Ndị Eze nke Mbụ 7:1-51

  • Obí Solomọn (1-12)

  • Haịram ji ezigbo nkà o nwere nyere Solomọn aka (13-47)

    • Ogidi ọla kọpa abụọ (15-22)

    • Nnukwu efere a na-akpọ Oké Osimiri (23-26)

    • Ihe iri e ji ebu ihe na efere iri e ji ọla kọpa rụọ (27-39)

  • A rụchara ihe niile e ji ọlaedo na-arụ (48-51)

7  Solomọn rụrụ obí ya.+ O ji afọ iri na atọ rụchaa ihe niile gbasara ya.+  Ọ rụkwara ụlọ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ Ogologo ụlọ a dị otu narị (100) kubit.* Obosara ya dị kubit iri ise, ogo ya adịrị kubit iri atọ. A rụkwasịrị ya n’elu ogidi osisi sida+ ndị dị ahịrị anọ. E nwekwara osisi sida n’elu ogidi ndị ahụ.  Ụlọ ahụ dị n’elu ogologo osisi ndị dị n’elu ogidi dị iche iche, e jikwa osisi sida kụchie elu ya. Ha* dị iri anọ na ise. Iri na ise dịkwa n’otu ahịrị.  A rụnyere windo nke ọ bụla dị na ya na frem, ha dịkwa ahịrị atọ. Windo nke ọ bụla chere windo ọzọ ihu, ha dịkwa otú ahụ okpukpu atọ.  Ọnụ ụzọ ya niile na frem ya niile nwere akụkụ anọ. Otú ahụkwa ka ọ dị windo ndị ahụ chere ibe ha ihu ma dị okpukpu atọ.  Ọ rụkwara Ụlọ Ogidi* ogologo ya dị kubit iri ise, obosara ya adịrị kubit iri atọ. O jikwa ogidi rụọ ebe a ga-esi na-abata n’ihu ya, jirikwa ihe kụchie elu ya.  Ọ rụkwara Ụlọ Ocheeze,+ nke a na-akpọkwa Ụlọikpe,+ ebe ọ ga-anọ na-ekpe ikpe. Ha jikwa osisi sida kụchie ya si n’ala ya ruo n’uko ya.  Ma, ụlọ* ọ ga-ebi, nke dị n’ogige nke ọzọ,+ dị n’azụ Ụlọ Ocheeze. A rụkwara ya otú e si rụọ Ụlọ Ocheeze. Solomọn rụkwaara nwa Fero ọ lụrụ ụlọ.+ Ụlọ a na Ụlọ Ocheeze yikwara.  E ji nkume ndị dị oké ọnụ+ rụọ ụlọ ndị a niile, si na ntọala ruo n’elu. E jikwa ha rụọ èzí ya ruo ná nnukwu ogige.+ A wara nkume ndị ahụ otú a chọrọ ka e si waa ha. E ji mma e ji awa nkume waa ha, ha ana-akwọ mụrụmụrụ, ma n’ime ma ná mpụta. 10  E ji nkume ndị buru ezigbote ibu, ndị dịkwa oké ọnụ, tọọ ntọala ha. Ụfọdụ nkume ndị a dị kubit iri, ndị ọzọ adịrị kubit asatọ. 11  E wezụga nkume ndị a dị oké ọnụ a wara otú a chọrọ ha, e jikwa osisi sida rụọ ụlọ ndị ahụ. 12  Ná nnukwu ogige dị n’ụlọ ahụ, e nwere nkume ndị a wara awa dị ahịrị atọ, nweekwa otu ahịrị osisi sida, otú e nwere ya n’ogige dị n’ime+ n’ụlọ Jehova nakwa n’ebe e si abata n’ụlọ ahụ.+ 13  Eze Solomọn ziri ozi, e si Taya kpọta Haịram.+ 14  Ọ bụ nwa otu nwaanyị isi mkpe nke si n’ebo Naftalaị. Nna ya bụ onye Taya, onye na-arụ ọrụ ọla kọpa.+ Haịram nwere ezigbo nkà. Ọrụ ya doro ya anya.+ Ọ bụkwa aka ochie n’ụdị ọrụ ọ bụla a na-eji ọla kọpa* arụ. Ọ bịakwutere Eze Solomọn ma rụọ ọrụ niile o nyere ya. 15  Ọ kpụrụ ogidi ọla kọpa abụọ.