Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 14:1-17

  • Chineke mere ka ọchịchị Devid sie ike (1, 2)

  • Ezinụlọ Devid (3-7)

  • Devid meriri ndị Filistia (8-17)

14  Haịram+ eze Taya ziri ndị ozi ka ha gakwuru Devid, ka ha hazie otú a ga-esi bute osisi sida, o zigakwara ndị na-eji nkume arụ mgbidi na ndị ọkwá nkà ka ha rụọrọ Devid ụlọ.*+  Ihe a mere ka o doo Devid anya na Jehova emeela ka ọchịchị ya sie ezigbo ike n’Izrel,+ n’ihi na o jirila maka ndị ya bụ́ Izrel mee ka alaeze ya na-aga nke ọma.+  Devid lụkwuru ụmụ nwaanyị+ na Jeruselem, mụtakwuokwa ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.+  Aha ụmụ a mụụrụ ya na Jeruselem bụ:+ Shamua, Shobab, Netan,+ Solomọn,+  Ịbha, Elaịshua, Elpelet,  Noga, Nifeg, Jefaya,  Elishama, Beelayada, na Elifelet.  Mgbe ndị Filistia nụrụ na e teela Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel niile,+ ha niile pụtara na-achọ Devid.+ Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gara ka ọ lụso ha agha.  Ma, ndị Filistia bịara na-alụso ndị bi na Ndagwurugwu Refeyim agha.+ 10  Devid wee jụọ Chineke, sị: “Ọ̀ bụ m gaa lụso ndị Filistia agha? Ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova asị ya: “Gawa, m ga-enyeferịrị ha n’aka gị.”+ 11  Devid wee gaa Bel-perezim,+ gbuo ha ebe ahụ. Mgbe o gbuchara ha, ya asị: “Ezi Chineke esila n’aka m kwada ndị iro m ka ebe mmiri kwadara mgbidi.” Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ebe ahụ Bel-perezim.* 12  Ndị Filistia hapụrụ chi ha dị iche iche ebe ahụ, Devid ekwuo ka a gbaa chi ndị ahụ ọkụ, a gbaa ha ọkụ.+ 13  Mgbe e mechara, ndị Filistia bịara ọzọ lụso ndị bi na ndagwurugwu ahụ agha.+ 14  Devid wee jụọ Chineke ọzọ ma ọ̀ bụ ya gakwuru ha. Ma, ezi Chineke sịrị ya: “Agakwurula ha ihu na ihu. Kama, gaa nkọnkọ nkọnkọ ruo n’azụ ha, lụsokwa ha agha n’ihu ebe ahụ osisi beka juru.+ 15  Ị nụ ihe na-ada ka ụda ụkwụ ndị mmadụ n’elu osisi beka ndị ahụ, gaa lụso ha agha, n’ihi na ọ pụtara na ezi Chineke eburularị gị ụzọ pụta igbu ndị agha ndị Filistia.”+ 16  Devid mere nnọọ ihe ezi Chineke gwara ya mee.+ Ha gbukwara ndị agha ndị Filistia malite na Gibiọn ruo Giza.+ 17  Aha Devid dewekwara ude n’ala niile. Jehova mekwara ka mba niile na-atụ Devid ụjọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “obí eze.”
Bel-perezim pụtara “Onyeisi Ndị Na-akwada Ihe.”