Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 7:1-40
7 A bịa n’ihe unu nọ na-ajụ m gbasara ya n’akwụkwọ ozi unu detaara m, ọ ka mma ka nwoke ghara ibitụ nwaanyị aka.*
2 Ma, ebe ọ bụ na ịkwa iko* zuru ebe niile, ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke ya,+ ka nwaanyị ọ bụla nweekwa di nke ya.+
3 Ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya, ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ.+
4 Ọ bụghị nwunye na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ di ya. Ọ bụghịkwa di na-achị ahụ́ ya, kama ọ bụ nwunye ya.
5 Onye ajụla inye ibe ya ihe ruuru ya. Ma, ọ bụrụ na di na nwunye ekwekọrịta na ha ga-enwe oge ha ga-ahapụ inye ya ibe ha, ka ha wee jiri oge ahụ kpee ekpere, ọ dị mma otú ahụ. E mechaa, ha enyekwa ibe ha ihe ruuru ha, ka Setan wee ghara ịnọ na-anwa ha ọnwụnwa maka na ha ejidelighị onwe ha.
6 Ma, ọ bụghị iwu ka m na-enye unu, kama ọ bụ ihe unu nwere ike ime.
7 Ma, ọ dị m ka ya bụrụ na mmadụ niile dị otú a m dị. Otú o sina dị, Chineke nyere onye ọ bụla onyinye nke ya.+ Ọ bụ ya mere e ji nwee ndị lụrụ di na ndị lụrụ nwunye, nweekwa ndị na-alụghị.
8 M na-agwa ndị na-alụghị di na ndị na-alụghị nwunye na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ọ kaara ha mma ịnọ otú a m nọ.+
9 Ma ọ bụrụ na ha agaghị ejideli onwe ha, ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye, n’ihi na ọ ka mma ka mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye karịa ịhapụ ịlụ, agụụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ana-agụgbu ya.+
10 Ana m agwa ndị di na nwunye na nwaanyị ekwesịghị ịhapụ di ya. Ma ọ bụghị m na-agwa ha ihe a, kama ọ bụ Onyenwe anyị.+
11 Ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya, ya nọrọ n’alụghị di. Ma ọ́ gaghị anọli, ya gaa ka ya na di ya kpezie. Di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.+
12 Ma ana m agwa ndị ọzọ, sị: Ọ bụrụ na e nwere nwanna nwunye ya na-ekweghị n’Onyenwe anyị, ma nwunye ya ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ ya. Ọ bụ mụnwa na-ekwu ihe a, ọ bụghị Onyenwe anyị.+
13 Ọ bụrụkwa na e nwere nwanna nwaanyị di ya na-ekweghị n’Onyenwe anyị, ma di ya ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya.
14 N’ihi na e nwere ike ịsị na di ahụ na-ekweghị n’Onyenwe anyị dị nsọ n’ihi mmekọrịta ya na nwunye ya. E nwekwara ike ịsị na nwunye ahụ na-ekweghị n’Onyenwe anyị dị nsọ n’ihi mmekọrịta ya na nwanna ahụ. Ma ọ bụrụ na ha ebighị, ụmụ ha ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma ugbu a, ha dị nsọ.
15 Ma ọ bụrụ na onye nke na-ekweghị n’Onyenwe anyị chọrọ ịhapụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị, ya hapụ ya. Iwu ejighịzi nwanna ahụ ịnọrọ onwe ya. Chineke emeela ka anyị nọrọ n’udo.+
16 Gịnwa bụ́ nwunye, ọ bụrụ na gị na di gị ebiri, i nwere ike ịzọpụta ya.+ Gịnwa bụ́ di, ọ bụrụ na gị na nwunye gị ebiri, i nwekwara ike ịzọpụta ya.
17 Ka onye ọ bụla nọrọ otú ọ nọ Jehova* akpọọ ya ka o sowe ụzọ Jizọs, ka ọ na-ebikwa ndụ otú ahụ Chineke hapụrụ ya ka ọ nọrọ.+ Ihe a ka m na-agwa ọgbakọ niile ka ha mee.
18 E nwee onye Chineke kpọrọ mgbe e bicharala ya úgwù,+ ya nọrọ otú ahụ. E nweekwa onye ọ kpọrọ mgbe a na-ebibeghị ya úgwù, ya agakwala ka e bie ya úgwù.+
19 Ihe dị mkpa bụ ka mmadụ na-edebe iwu Chineke,+ ọ bụghị ma è biri ya úgwù ma ọ bụ na e bighị ya.+
20 Otú ọ bụla onye ọ bụla dị mgbe a kpọrọ ya, ya dịgide otú ahụ.+
21 À kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu? Echegbula onwe gị maka ya.+ Ma ọ bụrụ na i nwere ike inwere onwe gị, nwere onwe gị.
22 N’ihi na e meela ka onye ọ bụla na-eso ụzọ Onyenwe anyị, nke a kpọrọ mgbe ọ bụ ohu, nwere onwe ya ma bụrụ nke Onyenwe anyị.+ Onye a kpọkwara mgbe o nweere onwe ya bụ ohu Kraịst.
