Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 19:1-19

  • ANdị Amọn kparịrị ndị Devid dunyere ozi (1-5)

  • Devid meriri ndị Amọn na ndị Siria (6-19)

19  Ka oge na-aga, Nehash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya anọchie ya, malite ịchị.+  Devid wee sị: “M ga-egosi Henọn nwa Nehash na m hụrụ ya n’anya+ n’ihi na nna ya gosiri m na ọ hụrụ m n’anya.” N’ihi ya, Devid ziri ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa kasie ya obi maka nna ya nwụrụnụ. Ma, mgbe ndị na-ejere Devid ozi batara n’ala ndị Amọn+ ka ha kasie Henọn obi,  ndị isi ndị Amọn gwara Henọn, sị: “Ì chere na ihe mere Devid ji zite ndị ga-akasi gị obi bụ maka na ọ na-akwanyere nna gị ùgwù? Ihe mere o ji zite ha ọ́ bụghị ka ha nyopụta otú ala a dị ma weghara ya?”  N’ihi ya, Henọn kpọọrọ ndị na-ejere Devid ozi kpụọ afụ ọnụ ha,+ chawaakwa uwe mwụda ha ruo n’ikè, hapụzie ha ka ha lawa.  Mgbe a kọọrọ Devid ihe e mere ndị ahụ o ziri ozi, o ziri ndị mmadụ ozugbo ka ha gaa hụ ha, n’ihi na e menyere ha ezigbo ihere. Eze gwakwara ha, sị: “Nọrọnụ na Jeriko,+ afụ ọnụ unu rujuo, unu alọta.”  Ka oge na-aga, ndị Amọn hụrụ na ihe ha adịghịzi Devid mma. N’ihi ya, Henọn na ndị Amọn ji otu puku (1,000) talent* ọlaọcha gaa gbazite ụgbọ ịnyịnya, gookwa ndị na-agba ịnyịnya n’aka ndị Mesopotemia,* ndị Eram-meaka, na ndị Zoba.+  Ha gbazitere puku ụgbọ ịnyịnya iri atọ na puku abụọ (32,000), gookwa eze ndị Meaka na ndị ya. Ha bịakwara maa ụlọikwuu n’ebe chere Medeba ihu.+ Ndị Amọn sikwa n’obodo ha dị iche iche zukọta ịlụ agha.  Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gwara Joab+ na ndị agha ya niile, ma ndị nke kacha bụrụ dike n’agha,+ ka ha gaa agha.  Ndị Amọn pụtakwara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha, hazie onwe ha n’usoro ka ha lụọ agha. Ma ndị eze ahụ ha goro ego gara nọrọ n’ọhịa osisi na-adịghị, haziekwa onwe ha. 10  Mgbe Joab hụrụ na e si ihu na azụ na-abịa ịlụso ya agha, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ndị Izrel bụ́ ọkà n’ịlụ agha, hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Siria agha.+ 11  Ọ hapụkwaara Abishaị nwanne ya+ ndị fọrọnụ, ka ọ hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Amọn agha. 12  Ọ gwakwara Abishaị, sị: “Ndị Siria+ karịa m ike, gị abịa nyere m aka. Ma ndị Amọn karịa gị ike, mụ abịa nyere gị aka. 13  Ka anyị jisie ike, katakwa obi+ n’ihi ndị ala anyị nakwa n’ihi obodo niile nke Chineke anyị. Jehova ga-emekwa uche ya.” 14  Joab na ndị ya na ha so gaziri lụso ndị Siria agha, merie ha, ha agbaa ọsọ.+ 15  Mgbe ndị Amọn hụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, hanwa gbakwara ọsọ n’ihi Abishaị nwanne Joab, laghachi n’obodo ha. Mgbe agha ahụ biri, Joab lọtara Jeruselem. 16  Mgbe ndị Siria hụrụ na ndị Izrel emeriela ha, ha ziri ụfọdụ ndị ka ha gaa gwa ndị Siria nọ ná mpaghara Osimiri Yufretis+ ka ha bịa. Shofak,* bụ́ onyeisi ndị agha Hadadiza, dukwa ha gaa.+ 17  Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara ndị Izrel niile ozugbo, ha esi n’Osimiri Jọdan gafee chọrọ ndị Siria gaa ma hazie onwe ha n’usoro ịlụso ha agha. Mgbe Devid pụtara ịlụso ha agha, ha malitere ịlụso ya agha.+ 18  Ma ndị Izrel meriri ndị Siria, ha agbaa ọsọ. Devid gbukwara puku ndị Siria asaa (7,000) na-agba ụgbọ ịnyịnya na puku mmadụ iri anọ (40,000) ndị nke ji ụkwụ aga. O gbukwara Shofak onyeisi ndị agha ha. 19  Mgbe ndị na-ejere Hadadiza ozi hụrụ na ndị Izrel emeriela ha,+ ha gakwuuru Devid, ya na ha emee udo, ha aghọọ ndị ohu ya.+ Ndị Siria agaghịkwa nyere ndị Amọn aka ọzọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Na Hibru, “Eram-nehareyim.”
Na 2 Samuel 10:16, a kpọrọ ya Shobak.