Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 20:1-8

  • Devid weghaara Raba (1-3)

  • E gburu ndị Filistia gbara ajọ dimkpa (4-8)

20  Ná mmalite afọ, n’oge ndị eze na-eji aga agha, Joab+ duuru ndị agha ya gaa bibie ala ndị Amọn. Ọ gakwara nọchibido Raba,+ ma Devid nọ na Jeruselem.+ Joab mechakwara bibie Raba.+  Devid kpupụrụ okpueze dị n’isi Malkam,* chọpụtakwa na e ji ọlaedo na nkume dị oké ọnụ* kpụọ okpueze ahụ, nakwa na ọlaedo e ji kpụọ ya dị otu talent* n’arọ. E kpunyekwara Devid okpueze ahụ n’isi. Ihe ndị ọ kwatara n’obodo ahụ karịkwara akarị.+  Devid kpụkwaara ndị bi n’obodo ahụ, gwa ha ka ha na-awa nkume nakwa ka ha jiri ngwá ọrụ ndị na-aghọ nkọ e ji ígwè rụọ nakwa anyụike na-arụ ọrụ.+ Otú a ka o mekwara obodo ndị Amọn niile. N’ikpeazụ, Devid na ndị agha ya niile laghachiri Jeruselem.  Mgbe ihe a mechara, ndị Izrel na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Giza. Ọ bụ mgbe ahụ ka Sibekaị+ onye Husha gburu Sipaị, bụ́ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+ E merikwara ndị Filistia.  Ndị Izrel na ndị Filistia lụkwara agha ọzọ, Elhenan nwa Jeya egbuo Lamaị nwanne Golayat+ onye Gat. Okporo ube Lamaị dị ka okporo osisi nke ndị na-ekwe ákwà.+  Ha lụkwara agha ọzọ na Gat.+ N’ebe ahụ, e nwere otu nwoke gbara ajọ dimkpa,+ nke nwere mkpịsị aka isii n’aka ya nke ọ bụla, nweekwa mkpịsị ụkwụ isii n’ụkwụ ya nke ọ bụla. Ha niile dị iri abụọ na anọ. Ọ bụkwa otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+  Ọ nọkwa na-echere ndị Izrel aka mgba.+ N’ihi ya, Jonatan nwa Shimia,+ bụ́ nwanne Devid, gburu ya.  Ndị a bụ ụmụ ndị Refeyim+ bi na Gat.+ Devid na ndị na-ejere ya ozi gbukwara ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Malkam nwere ike ịbụ arụsị ndị Amọn. E nwere ebe a kpọrọ ya Molek ma ọ bụ Milkọm.
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.