinụlọ m ihe m ga-agwa gị ha ga-eri.”+ 10  Haịram bunyere Solomọn osisi sida na osisi junipa niile ọ chọrọ. 11  Solomọn nọkwa na-ebunye Haịram nri ya na ezinụlọ ya na-eri. Ọ na-ebunye ya ọka wit dị puku kọọ* iri abụọ (20,000) nakwa ọmarịcha mmanụ oliv dị kọọ iri abụọ. Ihe a ka Solomọn na-ebunye Haịram kwa afọ.+ 12  Jehova nyere Solomọn amamihe otú o kwere ya ná nkwa.+ Solomọn na Haịram dị n’ezigbo mma. Ha gbakwara ndụ. 13  Eze Solomọn sikwa n’ala Izrel niile kpọta ụmụ nwoke ndị ọ manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ. Ha dị puku iri atọ (30,000).+ 14  Ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri puku mmadụ iri na Lebanọn, ha na-agbanwekwa ibe ha kwa ọnwa. Ha na-anọ otu ọnwa na Lebanọn, nọọkwa ọnwa abụọ n’ụlọ ha. Adọnaịram+ bụ onyeisi ndị eze manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ. 15  Solomọn nwekwara puku mmadụ iri asaa (70,000) ndị na-arụ ọrụ ndị nkịtị na-arụ* nakwa puku mmadụ iri asatọ (80,000) ndị na-awa nkume+ n’ugwu.+ 16  O nwekwara ndị isi na-enyere ya aka,+ ndị na-elekọta ọrụ ya. Ha na-ahụ maka ndị na-arụ ọrụ. Ha dị puku atọ na narị atọ (3,300). 17  Eze gwara ha, ha ana-awapụta nnukwute nkume+ ndị dị oké ọnụ,+ waakwa ha otú a ga-esi jiri ha tọọ ntọala+ ụlọ ahụ. 18  Ndị na-arụrụ Solomọn ụlọ na ndị na-arụrụ Haịram ụlọ nakwa ndị Gibal+ wara nkume ndị ahụ. Ọ bụkwa ha kwadebere osisi na nkume ndị a ga-eji rụọ ụlọ ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Haịram hụrụ Devid n’anya.”
Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kọọ bụ lita 220. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ndị na-ebu ibu dị arọ.”