Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 2:1-55

  • Ụmụ nwoke iri na abụọ Izrel mụrụ (1, 2)

  • Ụmụ Juda na ụmụ ụmụ ya (3-55)

2  Ndị a bụ ụmụ Izrel+ ndị nwoke: Ruben,+ Simiọn,+ Livaị,+ Juda,+ Ịsaka,+ Zebulọn,+  Dan,+ Josef,+ Benjamin,+ Naftalaị,+ Gad,+ na Asha.+  Ụmụ Juda ndị nwoke bụ Ea, Onan, na Shila. Ọ bụ nwa Shua, nwaanyị Kenan,+ mụụrụ ya ụmụ atọ a. Ma, Jehova gburu Ea bụ́ ọkpara Juda maka na ọ bụ onye ọjọọ n’anya ya.+  Tema+ bụ nwunye nwa Juda. Ọ mụụrụ Juda Pirez+ na Zira. Ụmụ Juda ndị nwoke niile dị ise.  Ụmụ Pirez bụ Hezrọn na Hemọl.+  Ụmụ Zira bụ Zimraị, Itan, Himan, Kalkọl, na Dera. Ha niile dị ise.  Nwa* Kamaị bụ Eka,* onye kpataara ndị Izrel ọdachi,*+ onye na-erubeghịkwa isi n’okwu gbasara ihe a ga-ebibi ebibi.+  Nwa* Itan bụ Azaraya.  Ụmụ a mụụrụ Hezrọn bụ Jeramiel,+ Ram,+ na Kelubaị.* 10  Ram mụrụ Aminadab,+ Aminadab amụọ Nashọn+ onyeisi ndị ebo Juda. 11  Nashọn mụrụ Salma,+ Salma amụọ Boaz,+ 12  Boaz amụọ Obed, Obed amụọ Jesi,+ 13  Jesi amụọ Elayab bụ́ ọkpara ya, na Abinadab+ nwa ya nke abụọ, Shimia nwa ya nke atọ,+ 14  Netanel nwa ya nke anọ, Radaị nwa ya nke ise, 15  Ozem nwa ya nke isii, na Devid+ nwa ya nke asaa. 16  Ụmụnne ha ndị nwaanyị bụ Zeruya na Abigel.+ Ụmụ Zeruya dị atọ. Ha bụ, Abishaị,+ Joab,+ na Asahel.+ 17  Abigel mụrụ Amesa.+ Nna Amesa bụ Jita onye Ishmel. 18  Ụmụ ndị nwoke Keleb* nwa Hezrọn mụrụ bụ Jisha, Shobab, na Adọn. Ọ bụ Azuba nwunye ya na Jeriọt mụụrụ ya ụmụ ndị ahụ. 19  Mgbe Azuba nwụrụ, Keleb lụrụ Efrat,+ ya amụọrọ ya Họọ,+ 20  Họọ amụọ Yuraị, Yuraị amụọ Bezalel.+ 21  Hezrọn lụrụ nwa Mekia+ bụ́ nna Gilied.+ Ọ dị afọ iri isii lụọ ya. Ọ bụkwa ya mụtaara ya Sigọb, 22  Sigọb amụọ Jeya.+ Jeya a nwere obodo iri abụọ na atọ na Gilied.+ 23  Ndị Geshọ+ na ndị Siria+ mechara napụ ha Havọt-jeya+ na Kinat+ na ime obodo ndị dị Kinat nso.* Ha niile dị obodo iri isii. Ndị a niile bụ ụmụ Mekia bụ́ nna Gilied. 24  Mgbe Hezrọn+ nwụchara na Keleb-efrata, Abaịja nwunye ya mụụrụ ya Ash-họ+ bụ́ nna Tekoa.+ 25  Ụmụ Jeramiel, ọkpara Hezrọn, bụ Ram, Buna, Oren, Ozem, na Ahaịja. Ram bụ ọkpara ya. 26  Jeramiel lụrụ nwaanyị ọzọ aha ya bụ Atara. Ọ bụ ya bụ nne Onam. 27  Ụmụ Ram, ọkpara Jeramiel, bụ Meaz, Jemin, na Ika. 28  Ụmụ Onam bụ Shamaị na Jeda. Ụmụ Shamaị bụ Nedab na Abaịshọ. 29  Aha nwunye Abaịshọ bụ Abihel. Ọ mụụrụ ya Aban na Molid. 