23 Chineke ji ihe dị oké ọnụ zụta unu.+ Kwụsịnụ ịgbara mmadụ ohu.
24 Ụmụnna m, otú ọ bụla onye ọ bụla dị mgbe a kpọrọ ya, ya dịgide otú ahụ, na-emekwa ka ya na Chineke na-adị ná mma.
25 E nweghị iwu ọ bụla Onyenwe anyị sị ka m nye ndị na-amaghị nwoke na ndị na-amaghị nwaanyị.* Ihe m na-ekwu bụ uche m,+ unu kwesịkwara ịnabata ya n’ihi ebere Onyenwe anyị meere m.
26 Ebe ọ bụ na anyị bi n’oge ihe siri ike, echere m na ọ kacha mma ka mmadụ nọrọ otú ọ nọ.
27 Ọ bụrụ na ị lụọla nwaanyị, echela echiche ịhapụ ya.+ Ọ bụrụkwa na ị lụbeghị,* achọla nwaanyị ị ga-alụ.
28 Ma a sịgodị na ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, i mehieghị. Ọ bụrụkwa na onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ onye na-amaghị nwaanyị alụọ di ma ọ bụ nwunye, o mehieghị. Ma, ndị lụrụ ga-enwe ọtụtụ nsogbu. Ma m na-achọ ịzọ unu.
29 Ụmụnna m, burunụ n’uche na oge fọdụrụ dị ntakịrị.+ Si ugbu a gawa, ka ndị lụrụ nwaanyị dịrị ka ndị na-alụghị nwaanyị.
30 Ka ndị na-ebe ákwá dịrị ka ndị na-anaghị ebe ákwá. Ka ndị na-aṅụrị ọṅụ dịrị ka ndị na-anaghị aṅụrị ọṅụ. Ka ndị na-azụ ihe dịrị ka ndị zụcharanụ gbara aka.
31 Ka ndị na-erite uru n’ụwa a dịrịkwa ka ndị na-anaghị eritecha uru niile dị na ya, n’ihi na ihe ndị na-eme n’ụwa a na-agbanwe agbanwe.
32 N’eziokwu, achọrọ m ka unu ghara ịna-echegbu onwe unu. Onye na-alụghị nwaanyị na-eche naanị gbasara ọrụ Onyenwe anyị, n’ihi na ọ na-achọ ime ihe dị Onyenwe anyị mma.
33 Ma onye lụrụ nwaanyị na-echegbu onwe ya maka ihe ụwa a,+ n’ihi na ọ na-achọ ime ihe dị nwunye ya mma.
34 N’ihi ya kwa, obi ya anaghị adị otu ebe. Ma, nwaanyị na-alụghị di na nwaanyị na-amaghị nwoke na-eche naanị ihe gbasara Onyenwe anyị,+ n’ihi na ha na-achọ ka ahụ́ ha na uche ha dị nsọ. Ma, nwaanyị lụrụ di na-echegbu onwe ya maka ihe ụwa a, n’ihi na ọ na-achọ ime ihe dị di ya mma.
35 Ma ana m ekwu ihe a maka ọdịmma unu, ọ bụghị iji gbochie unu ime ihe unu chọrọ ime,* kama ọ bụ iji mee ka unu na-eme ihe kwesịrị ekwesị, meekwa ka a ghara inwe ihe ga-eme ka uche unu ghara ịdị n’ozi unu ji obi unu niile na-ejere Onyenwe anyị.
36 Ma, ọ bụrụ na onye na-alụbeghị di ma ọ bụ onye na-alụbeghị nwunye* echee na ya anaghị ejideli onwe ya ma agụụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị gụwa ya, ya abụrụkwa na ọ bụghịzi nwata,* ya chọọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ya lụọ,+ o mehieghị.
37 Ma, ọ bụrụ na mmadụ ekpebie na ya agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye,* n’ihi na ọ naghị agụ ya, ya abụrụkwa na ọ kwụsiri ike n’ihe o kpebiri, nakwa na ọ na-ejideli onwe ya, ọ ga-abara ya uru.+
38 N’ihi ya, onye lụrụ di ma ọ bụ onye lụrụ nwunye ga-erite uru. Ma, onye na-alụghị ga-aka erite uru.+
39 Nwaanyị enweghị ikike ịlụ di ọzọ mgbe di ya dị ndụ.+ Ma di ya nwụọ, o nwere ike ịlụ onye ọ chọrọ. Ma, ọ ga-alụ naanị onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị.+
40 Ma n’uche m, obi ga-aka adị ya ụtọ ma ọ nọrọ otú ọ nọ. Obi sikwara m ike na m nwere mmụọ Chineke.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, ka nwoke na nwaanyị ghara inwe mmekọahụ.
^ Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “ndị na-alụtụbeghị di ma ọ bụ nwunye.”
^ O nwekwara ike ịbụ onye nwunye ya nwụrụla.
^ Na Grik, “iji kee unu agbụ.”
^ Ma ọ bụ “onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ onye na-amaghị nwaanyị.”
^ Onye a na-ekwu okwu ya ebe a bụ onye toferela oge mmekọ nwoke na nwaanyị na-akacha agụ ndị na-eto eto.
^ Ma ọ bụ “agaghị ama nwoke ma ọ bụ nwaanyị.”