Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 10:1-14

  • Otú Sọl na ụmụ ya si nwụọ (1-14)

10  Ndị Filistia nọ na-alụso ndị Izrel agha, gbuokwa ọtụtụ n’ime ha n’Ugwu Gilboa. Ndị Izrel fọrọnụ gbara ọsọ.+  Ndị Filistia wee chụsie Sọl na ụmụ ya ọsọ ike, chụkwute ha, gbuokwa Jonatan, Abinadab, na Malkaị-shua,+ ụmụ Sọl.  Agha ahụ wee siere Sọl ike, ndị na-agba ụta emechaakwa hụ ya ma gbaa ya ụta merụrụ ya ahụ́.+  Sọl wee sị onye na-eburu ya ngwá agha: “Mịrị mma agha gị maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù ghara ịbịa mesie m ike.”+ Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ngwá agha ime ihe a ọ gwara ya, n’ihi na ezigbo ụjọ ji ya. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+  Mgbe onye na-eburu ya ngwá agha hụrụ na ọ nwụọla, yanwa dakwasịkwara ná mma agha nke ya, nwụọkwa.  Otú a ka Sọl na ụmụ ya atọ si nwụọ. Ndị ụlọ ya niile nwụkwara.+  Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, nakwa na Sọl na ụmụ ya anwụọla, ha malitere ịhapụ obodo ha gbaa ọsọ. Ndị Filistia mechakwara bịa bichie ebe ndị ahụ.  N’echi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụsị ndị e gburu egbu ihe ha yi, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ka ha tọgbọ n’Ugwu Gilboa.+  Ha wee yipụ ya ihe o yi, gbupụ ya isi, chịrị ngwá agha ya, ziekwa ozi ka a gaa n’ala ndị Filistia niile nakwa n’ụlọ arụsị ha+ gwa ndị obodo ha ihe merenụ. 10  Ha dowekwara ngwá agha ya n’ụlọ arụsị ha, kedokwa okpokoro isi ya n’ụlọ Degọn.+ 11  Mgbe ndị niile bi na Jebesh+ nke dị na Gilied nụrụ ihe niile ndị Filistia mere Sọl,+ 12  ndị agha ha niile gara buru ozu Sọl na ozu ụmụ ya. Ha butere ha Jebesh ma lie ọkpụkpụ ha n’okpuru nnukwu osisi dị na Jebesh.+ Ha bukwara ọnụ ụbọchị asaa. 13  Otú a ka Sọl si nwụọ n’ihi isi o nupụụrụ Jehova. O meghị ihe Jehova gwara ya.+ Ọ gakwukwaara onye na-agba afa ka ọ jụọrọ ya ase+ 14  kama ịjụ Jehova ase. Ọ bụ ya mere o* ji mee ka ọ nwụọ ma nyefee Devid nwa Jesi ọchịchị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Jehova.