+ Ogo nke ọ bụla n’ime ogidi ndị ahụ dị kubit iri na asatọ. E jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe tụọ nke ọ bụla n’ime ogidi abụọ ahụ gburugburu, ọ dị kubit iri na abụọ.+ 16  O ji ọla kọpa kpụọ ihe abụọ a ga-edokwasị n’elu ogidi ndị ahụ. Ogo otu n’ime ihe abụọ ahụ dị kubit ise, nke ọzọ dịkwa kubit ise. 17  E nwere ihe ndị e ji ụdọ ígwè kpaa e ji chọọ ihe ndị ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị ahụ mma.+ Asaa dị n’otu n’ime ha, asaa adịrị na nke ọzọ. 18  Ọ kpụkwara ihe yiri mkpụrụ pomigranet gburugburu otu n’ime ihe ndị ahụ a kpara akpa. Ọ kpụrụ ha ahịrị abụọ, jiri ha chọọ ihe ndị ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị ahụ mma. Otú ahụkwa ka o mere ihe abụọ ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ. 19  Ihe ndị ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị dị n’ebe e si abata yiri okooko lili. Ogo ha dị kubit anọ. 20  A kpụkwasịrị ihe ndị ahụ n’elu ogidi abụọ ahụ. Ha dị n’elu ihe dị gburugburu nke jikọtara ihe ahụ a kpara akpa na ogidi nke ọ bụla. Na nke ọ bụla n’ihe abụọ ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi, e nwere narị ihe yiri mkpụrụ pomigranet abụọ (200) nke dị ahịrị abụọ gbaa gburugburu.+ 21  O gwunyere ogidi ndị ahụ n’ebe a ga-esi na-abata n’ụlọ nsọ* ahụ.+ O gwunyere ogidi n’aka nri,* kpọọ ya Jekin,* gwunyekwa ogidi n’aka ekpe,* kpọọ ya Boaz.*+ 22  Ọ rụkwara ihe yiri okooko lili n’elu ogidi ndị ahụ. Otú a ka e si rụchaa ihe niile gbasara ogidi ndị ahụ. 23  O jikwa ọla kpụọ otu nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri.*+ Ọ dị okirikiri. Isi n’otu akụkụ ọnụ ya ruo n’akụkụ ọnụ ya nke ọzọ dị kubit iri. Ogo ya dị kubit ise. E jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe tụọ gburugburu ya, ọ dị kubit iri atọ.+ 24  N’okpuru ebe ọnụ ya gbaa gburugburu, e nwere ihe ndị yiri afụfa ọhịa e ji chọọ ya mma.+ Iri dị n’otu kubit nke ọ bụla, gbaa Oké Osimiri ahụ gburugburu. Ihe ndị ahụ yiri afụfa ọhịa dị n’ahịrị abụọ. A kpụkwara ha n’ahụ́ Oké Osimiri ahụ. 25  A dọkwasịrị Oké Osimiri ahụ n’elu oké ehi iri na abụọ+ e ji ọla kọpa kpụọ. Atọ chere ihu n’ebe ugwu, atọ echee ihu n’ebe ọdịda anyanwụ, atọ echee ihu n’ebe ndịda, atọ echeekwa ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Oké Osimiri ahụ dọkwa n’elu ha. Ha niile dụnyekwara úkwù n’okpuru Oké Osimiri ahụ. 26  Igbidi ya hà ka uhiè ọbụ aka mmadụ.* A rụrụ ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko, otú okooko lili na-adị. Mmiri na-eju ya na-adị puku bat* abụọ (2,000). 27  O jikwa ọla kọpa rụọ ihe iri e ji ebu ihe.