Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 13:1-14

  • Ndị Izrel gara Kiriat-jierim buru Igbe Chineke (1-14)

    • Chineke gburu Ọza (9, 10)

13  Devid na ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha nakwa onye ọ bụla bụ́ onye ndú nwere nnọkọ.+  Devid wee gwa ndị Izrel niile zukọrọnụ, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, dịkwa Jehova bụ́ Chineke anyị mma, ka anyị zigara ụmụnne anyị fọdụrụ n’Izrel niile ozi, ha na ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ n’obodo ha dị iche iche+ nakwa ndị nke nọ n’ala ebe anụmanụ ha na-ata ahịhịa, ka ha bịakwute anyị.  Ka anyị gaakwa bute Igbe+ Chineke anyị.” Devid chọrọ ka e bute ya maka na ndị Izrel leghaara ya anya n’oge Sọl na-achị.+  Ha niile nabatara ihe a o kwuru, n’ihi na ọ dị ha mma.  Devid wee kpọkọta ndị Izrel niile, malite n’osimiri Ijipt* ruo Libo-hemat,*+ ka ha gaa Kiriat-jierim+ bute Igbe ezi Chineke.  Devid na ndị Izrel niile gawaziri Beala,+ si ya ruo Kiriat-jierim, nke dị na Juda, ka ha si ebe ahụ bute Igbe ezi Chineke, onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob.+ Ndị mmadụ na-aga ebe Igbe ahụ dị na-akpọ aha Jehova.  Ma, ha gara n’ụlọ Abinadab jiri ụgbọala ọhụrụ+ anụmanụ na-adọkpụ buru Igbe ezi Chineke. Ọza na Ahayo nọkwa na-edu ụgbọala ahụ.+  Devid na ndị Izrel niile jikwa obi ha niile na-aṅụrị ọṅụ, na-abụkwa abụ n’ihu ezi Chineke. Ha ji ma une ma ụbọ akwara ma obere ịgbà+ ma ájà+ ma opi+ ma ngwá egwú ndị ọzọ, na-eti egwú.  Ma, mgbe ha ruru ebe a na-akpọ Kaịdọn, bụ́ ebe a na-azọcha ọka, Ọza matịrị aka jide Igbe ahụ, n’ihi na ọ fọrọ obere ka ehi ndị kpụ ụgbọala ahụ kwatuo Igbe ahụ. 10  Jehova wee wesa Ọza ezigbo iwe, gbuokwa ya ebe ahụ n’ihi na ọ matịrị aka jide Igbe ahụ.+ Ọ nwụkwara ebe ahụ n’ihu Chineke.+ 11  Ma iwe were Devid maka na Jehova wesara Ọza ezigbo iwe. A na-akpọkwa ebe ahụ Pirez-ọza* ruo taa. 12  Ihe a mere ka Devid tụọ ezi Chineke egwu n’ụbọchị ahụ, ya asị: “Olee otú m ga-esi bute Igbe ezi Chineke n’ụlọ m?”+ 13  Devid hapụziri ibute Igbe ahụ n’ụlọ ya dị n’Obodo Devid. Kama ibute ya ebe ahụ, o kwuru ka e buga ya n’ụlọ Obed-ịdọm onye Gat. 14  Igbe ezi Chineke wee dịrị n’ụlọ Obed-ịdọm ruo ọnwa atọ. Jehova nọkwa na-agọzi ezinụlọ Obed-ịdọm na ihe niile o nwere.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “malite na Shaịhọ,” ya bụ, otu mpaghara Osimiri Naịl.
Ma ọ bụ “ebe e si abanye Hemat.”
O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
Pirez-ọza pụtara “Iwe E Wesara Ọza.”