Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Tesalonaịka 1:1-10

  • Ekele (1)

  • Pọl kelere Chineke maka okwukwe ndị Tesalonaịka (2-10)

1  Pọl, Silvenọs,*+ na Timoti+ na-edetara ọgbakọ ndị Tesalonaịka, ndị ha na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị n’otu, akwụkwọ ozi: Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.  Mgbe ọ bụla anyị chetara unu niile n’ekpere anyị, anyị na-ekele Chineke+  n’ihi na anyị na-echeta n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, ọrụ niile okwukwe na ịhụnanya mere ka unu na-arụ nakwa otú unu si na-atachi obi n’ihi olileanya unu nwere+ n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.  Ụmụnna anyị ndị Chineke hụrụ n’anya, anyị ma na Chineke họọrọ unu,  n’ihi na ọ bụghị naanị okwu anyị gwara unu mere ka unu nụ ozi ọma, kama mmụọ nsọ nyere aka. Obi siri anyị ike na ozi ọma anyị ziri unu bụ eziokwu, ọ kpakwara ike n’ahụ́ unu. Unu makwa ụdị ihe anyị mere n’ihi unu mgbe anyị na unu nọ.  Unu na-eme ka anyị,+ na-emekwa ka Onyenwe anyị,+ ebe ọ bụ na unu ji ọṅụ, nke mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee, nabata okwu Chineke n’agbanyeghị na a kpagbusiri unu ike.+  Ihe a meziri ka unu bụrụ ndị mmadụ niile kwere ekwe nọ na Masedonia nakwa n’Akeya na-amụta ihe n’aka ha.  N’eziokwu, ọ bụghị naanị na unu ekwusaala okwu Jehova* na Masedonia nakwa n’Akeya, kama n’ebe niile, a na-anụ banyere okwukwe unu nwere na Chineke,+ nke mere na e nweghịzi ihe anyị ga-ekwu.  N’ihi na ọ bụ ha na-akọ banyere mgbe mbụ anyị bịakwutere unu nakwa otú unu si hapụ arụsị ndị unu na-efe+ ka unu wee bụrụ ndị ohu ezi Chineke dị ndụ ma fewe ya 10  nakwa ka unu chere Ọkpara ya nke ga-esi n’eluigwe bịa,+ onye o si n’ọnwụ kpọlite, ya bụ, Jizọs, onye ga-anapụta anyị n’iwe na-abịanụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

A na-akpọkwa ya Saịlas.
Gụọ A5.