*+ Nke ọ bụla n’ime ha dị kubit iri n’ogologo nakwa kubit anọ n’obosara. Ogo ha dịkwa kubit atọ. 28  Otú a ka e si rụọ ihe ndị ahụ e ji ebu ihe: Ha nwere akụkụ dị iche iche, ndị dị n’agbata ígwè ndị e ji jikọta ha. 29  N’akụkụ ha ndị dị n’agbata ígwè ndị e ji jikọta ha, e segasịrị ọdụm,+ oké ehi, na cherob.+ Otú ahụkwa ka e segasịrị ha n’ígwè ndị ahụ e ji jikọta ha. N’elu ọdụm na oké ehi ndị ahụ nakwa n’okpuru ha, e sekwara ihe a kpara akpa dị okirikiri. 30  Nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ e ji ebu ihe nwere ụkwụ anọ e ji ọla kọpa mee nakwa ebe a kwụnyere ha e jikwa ọla kọpa mee. Ha nwekwara ihe anọ ndị dị n’akụkụ anọ na-ejide ụkwụ ha. Ihe anọ ahụ dịkwa n’okpuru otu efere. E jikwa ihe a kpara akpa dị okirikiri chọọ ha mma. 31  Si n’ala efere ahụ ruo n’ọnụ ya dị otu kubit. Ọnụ ya dị okirikiri. Ihe e ji ekwuchi ya yiri okpueze, dịrịkwa otu kubit na ọkara. E nwekwara ihe ndị a tụrụ n’ihe ahụ e ji ekwuchi ya. Ihe ahụ e ji ebu ihe adịghị okirikiri, kama, o nwere akụkụ anọ. 32  Ụkwụ anọ ndị ahụ dị n’ala ala akụkụ ya anọ. A kwụnyere ihe ji ha n’ihe ahụ e ji ebu ihe. Ogo ụkwụ nke ọ bụla dị otu kubit na ọkara. 33  A rụrụ ụkwụ ha otú e si arụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya. A kpụrụ ihe ji ụkwụ ha akpụ, kpụọkwa ụkwụ ha, spok ha, na ebe a ganyere spok ha. 34  Nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ e ji ebu ihe nwere ihe anọ ji ya n’akụkụ anọ ya. A kpụkọtara ihe ahụ e ji ebu ihe na ihe anọ ahụ ji ya. 35  N’elu elu ihe ahụ e ji ebu ihe, e nwere ihe yiri okpueze dị okirikiri. Ogo ya dị ọkara kubit. A kpụkọtara frem ya na akụkụ ya niile. 36  Ọ tụkwara cherob, ọdụm, na nkwụ n’ahụ́ frem ya nakwa n’akụkụ ya niile. Ọ tụrụ ha ebe ọ bụla ohere dị n’ahụ́ ya. E nwekwara ihe a kpara akpa dị okirikiri e ji chọọ ya mma gbaa gburugburu.+ 37  Otú a ka o si rụọ ihe iri ahụ e ji ebu ihe.+ Otú e si kpụọ otu ka e si kpụọ ibe ya.+ Ha hà otu, yiekwa ibe ha. 38  O jikwa ọla kọpa rụọ efere iri.+ Ihe ga-eju efere nke ọ bụla bụ bat* iri anọ. Isi n’otu akụkụ ọnụ ya ruo n’akụkụ ọnụ ya nke ọzọ dị kubit anọ. Otu efere dị n’elu nke ọ bụla n’ihe iri ahụ e ji ebu ihe. 39  Ọ dọsakwara ise n’ime ihe ndị ahụ e ji ebu ihe n’aka nri ụlọ ahụ, dọsa ise ọzọ n’aka ekpe ụlọ ahụ. Ọ dọsakwara Oké Osimiri ahụ n’akụkụ aka nri ụlọ ahụ, n’ebe ọwụwa anyanwụ ya.+ 40  Haịram+ rụkwara efere ndị ọzọ, shọvel,+ na ọkwá dị iche iche.+ Ọ rụchakwara ọrụ niile ọ nọ na-arụrụ Eze Solomọn n’ụlọ Jehova.