Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 3:1-23

  • Anụ ahụ́ ka na-achị ndị Kọrịnt (1-4)

  • Chineke na-eme ka o too (5-9)

    • Ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ (9)

  • Jiri ihe ọkụ na-enweghị ike ịgba na-arụ ụlọ (10-15)

  • Unu bụ ụlọ nsọ Chineke (16, 17)

  • Amamihe ụwa a bụ ihe nzuzu n’anya Chineke (18-23)

3  Ụmụnna m, anaghị m agwa unu okwu ka m̀ na-agwa ndị mmụọ nsọ na-edu,+ kama m na-agwa unu okwu ka m̀ na-agwa ndị na-ebi ndụ otú anụ ahụ́ chọrọ, ndị bụ́ ụmụ ọhụrụ+ n’ihe gbasara Kraịst.  Enyere m unu mmiri ara, ọ bụghị nri siri ike, n’ihi na unu esichabeghị ike. N’eziokwu, unu esichabeghịkwa ike ugbu a,+  n’ihi na unu ka na-eche echiche otú ụwa si eche.*+ Unu na-enwere ibe unu anyaụfụ, na-esekwa okwu. N’ihi ya, unu na-eche echiche otú ụwa si eche,+ na-akpakwa àgwà otú mmadụ nkịtị si akpa.  N’ihi na otu onye n’ime unu na-asị, “Ana m eso ụzọ Pọl,” onye ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs.”+ Ọ̀ bụ na unu anaghị eme ka ụmụ mmadụ nkịtị?  Ònyekwanụ bụ Apọlọs? Ònyekwa bụ Pọl? Anyị bụ ndị ozi nkịtị+ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị gwara anyị rụọ. Naanị ihe anyị mere bụ inyere unu aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.  Akụrụ m mkpụrụ,+ Apọlọs agbaa ya mmiri.+ Ma, ọ bụ Chineke na-eme ka o too.  N’ihi ya, e kwesịghị ito onye na-akụ mkpụrụ na onye na-agba ya mmiri. Kama, onye e kwesịrị ito bụ Chineke, onye na-eme ka o too.+  Onye na-akụ mkpụrụ na onye na-agba ya mmiri bụ otu.* Ma, a ga-akwụ onye ọ bụla n’ime ha ụgwọ ihe ọ rụrụ.+  N’ihi na anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ. Ununwa bụ ubi Chineke na-arụ ọrụ na ya, bụrụkwa ụlọ Chineke na-arụ.+ 10  Chineke meere m amara. Ọ bụ ya mere m ji nwee ike ịtọ ntọala+ ka onye bụ́ aka ochie n’ịrụ ụlọ,* ma onye ọzọ na-arụ ụlọ n’elu ya. Ma, ka onye ọ bụla lezie anya n’otú o si arụ ụlọ n’elu ya. 11  N’ihi na o nweghị onye ga-atọli ntọala ọzọ karịa nke a tọrọla, ya bụ, Jizọs Kraịst.+ 12  Mmadụ nwere ike jiri ọlaedo, ọlaọcha, na nkume dị oké ọnụ* rụọ ụlọ n’elu ntọala ahụ. Onye ọzọ nwekwara ike jiri osisi, ahịhịa, na okporo ọka rụọ ụlọ n’elu ntọala ahụ. 13  Ma, a ga-eme ka a mata ọrụ onye ọ bụla* n’ụbọchị ule. N’ụbọchị ahụ, a ga-eji ọkụ mee ka a mata ụdị ọrụ onye ọ bụla rụrụ.+ 14  Ọ bụrụ na ọkụ agbaghị ihe mmadụ rụrụ n’elu ntọala ahụ, a ga-agọzi onye ahụ. 15  Ma, ọ bụrụ na ihe mmadụ rụrụ agbaa ọkụ, ezigbo ihe funahụrụ onye ahụ, ma a ga-azọpụta ya. Ọ bụrụgodị na a zọpụta ya, ọ ga-adị ka è si n’ọkụ zọpụta ya. 16  Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke+ nakwa na mmụọ Chineke bi n’ime unu?+ 17  Ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie ụlọ nsọ Chineke, Chineke ga-ebibi onye ahụ, n’ihi na ụlọ nsọ Chineke dị nsọ. Unu bụkwa ụlọ nsọ ahụ.+ 18  Ka onye ọ bụla ghara iduhie onwe ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu chere na ya ma ihe n’anya ndị mmadụ n’ụwa a,* ya ghọọ onye nzuzu, ka o wee bụrụ onye ma ihe. 19  N’ihi na amamihe ụwa a bụ ihe nzuzu n’anya Chineke, maka na e dere, sị: “Ọ na-eme ka ọnyà ndị ma ihe siri ma ha.”+ 20  E dekwara, sị: “Jehova* ma na ihe ndị ma ihe na-atụgharị n’uche bụ ihe efu.”+ 21  N’ihi ya, unu ejila ndị mmadụ na-anya isi. Ihe niile bụ nke unu, 22  ma Pọl ma Apọlọs ma Sifas*+ ma ụwa ma ndụ ma ọnwụ ma ihe ndị dị ebe a ugbu a ma ihe ndị ga-emecha dị. Ihe niile bụ nke unu. 23  Ununwa bụ nke Kraịst,+ ma Kraịst bụ nke Chineke.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ka ndị anụ ahụ́ na-achị.”
Ma ọ bụ “na-arụ otu ihe.”
Ma ọ bụ “onye na-ahazi ọrụ, nke ma ihe.”
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ka ọrụ onye ọ bụla pụta ìhè.”
Ma ọ bụ “n’oge a.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Gụọ A5.
Aha ya ọzọ bụ Pita.