Ndị Eze nke Mbụ 6:1-38

  • Solomọn rụrụ ụlọ nsọ (1-38)

    • Ọnụ ụlọ dị n’ime ime (19-22)

    • Cherob abụọ (23-28)

    • Ihe ndị a tụrụ atụ, ibo ụzọ abụọ, na ogige dị n’ime (29-36)

    • E ji ihe dị ka afọ asaa rụchaa ụlọ nsọ (37, 38)

6  Solomọn malitere ịrụ ụlọ Jehova*+ n’afọ nke narị anọ na iri asatọ (480) ndị Izrel si n’Ijipt pụta,+ ya bụ, n’afọ nke anọ n’ọchịchị Solomọn n’Izrel, n’ọnwa Ziv,*+ (ya bụ, n’ọnwa nke abụọ).  Ụlọ a Eze Solomọn rụụrụ Jehova dị kubit* iri isii n’ogologo, kubit iri abụọ n’obosara, na kubit iri atọ n’ogo.+  Ihe a rụnyere n’ụzọ+ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị kubit iri abụọ n’obosara. Ya na ụlọ ahụ hà n’obosara. Uhiè ya dị kubit iri n’ihu ụlọ ahụ.  Windo ndị ọ rụnyere n’ụlọ ahụ dị warara ná mpụta karịa otú ha dị n’ime.+  Ọ rụnyekwuru ọnụ ụlọ n’akụkụ ahụ́ ụlọ ahụ. O ji ya gbaa ahụ́ ụlọ nsọ* ahụ nakwa ọnụ ụlọ dị n’ime ime+ gburugburu. Ọ rụkwara ọnụ ụlọ n’akụkụ ụlọ nsọ ahụ gbaa gburugburu.+  Ọnụ ụlọ ndị dị n’ala ala dị kubit ise n’obosara, ndị dị n’etiti dị kubit isii n’obosara, ndị nke dị n’elu elu adịrị kubit asaa n’obosara. Ọ rụrụ ụlọ ahụ otú ogidi ndị ji ya gbaa gburugburu na-agaghị emetụ ahụ́ ụlọ ahụ, nke mere na a kpọpughị ahụ́ ụlọ ahụ akpọpu.+  Ọ bụ nkume ndị a wapụtara ebe a na-awa nkume ka e ji rụọ ụlọ ahụ.+ N’ihi ya, n’oge niile a na-arụ ya, a nụghị ụda hama ma ọ bụ anyụike ma ọ bụ ngwá ọrụ ọ bụla e ji ígwè rụọ.  Ebe e si abanye n’ọnụ ụlọ ndị dị n’ala ala ụlọ ahụ dị n’akụkụ ụlọ nsọ dị n’ebe ndịda* ụlọ ahụ.+ Ma, a na-esi na steepụ arịgo n’ọnụ ụlọ ndị dị n’etiti, sizie na nke etiti rịgoro ná ndị nke dị n’elu elu.  Ọ rụgidere ụlọ ahụ rụchaa ya.+ O ji ibé osisi sida na ndị nke dị mbadamba kụchie elu ụlọ ahụ.+ 10  Ọ rụkwara ọnụ ụlọ dị iche iche n’akụkụ ụlọ ahụ gbaa gburugburu.+ Ogo ọnụ ụlọ nke ọ bụla dị kubit ise, e jikwa osisi sida jikọta ha na ụlọ ahụ. 11  N’oge ahụ, Jehova gwara Solomọn, sị: 12  “Ọ bụrụ na i soro ntụziaka m, na-eme ihe ndị m kpebiri, na-edebekwa iwu m,+ m ga-emere gị ihe m kwere Devid nna gị ná nkwa gbasara ụlọ a ị na-arụ.+ 13  Mụ na ndị Izrel ga-ebi,+ agaghịkwa m ahapụ ndị Izrel bụ́ ndị m.”+ 14  Solomọn nọ na-arụ ụlọ ahụ ka ọ rụchaa ya. 15  O ji osisi sida dị mbadamba rụọ ime ahụ́ ụlọ ahụ. O jikwa osisi machie ime ya, malite n’ala ya ruo n’uko ya e ji ogologo osisi rụọ. O ji osisi junipa dị mbadamba machie ala ụlọ ahụ.+ 16  O jikwa osisi sida dị mbadamba rụọ ebe azụ azụ ụlọ ahụ. Ebe ahụ dị kubit iri abụọ. O ji osisi sida rụọ ya, malite n’ala ya ruo n’uko ya. Ọ rụkwara ọnụ ụlọ dị n’ime ime,+ bụ́ Ebe Kacha Nsọ.+ 17  N’ebe ihu ihu ụlọ nsọ ahụ+ ka a rụrụ Ebe Nsọ. Ọ dị kubit iri anọ n’ogologo. 18  E nwere ihe ndị a tụrụ n’ahụ́ osisi sida ndị e ji rụọ ụlọ ahụ dị n’ime. Ha bụ ihe ndị yiri afụfa ọhịa+ nakwa okooko osisi.+ E ji osisi sida machie ahụ́ ụlọ ahụ niile, nke na a naghị ahụ nkume ndị e ji rụọ ya anya. 19  Solomọn kwadebekwara ọnụ ụlọ dị n’ime ime+ ụlọ ahụ, ka a dọsa igbe ọgbụgba ndụ Jehova ebe ahụ.