+ 41  Ọ rụrụ ogidi abụọ+ na ihe ndị yiri ọkwá a kpụkwasịrị n’elu ogidi abụọ ahụ. Ọ rụkwara ihe abụọ a kpara akpa+ e ji chọọ ihe abụọ ahụ dị okirikiri a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị ahụ mma, 42  nakwa narị ihe yiri mkpụrụ pomigranet anọ (400)+ maka ihe abụọ ahụ a kpara akpa. Ahịrị abụọ nke ihe yiri mkpụrụ pomigranet dị na nke ọ bụla n’ihe abụọ ahụ a kpara akpa. E ji ha chọọ ihe abụọ ahụ yiri ọkwá a kpụkwasịrị n’elu ogidi abụọ ahụ mma. 43  Ọ rụkwara ihe iri e ji ebu ihe+ na efere iri+ dị n’elu ha, 44  rụọkwa Oké Osimiri+ na oké ehi iri na abụọ dị n’okpuru ya. 45  Ọ rụkwara ite, shọvel, ọkwá, nakwa arịa ndị ọzọ niile. Haịram ji ọla kọpa na-egbuke egbuke rụọrọ Eze Solomọn ihe ndị a maka ụlọ Jehova. 46  Ebe a nọ kpụọrọ eze ihe ndị a bụ ná mpaghara Osimiri Jọdan, n’ala ụrọ nke dị n’agbata Sọkọt na Zaretan. 47  Solomọn atụghị arịa niile ahụ atụ̀ n’ihi na ha dị nnọọ ọtụtụ. A maghịkwa otú ọla kọpa e ji rụọ ha hà n’arọ.+ 48  Ihe ndị Solomọn rụrụ maka ụlọ Jehova bụ: ebe ịchụàjà+ e ji ọlaedo rụọ, tebụl e ji ọlaedo rụọ+ nke a na-edosa achịcha a na-enye Chineke, 49  ihe ndị e ji adọsa ọkụ*+ e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ. Ise n’ime ha dị n’aka nri, ise ọzọ adịrị n’aka ekpe n’ihu Ebe Kacha Nsọ.* Ọ rụkwara ihe yiri okooko osisi,+ ọkụ* ndị ahụ, na mkpà ndị e ji ejide owu. E ji ọlaedo rụọ ihe a niile.+ 50  Ihe ndị ọzọ ọ rụrụ bụ efere, ihe ndị e ji emenyụ ọkụ,+ ọkwá, iko,+ na ihe ndị e ji agụrụ ọkụ,+ ndị e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ. O jikwa ọlaedo rụọ ihe ndị ji ibo ụzọ ndị dị n’ụlọ dị n’ime,+ ya bụ, Ebe Kacha Nsọ, nakwa ihe ndị ji ibo ụzọ ndị dị n’ụlọ nsọ* ahụ.+ 51  Eze Solomọn wee rụchaa ihe niile gbasara ụlọ Jehova. O bubataziri ihe ndị Devid nna ya doro nsọ.+ O busakwara ọlaọcha, ọlaedo, na arịa ndị ọzọ niile n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ Jehova.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ ogologo osisi ndị ahụ.
Ma ọ bụ “O ji ogidi rụọ ebe e si abata.”
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “ọla nchara.” Ihe a ka o nwere ike ịbụ ma n’ebe a ma n’ebe ọ bụla ọzọ e dere ọla kọpa n’isi akwụkwọ a.
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
O nwere ike ịbụ na Boaz pụtara “E Ji Ike.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
Jekin pụtara “Ka O [ya bụ, Jehova] Mee Ka Ọ Kwụrụ Chịm.”
Ya bụ, Ebe Nsọ.”
Ma ọ bụ “ebe a na-agbanye mmiri.”
Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ B14.
Ya bụ, ihe dị ka sentimita 7.4 (inch 2.9). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ihe a na-akwagharị akwagharị e ji ebu mmiri.”
Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu bat bụ lita 22. Gụọ B14.
Na Hibru, “n’ihu ọnụ ụlọ dị n’ime ime.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ọ ga-abụ Ebe Nsọ ka a na-ekwu maka ya.