Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 18:1-17

  • Ndị Devid meriri (1-13)

  • Ndị ha na Devid so na-achị (14-17)

18  Ka oge na-aga, Devid lụsoro ndị Filistia agha ma merie ha. Ọ nakwaara ha+ Gat+ na ime obodo ndị dị ya nso.*  O merikwara ndị Moab,+ ha aghọọ ndị ohu ya, na-atụkwara ya ụtụ.+  Ka Hadadiza+ eze Zoba+ nọ na-aga ka o nwetaghachi Osimiri Yufretis,+ Devid nọ ebe dị nso na Hemat+ lụso ya agha, meriekwa ya.  Devid jidekwara otu puku (1,000) ụgbọ ịnyịnya Hadadiza, na puku ndị agha ya asaa (7,000) na-agba ịnyịnya nakwa puku ndị agha ya iri abụọ (20,000) ji ụkwụ aga.+ O sekwara ịnyịnya niile na-adọkpụ ụgbọala ha akwara ma e wezụga otu narị (100) n’ime ha ọ hapụrụ.+  Mgbe ndị Siria nọ na Damaskọs bịara inyere Hadadiza eze Zoba aka, Devid gburu puku mmadụ iri abụọ na puku abụọ (22,000) n’ime ha.+  Devid dowekwara ndị agha na-eche nche na Siria, nke Damaskọs bụ isi obodo ya. Ndị Siria ghọkwara ndị ohu Devid, na-atụkwara ya ụtụ. Jehova mekwara ka Devid na-emeri n’agha ọ bụla ọ gara.+  Devid bukọkwaara ọta ndị na-ejere Hadadiza ozi, bute ha Jeruselem. Ọta ndị ahụ dị okirikiri, e jikwa ọlaedo mee ha.  Devid gakwara Tibhat na Kọn, bụ́ obodo ndị Hadadiza na-achị, buru ọtụtụ ọla kọpa. Ọ bụ ọla kọpa ndị ahụ ka Solomọn ji rụọ otu nnukwu ite mmiri e ji ọla kọpa rụọ a na-akpọ Oké Osimiri.+ O jikwa ha rụọ ogidi nakwa arịa ndị e ji ọla kọpa mee.+  Mgbe Tou* eze Hemat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile na-alụrụ Hadadiza+ eze Zoba+ agha, 10  o ziri Hedoram* nwa ya ozugbo ka ọ gakwuru Eze Devid kelee ya, jaakwa ya ike maka na ọ lụsoro Hadadiza agha, meriekwa ya, (n’ihi na Hadadiza na-agakarị alụso Tou agha). Hedoram wetakwaara Devid ụdị ihe niile e ji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa mee. 11  Eze Devid nyefere Jehova ihe ndị a,+ ma ọlaọcha ma ọlaedo ndị ọ natara mba niile o meriri, ya bụ, ndị Ịdọm, ndị Moab, ndị Amọn,+ ndị Filistia,+ na ndị Amalek.+ 12  Abishaị+ nwa Zeruya+ gburu puku ndị Ịdọm iri na asatọ (18,000) na Ndagwurugwu Nnu.+ 13  O dowekwara ndị agha na-eche nche n’Ịdọm. Ndị Ịdọm niile ghọkwara ndị ohu Devid.+ Jehova mekwara ka Devid na-emeri n’agha ọ bụla ọ gara.+ 14  Devid nọkwa na-achị Izrel niile,+ na-ekpere ndị ya niile ikpe ziri ezi, na-emekwara ha ihe ọma.+ 15  Joab nwa Zeruya bụ onyeisi ndị agha.+ Jehoshafat+ nwa Ahaịlọd bụ onye na-edekọ ihe. 16  Zedọk nwa Ahaịtọb na Ahimelek nwa Abayata bụ ndị nchụàjà. Shavsha bụ odeakwụkwọ. 17  Benaya nwa Jehoyada bụ onyeisi ndị Keretaịt+ na ndị Peletaịt.+ Ụmụ Devid ndị nwoke bụkwa ndị isi na-esote eze.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Na 2 Samuel 8:9, 10, a kpọrọ ya Toaị.
Na 2 Samuel 8:10, a kpọrọ ya Joram.