Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 10:1-33

  • Ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ọjọọ ndị Izrel mere (1-13)

  • Gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ (14-22)

    • Tebụl Jehova na tebụl ndị mmụọ ọjọọ (21)

  • Mmadụ ime ihe iwu na-egbochighị ya ime nakwa ichebara ndị ọzọ echiche (23-33)

    • “Na-emenụ ihe niile otú ga-eme ka e too Chineke” (31)

10  Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mara na nna nna anyị hà so onyinyo ígwé ojii na-aga ebe ha na-aga,+ ha niile sikwa n’oké osimiri gafee.+  E jikwa ígwé ojii ahụ na oké osimiri ahụ mee ha niile baptizim ka ha na-eso Mosis.  Ha niile rikwara nri Chineke nyere ha.+  Ha niile ṅụkwara mmiri Chineke nyere ha.+ Ha na-aṅụbu mmiri si n’oké nkume dị ha nso. Oké nkume ahụ nọchikwara anya Kraịst.+  Ma, Chineke anabataghị ọtụtụ n’ime ha. Ọ bụ ya mere e ji bibie ha n’ala ịkpa.+  Anyị kwesịrị ịmụta ihe n’ihe a, ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ anyị agụụ otú ọ gụrụ ha.+  Unu ekperela arụsị otú ụfọdụ n’ime ha kpeere. E dere gbasara ha, sị: “Ndị Izrel nọdụrụ ala riwe ihe ma ṅụwa mmanya. Ha biliziri kporiwe ndụ.”+  Ka anyị gharakwa ịkwa iko* otú ụfọdụ n’ime ha kwara, nke mere ka puku iri abụọ na puku atọ (23,000) n’ime ha nwụọ n’otu ụbọchị.+  Ka anyị gharakwa ịnwa Jehova*+ otú ụfọdụ n’ime ha nwara ya, nke mere ka agwọ tagbusịa ha.+ 10  Unu atamukwala ntamu otú ụfọdụ n’ime ha tamuru,+ mmụọ ozi* alaa ha n’iyi.+ 11  E dekwara ihe ndị a mere ha n’akwụkwọ ka e jiri ya kụziere anyị ihe,+ ka anyịnwa ndị bi n’ọgwụgwụ oge a ghara ime ka ha. 12  N’ihi ya, ka onye chere na ya kwụ chịm lezie anya ka ọ ghara ịda.+ 13  Ọnwụnwa na-abịara unu na-abịakwara mmadụ niile.+ Ma, Chineke na-emezu ihe o kwuru, ọ gaghịkwa ekwe ka ọnwụnwa unu na-agaghị edili bịara unu.+ N’ihi ya, ọnwụnwa bịara unu, ọ ga-enyere unu aka idi ya.+ 14  N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.+ 15  Unu na-aghọta ihe. N’ihi ya, leenụ ma ihe a m na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu. 16  Iko mmanya anyị na-ekele Chineke maka ya, ọ́ bụghị ọbara Kraịst ka ọ nọchiri anya ya?+ Achịcha ahụ anyị na-anyawa, ọ́ bụghịkwa ahụ́ Kraịst ka ọ nọchiri anya ya?+ 17  Ihe e nwere bụ otu achịcha. N’ihi ya, n’agbanyeghị na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ́,+ ebe anyị niile so na-ata otu achịcha ahụ. 18  Chetanụ ndị Izrel. Mgbe ha na-eri ihe ndị a chụrụ n’àjà n’ebe ịchụàjà, ọ́ naghị adị ka ọ̀ bụ ha na Chineke na-erikọ ihe?+ 19  Ihe a m kwuru ọ̀ pụtara na arụsị na ihe ndị e ji chụọrọ arụsị àjà bara uru? 20  Mba. Kama ihe m na-ekwu bụ na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ka ndị mba ọzọ na-achụrụ àjà, ọ bụghị Chineke.+ Achọghịkwa m ka unu na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọ ihe.+ 21  Unu ekwesịghị ịna-aṅụ ihe dị n’iko Jehova* na-aṅụkwa ihe dị n’iko ndị mmụọ ọjọọ. Unu ekwesịghịkwa ịna-eri ihe dị na “tebụl Jehova”*+ na-erikwa ihe dị na tebụl ndị mmụọ ọjọọ. 22  Ka ‘ànyị na-akpasu Jehova* iwe’?+ Ànyị ka ya ike? 23  Anyị nwere ike ime ihe niile iwu na-egbochighị anyị ime, ma ọ bụghị ha niile bara uru. Anyị nwere ike ime ihe niile iwu na-egbochighị anyị ime, ma ọ bụghị ha niile ga-agba anyị ume.+ 24  Ka onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị yanwa uru.+ 25  Na-erinụ ihe niile a na-ere n’ọdụ anụ, n’ajụghị ase ọ bụla n’ihi akọnuche unu, 26  n’ihi na “ọ bụ Jehova* nwe ụwa na ihe niile dị n’ime ya.”+ 27  Ọ bụrụ na onye na-abụghị nwanna akpọọ unu òkù, unu achọọkwa ije, rienụ ihe ọ bụla o bupụtaara unu, n’ajụghị ase ọ bụla maka akọnuche unu. 28  Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, “E ji anụ a chụọrọ arụsị àjà,” unu erila ya ka unu ghara ime ka onye ahụ gwara unu ya mehie, gharakwa ime ka akọnuche onye ọ bụla nyewe ya nsogbu.+ 29  Akọnuche m na-ekwu abụghị nke unu, kama nke ndị ọzọ. N’ihi na m gaghị eme ihe m nweere onwe m ime, ma ọ bụrụ na akọnuche onye ọzọ ga-ama m ikpe.+ 30  Ọ bụrụgodị na m riri ihe, keleekwa Chineke maka ya, m̀ kwesịrị iri ihe ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ katọwa m?+ 31  N’ihi ya, ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile otú ga-eme ka e too Chineke.+ 32  Unu emela ihe ga-ewute ndị Juu na ndị Grik nakwa ọgbakọ Chineke.+ 33  M na-agba mbọ eme ihe ga-abara ndị ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara m uru.+ M na-eme ihe niile otú ọ ga-adị mmadụ niile mma, ka e nwee ike ịzọpụta ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Na Grik, “onye mbibi.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.