30  Ụmụ Nedab bụ Siled na Apayim. Ma Siled nwụrụ n’amụtaghị nwa. 31  Nwa* Apayim bụ Ịshaị. Nwa* Ịshaị bụ Shishan. Nwa* Shishan bụ Alaị. 32  Ụmụ Jeda nwanne Shamaị bụ Jita na Jonatan. Ma Jita nwụrụ n’amụtaghị nwa. 33  Ụmụ Jonatan bụ Pilet na Zeza. Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Jeramiel. 34  Shishan amụtaghị nwoke. Naanị ụmụ nwaanyị ka ọ mụrụ. O nwekwara otu onye Ijipt na-ejere ya ozi. Aha ya bụ Jaha. 35  Shishan kpọọrọ nwa ya nwaanyị kpọnye Jaha bụ́ onye na-ejere ya ozi ka ọ lụwa. Ọ mụkwaara ya Ataị. 36  Ataị mụrụ Netan, Netan amụọ Zebad, 37  Zebad amụọ Eflal, Eflal amụọ Obed, 38  Obed amụọ Jihu, Jihu amụọ Azaraya, 39  Azaraya amụọ Hilez, Hilez amụọ Eliesa, 40  Eliesa amụọ Sismaị, Sismaị amụọ Shalọm, 41  Shalọm amụọ Jekamaya, Jekamaya amụọ Elishama. 42  Ụmụ Keleb*+ nwanne Jeramiel bụ Misha ọkpara ya, bụ́ nna Zif, nakwa ụmụ Marisha bụ́ nna Hebrọn. 43  Ụmụ Hebrọn bụ Kora, Tapua, Rikem, na Shima. 44  Shima mụrụ Reham bụ́ nna Jọkiam. Rikem amụọ Shamaị. 45  Nwa Shamaị bụ Meyọn. Meyọn bụ nna Bet-zọọ.+ 46  Ifa bụ́ iko Keleb mụrụ Heran, Moza, na Gezez. Heran amụo Gezez. 47  Ụmụ Jadaị bụ Rigem, Jotam, Gishan, Pelet, Ifa, na Sheef. 48  Iko Keleb bụ́ Meaka mụrụ Shiba na Tiahana. 49  Ka oge na-aga, ọ mụrụ Sheef nna Madmana+ nakwa Shiva nna Makbina na Gibia.+ Keleb+ mụkwara nwa nwaanyị aha ya bụ Aksa.+ 50  Ndị a niile bụ ụmụ Keleb. Ụmụ Họọ+ bụ́ ọkpara Efrata+ bụ Shobal nna Kiriat-jierim,+ 51  Salma nna Betlehem,+ na Heref nna Bet-geda. 52  Ụmụ Shobal nna Kiriat-jierim bụ Haroe na ọkara ndị Menuhọt. 53  Ezinụlọ ndị bi na Kiriat-jierim bụ ndị Itraịt,+ ndị Putaịt, ndị Shumataịt, na ndị Mishraịt. Ọ bụkwa ebe ndị a ka ndị Zora+ na ndị Eshtaọl+ si. 54  Ụmụ Salma bụ Betlehem,+ ndị Netofa, Atrọt-bet-joab, ọkara ndị Manahat nakwa ndị Zora. 55  Ezinụlọ ndị odeakwụkwọ ndị bi na Jebez bụ ndị Taịrataịt, ndị Shimiataịt, na ndị Sukataịt. Ọ bụ ha bụ ndị Kenaịt.+ Ọ bụkwa Hamat, nna ndị Rikab,+ mụrụ ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nnukwu nsogbu.”
Eka pụtara “Onye Na-akpata Ọdachi; Onye Na-akpata Nnukwu Nsogbu.” Na Joshụa 7:1, a kpọrọ ya Ekan.
Na Hibru, “Ụmụ.”
Na Hibru, “Ụmụ.”
A kpọrọ ya Keleb n’amaokwu nke 18, 19, na nke 42.
A kpọrọ ya Kelubaị n’amaokwu nke 9.
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Na Hibru, “Ụmụ.”
Na Hibru, “Ụmụ.”
Na Hibru, “Ụmụ.”
A kpọrọ ya Kelubaị n’amaokwu nke 9.