+ 20  Ogologo ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime ime dị kubit iri abụọ, obosara ya dị kubit iri abụọ, ogo ya adịrị kubit iri abụọ.+ O ji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, jirikwa osisi sida machie ebe ịchụàjà.+ 21  Solomọn jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ụlọ ahụ n’ime,+ jiri ọlaedo machie ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime ime,+ werekwa ụdọ ígwè ọlaedo gebichie ihu ya. 22  O ji ọlaedo machie ụlọ ahụ niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụàjà ahụ niile+ dị n’akụkụ ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime ime. 23  O jikwa osisi paịn* rụọ cherob abụọ+ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime ime. Ogo nke ọ bụla n’ime ha dị kubit iri.+ 24  Otu nku cherob nke mbụ dị kubit ise, nku ya nke ọzọ dịkwa kubit ise. Isi n’ọnụ ọnụ otu nku ya ruo n’ọnụ ọnụ nku ya nke ọzọ dị kubit iri. 25  Nku cherob nke abụọ dịkwa kubit iri. Cherob abụọ ahụ hà, yiekwa ibe ha. 26  Ogo cherob nke mbụ dị kubit iri, ogo nke abụọ adịrịkwa kubit iri. 27  O busara cherob ndị ahụ+ n’ụlọ dị n’ime.* Nku cherob ndị ahụ gbasara agbasa nke na nku nke otu cherob na-emetụ n’otu akụkụ ahụ́ ụlọ ahụ, nku cherob nke ọzọ ana-emetụkwa n’akụkụ nke ọzọ n’ahụ́ ụlọ ahụ. Nku ha nke ọzọ na-emetụkwa ibe ha n’ebe etiti ụlọ ahụ. 28  O jikwa ọlaedo machie cherob ndị ahụ. 29  Ọ tụkwara ọtụtụ cherob,+ nkwụ,+ na okooko osisi+ n’ahụ́ ụlọ ahụ niile, ma n’ọnụ ụlọ nke dị n’ime ma nke dị ná mpụta.* 30  O ji ọlaedo machie ala ọnụ ụlọ abụọ ahụ dị n’ụlọ ahụ. 31  O jikwa osisi paịn rụọ ibo ụzọ ọnụ ụlọ dị n’ime ime. Ọ rụkwara idé ndị dị n’akụkụ nakwa awara ụzọ, bụ́ ihe nke ise.* 32  O ji osisi paịn rụọ ibo abụọ ahụ, jiri ọlaedo machie ha, tụọkwa cherob, nkwụ, na okooko osisi n’elu ha. O jikwa ọlaedo ahụ machie cherob na nkwụ ndị ahụ. 33  O jikwa osisi paịn rụọ awara ụzọ nke anọ* e si abanye n’ụlọ nsọ.* 34  O ji osisi junipa rụọ ibo ụzọ abụọ. A na-esi ma n’ihu ma n’azụ emeghe ibo abụọ dị n’ọnụ ụzọ abụọ ahụ.+ 35  Ọ tụgasịrị cherob, nkwụ, na okooko osisi n’ibo ụzọ ndị ahụ, jirikwa ọlaedo machie ha. 36  O ji nkume a wapụtara awapụta dị ahịrị atọ na otu ahịrị ibé osisi sida+ rụọ ahụ́ ụlọ ogige dị n’ime.+ 37  N’afọ nke anọ n’ọchịchị Solomọn, n’ọnwa Ziv* afọ ahụ, a tọrọ ntọala ụlọ Jehova.+ 38  N’afọ nke iri na otu n’ọchịchị ya, n’ọnwa Bul* afọ ahụ, (ya bụ, n’ọnwa nke asatọ), a rụchara ihe niile a na-arụ n’ụlọ ahụ, rụọkwa ha otú e kwuru na ọ ga-adị.+ Ọ pụtara na Solomọn ji afọ asaa rụchaa ụlọ ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B15.
Gụọ B8.
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Ya bụ, Ebe Nsọ.
Na Hibru, “n’aka nri.”
Na Hibru, “osisi mmanụ.” O nwere ike ịbụ nke a na-akpọ paịn Alepo.
Ya bụ, n’Ebe Kacha Nsọ.
Na Hibru, “ma n’ime ma n’èzí.”
O nwere ike ịbụ na frem ọ rụrụ bụ ihe nke ise ọ rụrụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a na-ekwu otú ibo ụzọ ahụ hà.
O nwere ike ịbụ na frem ọ rụrụ bụ ihe nke anọ ọ rụrụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a na-ekwu otú ibo ụzọ ahụ hà.
Ya bụ, Ebe Nsọ.
Gụọ B15.
Gụọ B15.