Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 16:1-43

  • A dọsara Igbe Chineke n’ụlọikwuu (1-6)

  • Abụ Devid rọrọ iji kelee Chineke (7-36)

    • “Jehova abụrụla Eze” (31)

  • Ndị na-eje ozi n’ebe a dọsara Igbe Chineke (37-43)

16  Otú ahụ ka ha si bubata Igbe ezi Chineke ma dọsa ya n’ụlọikwuu ahụ Devid mara maka ya.+ Ha chụkwaara ezi Chineke àjà a na-esu ọkụ na àjà udo.+  Mgbe Devid chụchara àjà a na-esu ọkụ+ na àjà udo,+ ọ gọziri ndị Izrel n’aha Jehova.  O nyekwara onye Izrel ọ bụla, ma nwoke ma nwaanyị, otu achịcha, otu keeki mkpụrụ osisi det, na otu keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ.  Ọ họpụtakwara ụfọdụ ndị Livaị ka ha na-eje ozi ebe ahụ a dọsara Igbe Jehova+ nakwa ka ha na-asọpụrụ* Jehova bụ́ Chineke Izrel, na-ekele ya ma na-eto ya.  Esaf+ bụ onyeisi ha. Zekaraya na-esote ya. Jeayel, Shemiramọt, Jehayel, Matitaya, Elayab, Benaya, Obed-ịdọm, na Jeayel+ na-akpọ ụbọ akwara na une.+ Esaf na-akụ ájà.+  Benaya na Jahazayel bụ́ ndị nchụàjà na-afụkwa opi mgbe niile n’ihu igbe ọgbụgba ndụ ezi Chineke.  Ụbọchị ahụ bụ nke mbụ Devid rọrọ abụ e ji ekele Jehova. Ọ gwakwara Esaf+ na ụmụnne ya ka ha bụọ ya. Abụ ahụ bụ:  “Keleenụ Jehova.+ Kpọkuonụ aha ya. Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+  Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto.+ Chebaranụ ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ echiche.*+ 10  Jirinụ aha nsọ ya na-eme ọnụ.+ Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+ 11  Chọọnụ Jehova,+ rịọkwanụ ya ka o nye unu ike. Na-arịọnụ ya mgbe niile ka o meere unu amara.+ 12  Chetanụ ihe ndị dị ebube o mere,+Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ nakwa ikpe ndị o kpere, 13  Unu ụmụ* Izrel bụ́ ndị ohu ya,+Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+ 14  Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+ Ọ na-ekpe ụwa niile ikpe.+ 15  Na-echetanụ ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. Na-echetanụ nkwa o kwere* ruo otu puku ọgbọ.+ 16  Ọ bụ ya na Ebreham gbara ndụ ahụ.+ Ọ ṅụkwaara Aịzik iyi.+ 17  Ọ ṅụrụ iyi ahụ iji mee ka obi sie Jekọb ike+Nakwa ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka ya na Izrel gbara. 18  Ọ sịrị, ‘M ga-enye unu ala Kenan+Ka ọ bụrụ ihe unu ketara.’+ 19  Ha dị ole na ole mgbe ahụ. N’eziokwu, ha ehighị nne, ha bụkwa ndị mbịarambịa.+ 20  Ha nọ na-aga si n’otu mba ruo mba ọzọ,Sikwa n’otu alaeze ruo alaeze ọzọ.+ 21  O kweghị ka onye ọ bụla megbuo ha,+Kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha.+ 22  Ọ sịrị, ‘Unu akpala ndị m tere mmanụ aka. Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.’+ 23  Ndị niile bi n’ụwa, bụkuonụ Jehova abụ. Kwa ụbọchị, na-akọnụ otú o si azọpụta ndị mmadụ.+ 24  Kọọrọnụ mba dị iche iche na ọ dị ebube. Kọọkwaranụ mmadụ niile ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ. 25  N’ihi na Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya. E kwesịrị ịna-atụ egwu ya karịa chi ọ bụla ọzọ.+ 26  Chi ọzọ niile ndị mmadụ na-efe abaghị uru.+ Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.+ 27  Ebube na ịma mma gbara ya gburugburu.+ Ike na ọṅụ dịkwa n’ebe o bi.+ 28  Ezinụlọ dị iche iche, toonụ Jehova. Toonụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa ike.+ 29  Toonụ aha Jehova dị ebube.+ Jirinụ onyinye bịa ebe ọ nọ.+ Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.*+ 30  Ndị niile bi n’ụwa, maanụ jijiji n’ihu ya. E kesiri ụwa* ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ.*+ 31  Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị.+ Kọsaanụ ná mba dị iche iche, sị: ‘Jehova abụrụla Eze.’+ 32  Ka oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya mee mkpọtụ. Ka ọhịa na ihe niile dị n’ime ya ṅụrịa ọṅụ. 33  Ka osisi ndị dị n’oké ọhịa tiekwa mkpu ọṅụ n’ihi Jehova,N’ihi na ọ na-abịa* ikpe ụwa ikpe. 34  Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+ Ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.+ 35  Sịkwanụ, ‘Chineke, onye nzọpụta anyị, biko, zọpụta anyị,+Sikwa ná mba dị iche iche kpọkọta anyị ma napụta anyị n’aka ha,Ka anyị wee too aha nsọ gị,+ Jirikwa ọṅụ na-eto gị.+ 36  Ka a na-eto Jehova bụ́ Chineke Izrel Ruo mgbe ebighị ebi.’”* Mmadụ niile sịkwara, “Amen!”* Ha tokwara Jehova. 37  Devid hapụziri Esaf+ na ndị Livaị ndị ọzọ ka ha na-eje ozi mgbe niile n’ebe ahụ a dọsara igbe ọgbụgba ndụ Jehova.+ Ha na-ejekwa ozi ọ bụla e kwesịrị ije kwa ụbọchị.+ 38  Ọ hapụkwara Obed-ịdọm na ụmụnne ya iri isii na asatọ, nakwa Obed-ịdọm nwa Jedutọn, na Hosa ka ha na-eche ọnụ ụzọ ámá nche. 39  Ọ hapụkwara Zedọk+ bụ́ onye nchụàjà na ndị nchụàjà ibe ya ka ha nọrọ n’ụlọikwuu Jehova dị n’ebe dị elu na Gibiọn+ 40  na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ, ma n’ụtụtụ ma ná mgbede. Ha na-emekwa ihe niile e dere n’Iwu Jehova otú ọ gwara ndị Izrel ka ha na-eme.+ 41  Ndị ọzọ so ha bụ Himan, Jedutọn,+ na ndị ọzọ a họọrọ ka ha na-ekele Jehova,+ n’ihi na “ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ 42  Himan+ na Jedutọn so ha ka ha nwee ike ịna-afụ opi, na-akụkwa ájà na ihe ndị ọzọ e ji eto ezi Chineke. Ọ bụkwa ụmụ Jedutọn+ na-eche ọnụ ụzọ ámá nche. 43  Mgbe ha mechara, onye ọ bụla lara n’ụlọ ya. Devid lakwara ka ọ gọzie ndị ezinụlọ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-echeta.”
O nwere ike ịbụ, “Kwuonụ gbasara ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “iwu o nyere.”
O nwere ike ịbụ, “Feenụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa nsọ.”
Ma ọ bụ “ala.”
Ma ọ bụ “eme ka ọ maa jijiji.”
Ma ọ bụ “ọ bịala.”
Ma ọ bụ “Ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”