Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Tesalonaịka 5:1-28

  • Ụbọchị Jehova ga-abịa (1-5)

    • “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” (3)

  • Mụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma (6-11)

  • Agbamume (12-24)

  • Ekele mmechi (25-28)

5  Ụmụnna anyị, ọ dịghị mkpa ka e detara unu ihe ọ bụla banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-eme.  N’ihi na unu ma nke ọma na ụbọchị Jehova*+ ga-abịa nnọọ otú onye ohi si abịa n’abalị.+  Mgbe ọ bụla ha na-asị, “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” a ga-ebibi ha na mberede mgbe ha na-atụghị anya ya,+ otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede. Ha agaghị agbanahụ ya.  Ma ụmụnna anyị, unu anọghị n’ọchịchịrị. N’ihi ya, ụbọchị ahụ agaghị abịa unu na mberede otú chi si abọkwute ndị ohi,  n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè na nke ehihie.+ Anyị abụghị ụmụ nke abalị ma ọ bụ nke ọchịchịrị.+  N’ihi ya, ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra otú ndị ọzọ na-ehi,+ kama ka anyị mụrụ anya+ ma na-eche echiche nke ọma.+  N’ihi na ndị na-ehi ụra na-ehi ya n’abalị, ndị na-aṅụbigakwa mmanya ókè na-aṅụbiga ya ókè n’abalị.+  Ma anyị ndị bụ́ ụmụ nke ehihie, ka anyị na-eche echiche nke ọma ma yiri ihe e ji echebe obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa okpu agha bụ́ olileanya nzọpụta+  n’ihi na Chineke họọrọ anyị, ọ bụghị ka o wesa anyị iwe, kama ka o si n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst zọpụta anyị.+ 10  Jizọs nwụrụ maka anyị,+ ka anyị na ya wee dịkọọ ndụ,+ ma ànyị mụ anya ma ànyị na-ehi ụra.* 11  N’ihi ya, na-agbanụ ibe unu ume* ma na-emenụ ka ibe unu dị ike,+ otú unu na-eme n’eziokwu. 12  Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-eduzi unu n’ọrụ Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ. 13  Anyị na-arịọkwa unu ka unu jiri ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.+ 14  Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-adọ ndị na-enupụ isi aka ná ntị,+ na-agụgụ ndị dara mbà, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwekwara mmadụ niile ndidi.+ 15  Hụnụ na e nweghị onye ji ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ,+ kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.+ 16  Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile.+ 17  Na-ekpenụ ekpere mgbe niile.+ 18  Na-ekelenụ Chineke maka ihe niile.+ Ihe a bụ ihe Chineke chọrọ ka unu na-eme ebe unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 19  Unu akwụsịla ọrụ mmụọ nsọ na-arụ n’ime unu.*+ 20  Unu eledala amụma anya.+ 21  Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile;+ jidesienụ ihe dị mma aka ike. 22  Gbaaranụ ụdị ajọ omume niile ọsọ.+ 23  Ka Chineke nke udo mee ka unu dị nsọ otú zuru ezu. Ụmụnna anyị, ka e meekwa ka àgwà ọma* unu na ndụ* unu na ahụ́ unu ghara inwe ntụpọ ọ bụla n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 24  Onye na-akpọ unu na-emezu ihe o kwuru. N’eziokwu, ọ ga-eme ya. 25  Ụmụnna anyị, na-ekperenụ anyị ekpere.+ 26  Susuonụ ụmụnna niile ọnụ mgbe unu na-ekele ha.* 27  Eji m aha Onyenwe anyị na-agwasi unu ike ka unu hụ na a gụụrụ ụmụnna niile akwụkwọ ozi a.+ 28  Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-ehi ụra ọnwụ.”
Ma ọ bụ “na-akasinụ ibe unu obi.”
Na Grik, “Unu emenyụla ọkụ nke mmụọ nsọ.”
Na Grik, “mmụọ.”
Na Grik, “mkpụrụ obi.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.